Gaa n'Isiokwu

Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe?

Jizọs Ọ̀ Nwụrụ n’Elu Obe?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ọtụtụ ndị weere ya na ọ bụ obe ka a kacha jiri mara Ndị Kraịst. Ma, Baịbụl ekwughị kpọmkwem otú osisi e ji kpọgbuo Jizọs dị. N’ihi ya, e nweghị onye ga-asị na ya ma otú osisi ahụ dị kpọmkwem. N’agbanyeghị nke ahụ, e nwere ihe Baịbụl kwuru mere ka anyị mara na a kpọgbughị Jizọs n’elu obe, kama, na a kpọgburu ya n’elu ogwe osisi kwụ ọtọ.

 Mgbe mbụ e dere Baịbụl, ihe e dere n’ọtụtụ ebe e kwuru banyere ihe e ji gbuo Jizọs bụ okwu Grik bụ́ stau·rosʹ. (Matiu 27:40; Jọn 19:17) Ọ bụ eziokwu na ndị sụgharịrị Baịbụl ụfọdụ kpọrọ ya “obe,” ma ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na ihe okwu Grik ahụ pụtara n’eziokwu bụ “otu ogwe osisi kwụ ọtọ.” a Otu akwụkwọ a na-akpọ A Critical Lexicon and Concordance to the English and Greek New Testament kwuru na okwu ahụ bụ́ stau·rosʹ “enweghị mgbe ọ pụtara osisi abụọ atụbichiri atụbichi.”

 Ihe ọzọ Baịbụl na-akpọ stau·rosʹ n’asụsụ Grik bụ xyʹlon. (Ọrụ Ndịozi 5:​30; 1 Pita 2:​24) Xyʹlon pụtara “mkpirisi osisi,” “ogwe osisi,” ma ọ bụ “osisi.” b Baịbụl a na-akpọ The Companion Bible kwuru, sị: “E nweghị ihe ọ bụla dị n’asụsụ e ji dee Agba Ọhụrụ gosiri na ọ bụ osisi abụọ a tụkọtara atụkọta” ka e ji kpọgbuo Jizọs.

Chineke ọ̀ chọrọ ka anyị jiri obe na-efe ya?

Ihe a bụ osisi e ji akpọgbu ndị omekome n’oge ochie. A na-akpọ ya Crux simplex n’asụsụ Latịn

 N’agbanyeghị otú ọ bụla osisi e ji kpọgbuo Jizọs dị, amaokwu Baịbụl ndị dị n’okpuru ebe a gosiri na anyị ekwesịghị iji obe efe Chineke.

  1.   Chineke anaghị anabata ofufe ọ bụla e ji ihe oyiyi na-efe ya, ọ sọgodị ya ya bụrụ obe. Chineke nyere ụmụ Izrel iwu ka ha ghara iji “ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla” efe ya. A gwakwara Ndị Kraịst ka ha ‘gbaara ikpere arụsị ọsọ.’​—Diuterọnọmi 4:​15-​19; 1 Ndị Kọrịnt 10:14.

  2.   Ndị Kraịst oge mbụ ejighị obe fee Chineke. c Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-eme ihe ndịozi kụziri na ihe ha mere.​—2 Ndị Tesalonaịka 2:​15.

  3.   Ọ bụ ndị ọgọ mmụọ bụ ndị mbụ malitere iji obe efe ofufe. d Mgbe Jizọs nwụrụ, ọtụtụ narị afọ agaa, ndị chọọchị hapụrụ ihe ọ kụziri mewe ihe ọzọ. Akwụkwọ bụ́ The Expanded Vine’s Expository Dictionary of New Testament Words sịrị na ‘a hapụrụ ndị ọhụrụ batara na chọọchị ka ha jiri ọtụtụ ihe ha ji agọ mmụọ bata na chọọchị.’ Obe sokwa n’ihe ha ji bata. Ma, Baịbụl ekwughị ka e mee ka ihe ndị ọgọ mmụọ bụrụzie ihe Ndị Kraịst ka e si otú ahụ mee ka ndị ọgọ mmụọ ghọọ Ndị Kraịst.​—2 Ndị Kọrịnt 6:​17.

a Lee akwụkwọ bụ́ New Bible Dictionary, Third Edition, edited by D. R. W. Wood, peeji nke 245; Theological Dictionary of the New Testament, Volume VII peeji nke 572; The International Standard Bible Encyclopedia, Revised Edition, Volume 1, peeji nke 825; na The Imperial Bible-Dictionary, Volume II, peeji nke 84.

b Lee akwụkwọ a na-akpọ The Expanded Vine’s Expository Dictionary of New Testament Words, peeji nke 1165; A Greek-English Lexicon, by Liddell and Scott, Ninth Edition, peeji nke 1191-​1192; na Theological Dictionary of the New Testament, Volume V, peeji nke 37.

c Lee Encyclopædia Britannica, 2003, n’okpuru isiokwu bụ́ “Cross”; The Cross​—Its History and Symbolism, peeji nke 40; na The Companion Bible, Oxford University Press, appendix 162, peeji nke 186.

d Lee The Encyclopedia of Religion, Volume 4, peeji nke 165; The Encyclopedia Americana, Volume 8, peeji nke 246; na Symbols Around Us, peeji nke 205-​207.