Gaa n'Isiokwu

Gịnị Bụ Baịbụl?

Gịnị Bụ Baịbụl?

Ihe Baịbụl Kwuru

 Baịbụl bụ Akwụkwọ Nsọ. O nwere akwụkwọ iri isii na isii e jikọrọ ọnụ. O were ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii iji dechaa ya. Ihe dị na Baịbụl bụ ozi si n’aka Chineke, ya bụ “okwu Chineke.”​—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

 Ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Baịbụl

  •   Ole ndị dere Baịbụl? Ọ bụ uche Chineke ka e dere na Baịbụl, ma o si n’aka ihe dị ka ụmụ nwoke iri anọ dee ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ Mosis, Eze Devid, Matiu, Mak, Luk, na Jọn. a Chineke mere ka ha mata ihe ọ chọrọ ka anyị mara, ha edee ya.​—2 Timoti 3:16.

     Dị ka ihe atụ: Ọ bụrụ na onyeisi ụlọ ọrụ gwara odeakwụkwọ ya ka o dee akwụkwọ ozi n’aha ya, ọ bụ onyeisi ụlọ ọrụ ahụ ka a ga-asị dere akwụkwọ ozi ahụ ọ bụrụgodị na odeakwụkwọ ahụ dere ihe ndị ọzọ dị mkpa n’onwe ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa Baịbụl, n’agbanyeghị na Chineke si n’aka ndị mmadụ dee ya, ọ bụ uche ya ka e dere na ya.

  •   Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Baịbụl” pụtara? E si n’okwu Grik bụ́ biblia, nke pụtara “akwụkwọ nta dị iche iche,” nweta okwu ahụ bụ́ “Baịbụl.” Ka oge na-aga, ihe ndị mmadụ na-aghọtazi ma e kwuo biblia bụ ntakịrị akwụkwọ niile e jikọtara ọnụ ha abụrụ Baịbụl.

  •   Olee mgbe e dere Baịbụl? A malitere ide Baịbụl n’afọ 1513 T.O.N.K. ma dechaa ya n’afọ 98 O.N.K. O were ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ isii (1,600) iji dee ya.

  •   Olee ebe Baịbụl mbụ dị? E nweghị Baịbụl mbụ ka dị ruo taa. Ihe kpatara ya bụ na ndị mbụ dere Baịbụl dere ya n’ihe ndị nwere ike imebi emebi dị n’oge ahụ, dị ka papaịrọs na akpụkpọ anụ. Ma, ndị odeakwụkwọ ma nke a na-akọ kpachapụrụ anya na-edepụtagharị ya ruo ọtụtụ narị afọ, nke mere na ihe mbụ e dere na ya ka dị ruo taa maka onye ọ bụla chọrọ ịgụ ya.

  •   Gịnị bụ “Agba Ochie” na “Agba Ọhụrụ”? Ọ bụ ebe ndị a kacha jiri asụsụ Hibru dee na Baịbụl ka a na-akpọkarị Agba Ochie b ma ọ bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ma a na-akpọ ebe ndị e dere n’asụsụ Grik Agba Ọhụrụ ma ọ bụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. E jikọrọ ha abụọ ọnụ ha abụrụ otu akwụkwọ zuru ezu, nke a na-akpọkwa Akwụkwọ Nsọ. c

  •   Gịnị dị na Baịbụl? Ihe dị ebe dị iche iche na Baịbụl bụ akụkọ ihe mere eme, iwu dị iche iche, amụma, abụ uri, ilu, abụ na akwụkwọ ozi.​—Gụọ ebe a kpọrọ “ Akwụkwọ ndị dị na Baịbụl.”

 Gịnị ka Baịbụl na-ekwu gbasara ya?

 Ihe Baịbụl ji malite bụ akụkọ gbasara otú Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, si kee eluigwe na ụwa. Chineke chọrọ ka ndị mmadụ mara ya, ọ kọwara onwe ya na Baịbụl ma kwuo na aha ya bụ Jehova.​—Abụ Ọma 83:18.

 Baịbụl kwuru na e nwere ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu a na-ekwu gbasara Chineke, ma kwuo otú Chineke ga-esi eme ka a mata nke bụ́ eziokwu.

 Baịbụl gwara anyị ihe bụ́ nzube Chineke banyere ụmụ mmadụ na ụwa. O kwuru otú Chineke ga-esi akwụsị ihe ndị mere ụmụ mmadụ ji ata ahụhụ n’ọdịnihu.

 Baịbụl kwuru ihe ndị ga-abara anyị ezigbo uru gbasara ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. Legodị ụfọdụ ihe o kwuru:

  •   Otú anyị na ndị ọzọ ga-esi na-adị ná mma. “N’ihi ya, unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.”​—Matiu 7:12.

     Ihe ọ pụtara: Anyị kwesịrị ịna-emeso ndị ọzọ omume otú anyị ga-achọ ka e si na-emeso anyị.

  •   Otú anyị ga-esi ghara ịna-echegbu onwe anyị. “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi.”​—Matiu 6:34.

     Ihe ọ pụtara: Kama ichegbuwe onwe anyị banyere ihe nwere ike ime echi, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’otú ihe si dịrị anyị ugbu a.

  •   Otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye anyị. “Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya. Nwunye kwesịkwara ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.”​—Ndị Efesọs 5:33.

     Ihe ọ pụtara: Ihe ga-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo bụ ịhụ ibe ha n’anya na ịkwanyere ibe ha ùgwù.

 À gbanweela ihe dị na Baịbụl?

