Gaa n'Isiokwu

Meri Ọ̀ Bụ Nne nke Chukwu?

Meri Ọ̀ Bụ Nne nke Chukwu?

Ihe Baịbụl zara

 Mba. Baịbụl anaghị akụzi na Meri bụ nne nke Chukwu, o nweghịkwa ihe o kwuru gosiri na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-efe Meri ma ọ bụ na-akwanyere ya ùgwù pụrụ iche. a Chebagodịrị ihe ndị a echiche:

  •   E nweghị mgbe Meri kwuru na ya bụ nne nke Chukwu. Ihe Baịbụl kwuru bụ na Meri bụ nne “Ọkpara Chineke,” ọ bụghị nne Chineke.​—Mak 1:1; Luk 1:​32.

  •   E nweghị mgbe Jizọs Kraịst kwuru na Meri bụ nne nke Chukwu ma ọ bụkwanụ na e kwesịrị ịna-akwanyere Meri ùgwù pụrụ iche. Kama nke ahụ, mgbe otu nwaanyị kwuru ihe gosiri na obi kwesịrị ịna-atọ Meri ụtọ n’ihi na ọ bụ nne ọkpara Chineke, Jizọs gbaziri ya olu, gwa ya, sị: “Ee e, kama nke ahụ, obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!”​—Luk 11:​27, 28.

  •   E nweghị ebe okwu ahụ bụ́ “Nne nke Chukwu” na “Theotokos” (Onye mụrụ Chukwu) dị na Baịbụl.

  •   Onye a kpọrọ “Eze Nwaanyị nke Eluigwe” na Baịbụl abụghị Meri, kama ọ bụ chi nwaanyị ndị Izrel ndị hapụrụ Jehova fere n’oge ochie. (Jeremaya 44:​15-19) O nwere ike ịbụ Ishta (Astati), bụ́ chi nwaanyị ndị Babịlọn, bụ ya bụ “Eze Nwaanyị nke Eluigwe.”

  •   Ndị Kraịst mbụ efeghị Meri ofufe, ha akwanyereghịkwa ya ùgwù pụrụ iche. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na ọ ga-abụ na Ndị Kraịst oge mbụ “ekweghị eso n’òtù nzuzo, o nwekwara ike ịbụ na ha weere ya na ịkwanyere Meri ùgwù pụrụ iche nwere ike ime ka o yie ka hà na-efe chi nwaanyị ofufe.”​—In Quest of the Jewish Mary.

  •   Baịbụl kwuru na Chineke dị adị kemgbe. (Abụ Ọma 90:​1, 2; Aịzaya 40:28) Ebe ọ bụ na o nweghị mmalite, o nweghị otú ọ ga-esi nwee nne. Ihe ọzọkwa bụ na o nweghị otú Meri ga-esi buru Chineke n’afọ ya, ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na eluigwe enweghịdị ike ịba ya​—1 Ndị Eze 8:​27.

Meri bụ nne Jizọs ọ bụghị “Nne nke Chukwu”

 Meri bụ onye Juu, o sikwa n’ezinụlọ Eze Devid. (Luk 3:​23-​31) O nwetara ihu ọma Chineke n’ihi otú o si nwee okwukwe nakwa n’ihi na ọ na-ejere Chineke ozi. (Luk 1:​28) Chineke họọrọ Meri ka ọ bụrụ nne Jizọs. (Luk 1:​31, 35) Meri na di ya Josef mụtara ụmụ ọzọ.​—Mak 6:3.

 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Meri mechara bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma e nweghị ọtụtụ ihe ọzọ e kwuru gbasara ya.

a Ọtụtụ chọọchị na-akụzi na Meri bụ nne nke Chukwu. Ụfọdụ na-akpọ ya “Eze Nwaanyị nke Eluigwe,” ma ọ bụkwanụ Theotokos, nke pụtara “onye mụrụ Chukwu,” n’asụsụ Grik.