Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha—Na Nọọwee

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha—Na Nọọwee

AFỌ ole na ole gara aga, Roald na nwunye ya bụ́ Elsebeth bi na Begịn, nke bụ́ obodo nke abụọ kacha ibu na Nọọwee. Ha na-enweta ihe ọ bụla ha chọrọ n’ebe ahụ. Ha dị ihe dị ka iri afọ anọ na asatọ. Ha na ụmụ ha, bụ́ Isabel na Fabian, ji obi ha niile na-eje ozi n’ọgbakọ. Roald bụ okenye, Elsebeth abụrụ ọsụ ụzọ oge niile. Isabel na Fabian bụ ndị nkwusa na-eme nke ọma.

Ma, n’ọnwa Septemba afọ 2009, ezinụlọ a kpebiri ime ihe dị iche, ya bụ, ịga kwusaa ozi ọma otu izu n’ime ime obodo. N’ihi ya, Roald, Elsebeth, na Fabian gara n’obodo Nọkịn, nke bụ́ ala fọrọ obere ka mmiri gbaa ya gburugburu na Finmak n’ebe ugwu Nọọwee. Fabian dị afọ iri na asatọ n’oge ahụ. E nwere ụmụnna ndị si ebe ọzọ bịa ikwusa ozi ọma n’ime ime obodo ahụ. Ha na ha kwusara ozi ọma n’obodo Kiọlefjọ. Roald mechara kwuo, sị: “Ná mmalite izu ahụ, obi dị m ụtọ na m gbalịrị hazie ọrụ m ka m nwee ike iji otu izu kwusaa ozi ọma.” Ma, tupu izu ahụ agwụ, e nwere ihe malitere inye Roald nsogbu n’obi. Gịnị ka ọ bụ?

 AJỤJỤ A NA-ATỤGHỊ ANYA YA

E nwere otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ n’obodo Finmak. Aha ya bụ Mario. Roald kwuru, sị: “Mario jụrụ anyị ma ànyị ga-achọ ịkwaga n’obodo Lakselv inyere ndị nkwusa iri abụọ na atọ nọ n’ọgbakọ dị ebe ahụ aka.” Ajụjụ ahụ juru Roald anya n’ihi na ọ tụghị anya ya. O kwuru, sị: “Mụ na nwunye m echeela banyere ịga ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ma ọ ga-abụ mgbe ụmụ anyị torola, gaa biri nke onwe ha.” Ma, n’ụbọchị ole na ole ahụ Roald kwusara ozi ọma n’ime obodo a, ọ chọpụtara na ndị mmadụ chọrọ ịmụta banyere Jehova. Ugbu a ka e kwesịrị inyere ha aka, ọ bụghị mgbe e mechara. O kwuru, sị: “Ajụjụ ahụ nyere akọnuche m nsogbu, o kweghịkwa m hie ụra ruo ụbọchị ole na ole.” Mario ji ụgbọala buru Roald na ezinụlọ ya gaa Lakselv, bụ́ obodo dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri anọ ma é si n’ebe ndịda Kiọlefjọ gawa ya. Mario chọrọ ka Roald na ezinụlọ ya jiri anya ha hụ obere ọgbakọ ahụ.

Mgbe ha ruru Lakselv, Andreas, bụ́ otu n’ime ndị okenye abụọ e nwere n’ọgbakọ ahụ, gosiri Roald na ezinụlọ ya ókèala ha na Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. Ndị ọgbakọ ahụ nabatara ha nke ọma ma gwa Roald na Elsebeth na obi ga-adị ha ụtọ ma ezinụlọ ha kwafeta n’ebe ahụ ma nyere ha aka n’ikwusa ozi ọma. Andreas mụmụrụ ọnụ ọchị ma kwuo na ya achọtarala Roald na Fabian ebe ha nwere ike ịrụ ọrụ! Gịnị ka Roald na ezinụlọ ya ga-eme?

GỊNỊ KA HA GA-EME?

Ihe mbụ Fabian kwuru bụ: “Achọghị m ịkwafeta ebe a.” Ọ chọghị ịhapụ ndị enyi ya, bụ́ ndị ha na ya tokọrọ n’ọgbakọ ha. Ọ chọghịkwa ịga biri n’ime ime obodo. Ọ mụchabeghịkwa ọrụ ọ na-amụ, nke bụ́ ịrụzi ọkụ eletrik. Isabel, bụ́ nwanne Fabian, dị afọ iri abụọ na otu mgbe ahụ. Mgbe a kpọrọ ya n’ekwentị ma jụọ ya ihe o chere banyere ịkwaga ebe ahụ, o kwuru, sị: “Ọ bụ ihe m chọrọ ime kemgbe!” Ma, o kwukwara, sị: “Mgbe m chebakwuuru ya echiche, m jụrụ onwe m, sị, ‘Ọ̀ bụ ihe m kwesịrị ime? Ọ̀ ga-ewute m ma m hapụ ndị enyi m? Ọ̀ ga-aka mma ka m nọrọ n’ọgbakọ anyị, bụ́ ebe ihe dịịrị m mma, na ebe maara m ahụ́?’” Gịnị ka Elsebeth kwuru mgbe a gwara ha kwafeta n’ọgbakọ ahụ? O kwuru, sị: “Aghọtara m na Jehova enyela ezinụlọ anyị ọrụ. Ma, m chekwara banyere ụlọ anyị ka rụgharịchara nakwa ihe niile dị na ya, bụ́ ihe ndị anyị nwetara kemgbe iri afọ abụọ na ise.”

