Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Aịzaya 40:31​—“Ndị Nwere Olileanya na Jehova Ga-enyere Ha Aka Ga-enwetaghachi Ike”

Aịzaya 40:31​—“Ndị Nwere Olileanya na Jehova Ga-enyere Ha Aka Ga-enwetaghachi Ike”

 “Ma, ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike. Ha ga-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-eje ije, ma ha agaghị ada mbà.”​—Aịzaya 40:​31, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Ma ndị niile chekwubere na Chukwu ga-enweta ike ọzọ. Ha ga-efe n’elu dị ka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.”​—Aịzaya 40:​31, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe Aịzaya 40:31 Pụtara

 Jehova a Chineke kwere ndị na-efe ya nkwa na ya ga-enye ha ike ha ga-eji na-edi nsogbu ọ bụla bịaara ha ma merie ya.

 “Ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike.” Chineke ga na-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị enwee olileanya n’ebe ọ nọ, obi esiekwa anyị ike na ọ ga-enyeliri ndị ya aka nakwa na ọ chọrọ inyere ha aka. (Ilu 3:​5, 6) Otu n’ime ụzọ ndị Chineke na-esi eme ka ndị na-efe ya nweta ume bụ na ọ na-enye ha mmụọ nsọ ya, ya bụ, ike o ji arụ ọrụ.​—Luk 11:13.

 “Ha ga-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo.” Ihe a e kwuru ebe a na-egosi otú mmụọ Chineke si akpa ike n’ahụ́ mmadụ. Ihe na-enyere ugo aka ifeli elu nke ọma bụ ikuku ọkụ na-ala elu. Ikuku a na-enyere ya aka ifega ebe dị anya ike agharakwa ịgwụ ya. Ozugbo ugo chọpụtara ikuku ọkụ a, ọ na-agbasa nku ya gburugburu ikuku a, ikuku a eburu ya na-aga elu elu. Ugo nwere ike ife n’elu ọtụtụ awa ike agaghị agwụ ya ma ọ bụrụhaala na ọ gbasara nku ya n’elu ikuku ọkụ ahụ, ikuku ahụ eburu ya na-aga ebe ọ chọrọ ịga.

 “Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha.” Nsogbu ndị juru n’ụwa a nwere ike ime ka ike na-agwụ anyị, uche agharakwa ịkpakọ anyị ọnụ, ma ike Chineke na-enye anyị ga na-akwado anyị. Ike a Chineke na-enye anyị ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe dị mma n’agbanyeghị nsogbu ndị tara akpụ. Pọl onyeozi, bụ́ onye diri nsogbu ndị tara akpụ, kwuru, sị: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.”​— Ndị Filipaị 4:13.

Ihe Ndị Gbara Aịzaya 40:31 Gburugburu

 Chineke si n’ike mmụọ nsọ ya mee ka Aịzaya onye amụma kwuo ihe a na narị afọ asatọ Tupu Oge Ndị Kraịst. Ọ bụ eziokwu na ihe e dere n’amaokwu a gbasara ndị niile ji obi ha na-efe Chineke, o nwere ike ịbụ na Jehova ji ya gbaa ndị Juu ume maka na ha ga-anọ afọ 70 mgbe a ga-adọrọ ha n’agha laa Babịlọn. Mgbe ndị Juu mechara lọta n’ala nna ha, ha hụrụ otú amụma a si mezuo. (Aịzaya 40:​1-3) Chineke nyere ha ike iji ụkwụ mee njem ahụ dị ezigbo anya b nke bụ́ isi Babịlọn laghachi Jeruselem n’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst, n’agbanyeghị na ime ụdị njem a adịghị mfe.​—Aịzaya 40:29.

a Jehova bụ ezigbo aha Chineke.​—Abụ Ọma 83:18.

b Ha ji ụkwụ gaa ihe dị ka otu puku na narị kilomita isii (ya bụ, 1,00Please change it to kilomita.)