Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Hel? Ọ̀ Bụ Ebe A Na-ata Mmadụ Ahụhụ Ruo Ebighị Ebi?

Gịnị Bụ Hel? Ọ̀ Bụ Ebe A Na-ata Mmadụ Ahụhụ Ruo Ebighị Ebi?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ụfọdụ ndị sụgharịrị Baịbụl dere “hel” n’ebe e dere okwu Hibru bụ́ “Shiol,” deekwa ya n’ebe e dere okwu Grik bụ́ “Hedis.” Shiol na Hedis pụtachara ili. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ Ndịozi 2:​27) Ọtụtụ ndị kweere na hel bụ ebe a na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ otú a e sere na foto a dị n’aka nri. Ma, ihe a abụghị ihe Baịbụl kwuru.

  1.   Ndị nọ na hel amaghị ihe ọ bụla. N’ihi ya, ha agaghị anụli ụfụ ihe. “Ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol.”​—Ekliziastis 9:​10.

  2.   Ndị ezi omume na-aga hel. Ndị ezi omume aha ha bụ Jekọb na Job kwuru na ha ga-aga hel.​—Jenesis 37:35; Job 14:13.

  3.   ụgwọ ọrụ mmehie, ọ bụghị ịta mmadụ ahụhụ n’ọkụ. “A tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.”​—Ndị Rom 6:7.

  4.   Ọ bụrụ na Chineke na-ata mmadụ ahụhụ n’ime ọkụ ruo ebighị ebi, ọ pụtara na ọ naghị ekpe ikpe ziri ezi. (Diuterọnọmi 32:4) Mgbe nwoke mbụ bụ́ Adam mechara mmehie, Chineke gwara ya na ọ ga-akwụsị ịdị adị. Ọ sịrị ya: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.” (Jenesis 3:​19) Ọ bụrụ na Chineke tụbara Adam n’ọkụ ala mmụọ, ọ pụtara na ọ tụọla asị.

  5.   Ịta ndị mmadụ ahụhụ n’ime ọkụ abatatụbeghị Chineke n’obi. Iche na Chineke ga-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru banyere Chineke. Baịbụl sịrị na “Chineke bụ ịhụnanya.”​—1 Jọn 4:8; Jeremaya 7:​31.