Elsebeth na Isabel

Mgbe Roald na ezinụlọ ya kwusachara ozi ọma n’ebe ahụ n’izu ahụ, ha laghachiri Begịn. Ma ha ka nọ na-eche banyere ụmụnna ndị ahụ nọ na Lakselv, bụ́ ebe dị ihe dị ka puku kilomita abụọ na otu narị. Elsebeth kwuru, sị: “M kpekuru Jehova ekpere ọtụtụ ugboro banyere ya, mụ na ụmụnna ndị ahụ ana-ezirịtakwa ozi. M na-ezigara ha foto anyị, na-akọkwara ha otú ozi anyị si aga, ha ana-ezitekwara anyị nke ha.” Roald kwuru, sị: “Achọrọ m ile ma obi m ọ̀ ga-anabata ịkwaga ebe ahụ. Anọkwa m na-eche ma ọ̀ ga-ekwe anyị omume. Olee otú anyị ga-esi na-akpata ego anyị ga-eji na-egbo mkpa anyị? M kpere ekpere ọtụtụ ugboro, mụ na ndị ezinụlọ m na ụmụnna ndị nọrọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ akparịtakwa banyere ya.” Fabian kwuru, sị: “Ka m na-eche banyere ya, aghọtara m na o nweghị ihe kwesịrị ime ka m jụ ịga. M kpere ekpere ọtụtụ ugboro gwa ya Jehova, obi jikwa nwayọọ nwayọọ sie m ike ka anyị kwaga ebe ahụ.” Isabel kwanụ? Ọ malitere ịsụ ụzọ n’obodo ha ka o nwee ike ijikere maka ịkwaga ebe ahụ. Ọ sụrụ ụzọ ọnwa isii ma wepụtakwuo oge na-amụ ihe. N’ihi ya, obi siri ya ike ka ha kwaga n’ebe ahụ.

IHE NDỊ HA MERE IJI MEE IHE HA KPEBIRI

Ka ezinụlọ ahụ chọsikwuru ike ịkwafe n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa, ha mere ihe ụfọdụ iji nwee ike ịkwapụ. Roald na-arụ ọrụ na-enye ya ezigbo ego, nke na-atọkwa ya ụtọ, ma ọ gwara onye ọ na-arụrụ ọrụ ka o nye ya ezumike otu afọ. Ma, onye ahụ gwara ya na ọ ga na-enye ya ezumike izu isii, ma ọ ga na-arụ ọrụ izu abụọ. Roald kwuru, sị: “Ego a na-akwụ m ebughịzi ibu, ma m nwere ohere ime ihe m chọrọ.”

Elsebeth kwuru, sị: “Di m gwara m ka m chọta ụlọ na Lakselv ma nye ndị ọzọ ụlọ anyị dị na Begịn ka ha na-akwụ anyị ụgwọ. Anyị mechara mee ya, ma o gbutụrụ oge, anyị emeekwa ihe anyị kwesịrị ime. Ka obere oge gachara, ụmụ anyị chọtara obere ọrụ ha ga na-arụ. Ha nyekwara aka na-azụta nri, na-ewetakwa ego ụgbọ.”

Isabel kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na obodo ahụ anyị kwagara bụ obere obodo, o siiri m ike inweta ọrụ m ga  na-arụ ma na-asụ ụzọ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị m ka amaghị m ihe m ga-eme.” Ma, Isabel malitere ịrụ obere ọrụ ọ bụla o nwetara. N’afọ nke mbụ, ọ rụtụrụ ọrụ itoolu dị iche iche, ma nwee ike ịna-egbo mkpa ya. Gịnị ka Fabian mechara mee? O kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na m ka na-amụ ọrụ, nke bụ́ ịrụzi ọkụ eletrik, m ka kwesịrị ịmụcha ya. Anọ m na Lakselv mụchaa ya. M mechara gafee ule m lere, nwetakwa obere ọrụ n’ebe m ga na-arụzi ọkụ.”

