Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Inye Ihe?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Inye Ihe?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl kwuru na ọ dị mma inye ndị ọzọ ihe, nakwa na onye na-enye ihe kwesịrị iji obi ọcha ya na-enye ya. O kwukwara na iji obi ọcha nye ihe na-abara ma onye e nyere ihe ahụ uru ma onye nyere ya ihe ahụ. (Ilu 11:25; Luk 6:​38) Jizọs sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”​​—⁠Ọrụ Ndịozi 20:⁠35.

 Olee ụdị inye ihe na-atọ Chineke ụtọ?

 Ụdị inye ihe na-atọ Chineke ụtọ bụ nke mmadụ si n’obi ya nye. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”​​—⁠2 Ndị Kọrịnt 9:⁠7.

 Mmadụ isi n’obi ya nye ndị ọzọ ihe so ‘n’ụdị ofufe’ Chineke na-anabata. (Jems 1:​27) Onye na-eji obi ya enyere ndị ọzọ aka so Chineke na-arụ ọrụ, n’ihi na Chineke na-ele onye na-emesapụ aka anya ka onye gbazinyere ya ihe. (Ilu 19:17) Baịbụl kwuru na Chineke n’onwe ya ga-akwụghachi onye ahụ ụgwọ ihe o mere.​​—⁠Luk 14:​12-​14.

 Olee ụdị inye ihe na-anaghị amasị Chineke?

 Ọ bụrụ na o nwere ihe mmadụ bu n’obi na-enye ya. Ihe ndị dị ka:

 Ọ bụrụ na e ji ya na-akwado ihe Chineke kpọrọ asị ma ọ bụ àgwà Chineke kpọrọ asị. Dị ka ihe atụ, ọ dị njọ inye mmadụ ego ka o jiri ya gbaa chaa chaa ma ọ bụ ka o jiri ya ṅụọ ọgwụ ike ma ọ bụ ṅụbiga mmanya ókè. (1 Ndị Kọrịnt 6:​9, 10; 2 Ndị Kọrịnt 7:⁠1) Otú ahụ ka ọ dịkwa iwere ego nye onye ahụ́ dị mma na-achọghị ịrụ ọrụ, ebe ọ bụ yanwa jụrụ ịrụ ọrụ ka o nwee ike ịna-akpata ego.​​—⁠2 Ndị Tesalonaịka 3:​10.

 Ọ bụrụ na inye ihe ga-egbochi onye ahụ ịrụ ọrụ Chineke nyere ya. Baịbụl kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị ndị isi ezinụlọ inye ndị ezinụlọ ha ihe ndị na-akpa ha. (1 Timoti 5:⁠8) Ọ gaghị adị mma ka onyeisi ezinụlọ na-enye ndị ọzọ ihe ruo nke na ọ ga-eleghara ndị ezinụlọ ya anya. Jizọs katọdịrị ndị na-achọghị inyere ndị mụrụ ha merela agadi aka n’ihi na ha na-ekwu na ihe niile ha nwere bụ “onyinye a raara nye Chineke.”​​—⁠Mak 7:​9-​13.

.​—Psalm 49:6, 7.