Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Ndị Filipaị 4:13​—‘Enwere M Ike Ime Ihe Niile Site n’Inyeaka Kraịst’

Ndị Filipaị 4:13​—‘Enwere M Ike Ime Ihe Niile Site n’Inyeaka Kraịst’

 “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.”​—Ndị Filipaị 4:​13, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “N’ihi na apụrụ m ime ihe nile site n’inyeaka Kraịst onye na-enye m ike​—Ndị Filipaị 4:13, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Ihe Ndị Filipaị 4:13 Pụtara

 Okwu ndị a Pọl onyeozi dere na-emesi ndị na-efe Chineke obi ike na ha ga-enwetali ike ha ga-eji na-eme ihe dị Chineke mma.

 Ụfọdụ nsụgharị Baịbụl kwuru na ọ bụ Kraịst mere ka Pọl dị ike. Ma, okwu ahụ bụ́ “Kraịst” adịghị na Baịbụl Grik ndị kacha ochie. N’ihi ya, ọtụtụ nsụgharị Baịbụl taa ji okwu ndị dị ka “onye ahụ nke na-eme ka m dị ike” (Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ), “onye ahụ na-enye m ike” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) sụgharịa amaokwu a. Ònye ka Pọl bu n’obi mgbe o dere ihe a?

 Ihe ndị Pọl dere mgbe ọ na-ede ihe ndị bu amaokwu a ụzọ gosiri na ọ bụ Chineke ka ọ na-ekwu maka ya. (Ndị Filipaị 4:​6, 7, 10) Ná mmalite akwụkwọ ozi a, Pọl gwara ndị Filipaị, sị: “Ọ bụ Chineke na-enye unu ume, . . . na-enyekwa unu ike unu ji eme ya.” (Ndị Filipaị 2:13) O kwukwara na 2 Ndị Kọrịnt 4:7 na ọ bụ Chineke na-enye ya ike o ji na-ejere ya ozi. (Gụọkwa 2 Timoti 1:8.) N’ihi ya, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kwuo na ọ bụ Chineke ka Pọl kwuru ‘na-eme ka ọ dị ike.’

 Gịnị ka Pọl bu n’obi mgbe o kwuru na onye ahụ nke na-eme ka ọ dị ike na-enye ya ike “n’ihe niile”? Ihe Pọl na-ekwu okwu ya nwere ike ịbụ nsogbu ndị o nwere n’ihi na ọ na-eme ihe dị Chineke mma. Ma Pọl ò nwere ihe ga-ezuru ya ma ọ bụ na o nweghị, o nwere okwukwe na Chineke ga na-egboro ya mkpa ya. Ihe Pọl nwere juru ya afọ n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ya.​—2 Ndị Kọrịnt 11:​23-27; Ndị Filipaị 4:11.

 Ihe ndị a Pọl kwuru nwere ike imesi ndị na-efe Chineke taa obi ike. Chineke ga-enye ha ike ha ga-eji na-edi nsogbu, nyekwara ha aka ịna-eme uche ya. Chineke nwere ike iji mmụọ nsọ ya ma ọ bụ ike o ji arụ ọrụ mee ka ha dị ike. O nwekwara ike iji ndị ha na ha so na-efe ya nakwa Okwu ya bụ́ Baịbụl mee ya.​—Luk 11:13; Ọrụ Ndịozi 14:​21, 22; Ndị Hibru 4:12.

Ihe Ndị Gbara Ndị Filipaị 4:13 Gburugburu

 Ihe ndị a so n’okwu ndị ikpeazụ Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Filipaị. O dere ha ihe dị ka n’afọ 60 ruo 61 Oge Ndị Kraịst, mgbe mbụ a tụrụ ya mkpọrọ na Rom. Ruo ọtụtụ oge a na-akapịghị ọnụ, Ndị Kraịst nọ na Filipaị enyeghị Pọl ihe ndị dị ya mkpa. Ma ugbu a, ha na-ezigaziri ya ihe ndị dị ya mkpa.​—Ndị Filipaị 4:​10, 14.

 Pọl ji obi ụtọ jaa Ndị Kraịst nọ na Filipaị mma maka otú ha si jiri obi ha niile nye ya onyinye, gwakwa ha na ya nwere ihe ndị dị ya mkpa. (Ndị Filipaị 4:18) O jikwa ohere ahụ gwa ha ihe dị mkpa gbasara otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ebi ndụ, ya bụ, na ihe Ndị Kraịst nwere kwesịrị ịna-eju ha afọ, ma hà bara ọgaranya ma hà bụ ogbenye, ọ bụrụhaala na ha atụkwasị Chineke obi.​—Ndị Filipaị 4:12.