Gaa n'Isiokwu

Ànyị Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Efe Chineke?

Ànyị Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Efe Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mba, anyị ekwesịghị. Mgbe akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-ekwu banyere iwu Chineke nyere mba Izrel, ọ sịrị: “Ihe dị iche iche Baịbụl kwuru gosiri na ihe oyiyi abụghị ihe e ji efe Chineke ezi ofufe.” Lee ihe amaokwu Baịbụl ndị a kwuru:

  •   “Emerela onwe gị ihe oyiyi a pịrị apị ma ọ bụ ọdịdị nke yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ nke dị n’elu ụwa ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa. Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ife ha ofufe, n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa.” (Ọpụpụ 20:​4, 5) Ebe ọ bụ na Chineke chọrọ “ofufe a na-ekewaghị ekewa,” obi agaghị adị ya mma ma anyị na-eto ma ọ bụ na-efe ihe oyiyi, foto, ihe osise, ma ọ bụ ihe a kpụrụ akpụ.

  •   ‘Agaghị m enye ihe oyiyi a pịrị apị otuto m.’ (Aịzaya 42:8) Chineke anaghị anabata ofufe mmadụ ji ihe oyiyi na-efe ya. Mgbe ụfọdụ ndị Izrel nwara iji ihe oyiyi nwa ehi fee Chineke, Chineke sịrị na ha mere “omume na-eweta mbibi.”​—Ọpụpụ 32:​7-9.

  •   “Anyị ekwesịghị iche na Chineke yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume, dị ka ihe a kpụrụ akpụ site na nkà na nchepụta nke mmadụ.” (Ọrụ Ndịozi 17:29) Ndị ọgọ mmụọ na-eji ‘ihe a kpụrụ akpụ si na nkà na nchepụta nke mmadụ’ efe ofufe. Ma, Ndị Kraịst ekwesịghị ịna-eme otú ahụ. Ha kwesịrị ịna-eme ihe Baịbụl kwuru, ya bụ, “ịna-eje ije n’okwukwe, ọ bụghị n’ihe anya na-ahụ.”​—2 Ndị Kọrịnt 5:7.

  •   “Kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.” (1 Jọn 5:​21) Ma iwu e nyere ụmụ Izrel ma nke e nyere Ndị Kraịst mere ka anyị mata na ozizi bụ́ na Chineke chọrọ ka e jiri ihe oyiyi na-efe ya ofufe bụ ozizi ụgha.