Gaa n'Isiokwu

Aha Chineke Ọ̀ Bụ Jizọs?

Aha Chineke Ọ̀ Bụ Jizọs?

Ihe Baịbụl kwuru

 Jizọs kwuru na ya bụ “Ọkpara Chineke.” (Jọn 10:36; 11:4) O nweghị mgbe Jizọs kwuru na ya bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.

 Mgbe Jizọs na-ekpegara Chineke ekpere, ọ sịrị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”—Matiu 6:9.

 Jizọs kwuru ihe bụ́ aha Chineke mgbe ọ na-ekwu ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. O kwuru, sị: “Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.”—Mak 12:29; Diuterọnọmi 6:4.