 Mba. Ndị ọkachamara asaala anya ná mmiri leruo Baịbụl ndị dị n’oge ochie na ndị nke dị taa anya ma chọpụta na e nweghị ihe rijuru afọ dị iche na ha. Ọ bụkwa otú a ka o kwesịrị ịdị, n’ihi na ọ bụrụ na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ gụọ Okwu ya ma ghọta ya, ọ̀ bụ na o kwesịghị ịhụ na a gbanweghị ihe na ya? d​—Aịzaya 40:8.

 Gịnị mere e ji sụgharịa Baịbụl n’asụsụ dị iche iche?

 Ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl taa anaghị aghọta asụsụ ndị e ji dee Baịbụl n’oge ochie. Ma “ozi ọma” dị na Baịbụl bụ maka “mba niile na ebo niile na ndị na-asụ asụsụ niile.” (Mkpughe 14:6) N’ihi ya, e kwesịrị ịsụgharị Baịbụl ka ọ dịrị n’asụsụ ndị mmadụ ga-aghọta ka ha nwee ike ịgụ ya ma ghọta ozi si n’aka Chineke nke ọma.

 E nwere ụzọ atọ e si asụgharị Baịbụl. Ha bụ:

  •   Ịsụgharị mkpụrụ okwu niile otu otu ka ọ dị nnọọ otú e si kwuo ya n’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl.

  •   Ịsụgharị ihe ihe e kwuru pụtara bụ iji okwu ndị na-akọwa ihe asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl pụtara sụgharịa ya.

  •   Ịkọwa Baịbụl akọwa bụ ịsụgharị ihe ọ bụla a ghọtara otú ọ ga-atọ ndị na-agụ ya ụtọ. Ma, ebe ọ bụ na isi otú a asụgharị Baịbụl na-eme ka e degharịa ọtụtụ ihe n’ihe ahụ a na-asụgharị, ọ na-eme ka a ghara ịsụgharị ya nke ọma mgbe ụfọdụ.

 Ihe e ji ama Baịbụl a sụgharịrị nke ọma bụ na mgbe ọ bụla o kwere omume, a na-asụgharị okwu dị iche iche otu otu ka ha dị nnọọ otú e si kwuo ya n’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, ma n’otu mgbe ahụ, a na-asụgharị ya otú ọ ga-adị mfe nghọta nakwa otú ndị mmadụ si ekwu okwu ugbu a. Ihe dị na ya kwesịrị ịbụ nnọọ ihe Chineke chọrọ ka ọ dịrị na Baịbụl. e

 Ònye kpebiri ihe ndị e dere na Baịbụl?

 Ọ bụ Chineke, bụ́ onye e dere uche ya na Baịbụl, kpebiri ihe ndị dị na ya. Ndị mbụ o “nyefere okwu dị nsọ nke Chineke” bụ ndị Izrel oge ochie. Ọ họọrọ ha ka ha chebe Akwụkwọ Nsọ Hibru.​—Ndị Rom 3:2.

 È nwere akwụkwọ ndị furu efu kwesịrị ịdị na Baịbụl?

 Mba. Baịbụl zuru ezu. E nweghị akwụkwọ “furu efu” kwesịrị ịdị na ya. Ụfọdụ ndị nwere ike na-ekwu na ụfọdụ akwụkwọ oge ochie e zochiri kemgbe ụwa kwesịrị iso na Baịbụl. f Ma, Baịbụl kwuru ihe ndị bụ́ eziokwu e ji amata akwụkwọ ndị kwesịrị ịdị na ya. (2 Timoti 1:13) Eziokwu ndị ahụ gosiri na akwụkwọ Baịbụl ọ bụla si n’ike mmụọ nsọ Chineke na ibe ya na-ekwu otu ihe. Ma, akwụkwọ oge ochie niile ahụ ụfọdụ ndị na-ekwu na ha kwesịrị ịdị na Baịbụl anaghị ekwu otu ihe. g

 Otú e si achọta amaokwu Baịbụl dị iche iche

  Akwụkwọ ndị dị na Baịbụl

a Ị chọọ ịhụ ebe e dere aha akwụkwọ niile dị na Baịbụl, ndị dere ha, nakwa mgbe e dere ha, biko gụọ ebe a kpọrọ “Akwụkwọ Ndị Dị na Baịbụl.”

b E nwere ebe ole na ole na Baịbụl e dere n’asụsụ Arameik, bụ́ asụsụ yiri nnọọ asụsụ Hibru.

c Ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl anaghị enwe mmasị ịkpọ ebe ụfọdụ na Baịbụl “Agba Ochie” ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ,” kama, obi na-adị ha ụtọ ịkpọ ya “Akwụkwọ Nsọ Hibru” ma ọ bụ “Akwụkwọ Nsọ Grik” ka ọ ghara ịdị ka oge ebe ahụ a na-akpọ “Agba Ochie” ọ̀ gafeela, ejirizie ebe a na-akpọ “Agba Ọhụrụ” dochie ya.

e Ọ na-amasị ọtụtụ ndị ịgụ Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ maka na a sụgharịrị ya nke ọma, ọ dịkwa mfe ọgụgụ. Gụọ isiokwu bụ́ “Is the New World Translation Accurate?

f A na-akpọ akwụkwọ ndị ahụ niile Apọkrịfa. Akwụkwọ Encyclopædia Britannica kwuru na “e kwuwe banyere Baịbụl, [Apọkrịfa] pụtara akwụkwọ ndị e weere na ha esoghị na Baịbụl,” ya bụ, akwụkwọ ndị na-ekwesịghị ịdị na Baịbụl.

g Ị chọọ ịmatakwu banyere ihe a, gụọ isiokwu bụ́ “Akwụkwọ Apọkrịfa Ndị Kọrọ Banyere Jizọs​—Ihe Ha Kọrọ Ọ̀ Bụ Eziokwu?