Ònye Bụ Onye Na-emegide Kraịst?
Ihe Baịbụl kwuru
Onye na-emegide Kraịst abụghị naanị otu onye n’ihi na Baịbụl kwuru na e nwere “ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst.” (1 Jọn 2:18) Kama, okwu Grik a sụgharịrị “onye na-emegide Kraịst” pụtara:
Onye na-ekwetaghị na Jizọs bụ Kraịst (ya bụ, Mesaya), ma ọ bụ onye na-ekwetaghị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke.—1 Jọn 2:22.
Onye na-emegide Kraịst, bụ́ Onye Chineke Tere Mmanụ.—Abụ Ọma 2:1, 2; Luk 11:23.
Onye na-eme ka à ga-asị na ya bụ Kraịst.—Matiu 24:24.
Onye na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst n’ihi na Jizọs weere na ihe ọ bụla a na-eme ndị na-eso ụzọ ya bụ yanwa ka a na-eme ya.—Ọrụ Ndịozi 9:5.
Onye na-ekwu na ya bụ Onye Kraịst ma ya ana-aghọgbu ndị ọzọ ma ọ bụ na-emebi iwu.—Matiu 7:22, 23; 2 Ndị Kọrịnt 11:13.
Baịbụl kpọrọ ndị na-eme ihe ndị a, ndị na-emegide Kraịst, ma ọ kpọkwara ha niile “onye na-emegide Kraịst.” (2 Jọn 7) Ọ bụ n’oge ndịozi Jizọs ka e bidoro inwe ndị na-emegide Kraịst. Ha ka na-akpakwa ike kemgbe ahụ. Baịbụl buru amụma na ọ bụ ihe ga-eme.—1 Jọn 4:3.
Otú e si amata ndị na-emegide Kraịst
Ha na-akụziri ndị mmadụ ihe na-abụghị eziokwu banyere Jizọs. (Matiu 24:9, 11) Dị ka ihe atụ, ndị na-akụzi Atọ n’Ime Otu ma ọ bụ na-ekwu na Jizọs bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile na-agba ihe Jizọs kụziri ụkwụ. Jizọs kwuru, sị: “Nna m ka m ukwuu.”—Jọn 14:28.
Ndị na-emegide Kraịst anaghị ekweta ihe Jizọs kwuru banyere otú Alaeze Chineke ga-esi na-achị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị isi chọọchị na-ekwu na Kraịst ji ọchịchị ụmụ mmadụ arụ ọrụ. Ma, ihe a ha na-ekwu adabaghị n’ihe Jizọs kụziri. Jizọs sịrị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.”—Jọn 18:36.
Ha na-ekwu na Jizọs bụ Onyenwe ha, ma ha anaghị erube isi n’iwu ya, ma iwu o nyere ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—Matiu 28:19, 20; Luk 6:46; Ọrụ Ndịozi 10:42.