Gaa n'Isiokwu

Ụwa Ọhụrụ Dị Nso

Olee otú anyị si mara? Ị ga-achọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara ya n’Ụlọ Nche a.

 

Gụkwuo Gbasara Ya

Lee ihe ọhụrụ ndị e tinyere: vidio, egwú, akụkọ nakwa isiokwu dị iche iche.

Ihe Ọhụrụ Ndị E Nwere

Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl

A ga-eji Baịbụl zaa gị ajụjụ ị jụrụ, ma ọ bụkwanụ mee ka ị matakwuo gbasara Ndịàmà Jehova.

Gaa Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova

Chọpụta ebe anyị na-amụ ihe na otú anyị si amụ ihe. Onye ọ bụla nwere ike ịbịa ọmụmụ ihe anyị, anaghịkwa asị ndị bịara ya tụọ ụtụ.

MGBAKỌ UKWU NDỊÀMÀ JEHOVA NKE AFỌ 2024

Ozi Ọma Jizọs Kwusara

Ná mgbakọ ukwu nke afọ a, a ga-egosi vidio nke mbụ n’ime ọmarịcha vidio ndị a na-emepụta banyere ndụ Jizọs n’ụwa. Lee ihe ụfọdụ si na ya.

 

Lee Vidio A

Ole Ndị Ka Ndịàmà Jehova Bụ?

Anyị si n’agbụrụ dị iche iche, na-asụkwa asụsụ dị iche iche. Ma, anyị niile na-ekwu otu ihe, na-emekwa otu ihe. Nke kachanụ bụ na anyị niile na-agba mbọ ime ihe Jehova chọrọ. Ọ bụ ya ka e dere uche ya na Baịbụl, ọ bụkwa ya kere ihe niile. Anyị na-agbalị ime otú Jizọs Kraịst mere, obi dịkwa anyị ụtọ na anyị bụ Ndị Kraịst. Onye ọ bụla n’ime anyị na-ewepụta oge ya na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl ma na-akọrọ ha gbasara Alaeze Chineke. A na-akpọ anyị Ndịàmà Jehova n’ihi na anyị na-akọrọ ndị mmadụ gbasara Jehova na Alaeze ya.

Leruo anya ebe a, ka ị hụ ihe ndị ọzọ anyị dewere. I nwere ike ịnọ ebe a gụọ Baịbụl. Ị ga-agụtakwa ihe ndị ga-enyere gị aka ịmatakwu ndị anyị bụ na ihe ndị anyị kweere.

 

Ebe Ndịàmà Jehova abụọ na-ezi otu nwoke ozi ọma n'ugbo osikapa.