Gaa n'Isiokwu

Isi n’Etiti Osimiri Tara Ata Gaa Kwusaa Ozi Ọma

Isi n’Etiti Osimiri Tara Ata Gaa Kwusaa Ozi Ọma

E nwere ụmụ obere agwaetiti ndị dị nso n’ebe ọdịda anyanwụ steeti ndị Jamanị a na-akpọ Skleswig-Holstin. A na-akpọ agwaetiti ndị ahụ Haligin. Ihe dị ka narị mmadụ atọ bi na ha. Ha dịkwa n’oké osimiri. Olee otú Ndịàmà Jehova na-esi aga ezi ndị bi n’ebe ndị ahụ ozi ọma?​—Matiu 24:14.

Ndịàmà Jehova na-eji ụgbọ mmiri aga n’ụfọdụ n’ime ha. Ma, ụfọdụ n’ime ha chọọ izi ndị bi n’agwaetiti ndị ọzọ ozi ọma, ha na-esi n’ụzọ ọzọ aga n’ebe ndị ahụ. Ha na-eji ụkwụ aga ihe dị ka kilomita ise n’etiti osimiri tara ata. Olee otú ha si eme ya?

Ha Na-aga n’Oge Osimiri Tara

Otú ha si eme ya bụ ịmata oge osimiri ji eto na oge o ji ata. N’ihe dị ka awa isi ọ bụla, osimiri dị na Haligin na-ata ihe dị ka mita atọ, n’awa isii ọzọ, ya etookwa. N’oge ọ tara, ụmụnna anyị na-eji ụkwụ si na ya gaa n’agwaetiti atọ n’ime agwaetiti ndị dị ebe ahụ.

Olee ihe ndị ọ na-ewe iji ruo ebe ndị ahụ? Otu nwanna aha ya bụ Ulrich bụ́ aka ochie n’ịkpọ ndị mmadụ aga ebe ahụ kwuru, sị: “Ọ na-ewe ihe dị ka awa abụọ tupu mmadụ eruo n’otu n’ime agwaetiti ndị dị na Haligin. Anyị na-agbakarị ụkwụ ọtọ aga. Ọ bụ ụzọ kacha mma e si esi n’etiti osimiri tara ata aga ekwusa ozi ọma n’agwaetiti ndị ahụ. N’oge oyi, anyị na-eyi buutu.”

Ọ dị ka ihe na-eme ná nrọ. Nwanna Ulrich kwuru, sị: “Mgbe anyị na-aga, ọ na-adị anyị ka ànyị nọ n’ụwa ọzọ. Ebe ụfọdụ n’osimiri ahụ bụ apịtị apịtị, ebe ụfọdụ abụrụ okwute okwute. E nwekwara ebe ndị ahịhịa juru na ya. Ị na-aga, gị ana-ahụ nnụnụ dị iche iche, nshịkọ, na anụmanụ ndị ọzọ.” Mgbe ụfọdụ, ụmụnna anyị na-agafe obere mmiri dị́ n’etiti osimiri ahụ. Ihe a na-akpọ ya n’asụsụ Jaman bụ Priele.

E nwere nsogbu ụmụnna anyị na-enwe ma ha na-aga n’ebe ndị ahụ. Nwanna Ulrich kwuru, sị: “Mmadụ nwedịrị ike ifu ụzọ ma ọ na-aga, nke ka nke, ma alụlụ kpuchie ebe niile. N’ihi ya, anyị na-eji ihe na-enyere mmadụ aka ịma ebe ọ na-aga, aga. Anyị na-agba mbọ gafee n’oge tupu osimiri ahụ etojuo.”

Ebe Ndịàmà Jehova na-ezi ozi ọma n’otu n’ime obere agwaetiti e nwere na Haligin

Mbọ niile a ụmụnna anyị gbara, ọ̀ baara uru? Nwanna Ulrich kọrọ ihe otu nwoke karịrị afọ iri itoolu mere. Nwoke a na-agụkarị Ụlọ Nche anyị na Teta! Nwanna Ulrich kọrọ, sị: “E nwere otu ụbọchị anyị na-enwechaghị ohere ịga na nke nwoke a. Ma, tupu anyị alawa, ọ gbaara ígwè ya bịakwute anyị ma sị, ‘Ùnu agaghị enye m Ụlọ Nche taa?’ Ihe a o kwuru mere ka obi tọọ anyị ụtọ, n’ihi ya, anyị nyere ya Ụlọ Nche.”