OTÚ NDỊ ỌZỌ SI WEPỤTAKWUO OGE JEE OZI

Ebe Marelius na Kesia na-ezi nwaanyị onye Semi ozi ọma na Nọọwee

Marelius na nwunye ya, bụ́ Kesia, chọkwara ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Marelius dị afọ iri abụọ na itoolu ugbu a, nwunye ya adịrị afọ iri abụọ na isii. Marelius kwuru, sị: “Okwu ndị e kwuru na ajụjụ ọnụ ndị a gbara ndị ọsụ ụzọ ná mgbakọ distrikti mere ka m chewe otú m ga-esi wepụtakwuo oge ijere Chineke ozi.” Ma ịkwaga ebe ọzọ yiri nwunye ya bụ́ Kesia ihe siri ezigbo ike. Kesia kwuru, sị: “Ịhapụ ndị m hụrụ n’anya kwaga n’ebe ọzọ na-amapụ m obi.” Marelius rụrụ ọrụ oge niile iji kwụchaa ego ha gbaziiri rụọ ụlọ ha. O kwuru, sị: “Anyị rịọrọ Jehova ọtụtụ ugboro ka o nyere anyị aka ka anyị nwee ike ịhazigharị ihe ndị anyị na-eme. O nyekwaara anyị aka ịkwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa.” Ihe mbụ ha mere bụ iwepụtakwu oge na-amụ Baịbụl. Ihe ọzọ ha mere bụ ire ụlọ ha, gbaa arụkwaghịm n’ọrụ ha, kwapụzie n’ọnwa asatọ n’afọ 2011, kwaga n’obodo Ọlta, nke dị n’ebe ugwu Nọọwee. Iji nwee ike ịna-egbo mkpa ha ma na-asụ ụzọ, ihe Marelius na-arụ bụ idekọ ego ụlọ ọrụ na-enweta na ego ha na-emefu, nwunye ya bụ́ Kesia na-arụkwa ọrụ n’ebe a na-ere ihe.

Knut na Lisbeth bụ di na nwunye ndị dị ihe dị ka afọ iri atọ na ise. Ihe a kọrọ n’Akwụkwọ Mgbaafọ banyere ndị na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma metụrụ ha n’ahụ́. Lisbeth kwuru, sị: “Ihe ndị ahụ a kọrọ mere ka anyị chee echiche banyere ije ozi ná mba ọzọ. Ma, obi akachaghị m n’ihi na m chere na ọ bụghị ihe onye dị ka m ga-emeli.” N’agbanyeghị nke ahụ, ha gbara mbọ mee ihe ha kpebiri ime. Knut kwuru, sị: “Anyị rere ụlọ anyị, kwaga n’ụlọ mama m ka anyị nwee ike ịkpakọta ego. Anyị mechara gafee n’ọgbakọ na-eji Bekee amụ ihe na Begịn ka anyị nwee ike ịmata otú ikwusa ozi ọma n’ala ọzọ na-adị. Anyị gara biri n’ụlọ mama Lisbeth n’oge ahụ.” N’oge na-adịghị anya, Knut na Lisbeth kpebiri na oge eruola ka ha kwapụ. Ha kwagara n’ebe dị anya, ya bụ, Yuganda. Ha na-alaghachi Nọọwee kwa afọ gaa rụọ ọrụ ọnwa abụọ. Ha na-esi otú ahụ enweta ego ha ga-eji na-egbo mkpa ha ma jiri oge ha niile na-ekwusa ozi ọma na Yuganda n’ọnwa ndị fọrọ afọ.

“DETỤNỤ JEHOVA IRE MA HỤ NA Ọ DỊ MMA”

“Ezinụlọ anyị adịkwuola n’otu.”—Roald

Olee otú ihe si gaara ndị a wepụtara onwe ha ikwusa ozi ọma? Roald kwuru, sị: “N’ime ime obodo ebe a, ezinụlọ anyị na-enwekwu oge ịnọrị karịa mgbe anyị bi na Begịn. Ezinụlọ anyị adịkwuola n’otu. Otu ngọzi anyị nwetara bụ na ụmụ anyị na-eme nke ọma n’ọgbakọ.” O kwukwara, sị: “Anyị agbanweela otú  anyị si ele akụ̀ anya. Anyị anaghịzi achụ ya ọnwụ ọnwụ. Anyị aghọtala ugbu a na ọ bụghị ya bụ ihe kacha mkpa.”

Elsebeth chọpụtara na o kwesịrị ịmụ asụsụ ọzọ. N’ihi gịnị? N’ebe Ọgbakọ Lakselv na-ekwusa ozi ọma, e nwere otu obodo nta a na-akpọ Karasyok, nke bụ́ obodo ndị Semi, ya bụ, ndị bi n’ebe ugwu Nọọwee, Swidin, Finland, na Rọshịa. N’ihi ya, Elsebeth malitere ịmụ asụsụ Semi, ka o nwee ike ịna-ezi ndị ahụ ozi ọma. Ugbu a, ọ na-asụtụ asụsụ ahụ. Ebe ahụ ha na-ekwusa ozi ọma ugbu a ọ̀ na-atọ ya ụtọ? O ji obi ụtọ kwuo, sị: “Ana m amụrụ mmadụ isii Baịbụl ugbu a. O nweghị ebe ọzọ m chọrọ ibi karịa ebe anyị bi ugbu a!”

Fabian bụ ọsụ ụzọ na ohu na-eje ozi ugbu a. O kwuru na ya na Isabel gbara mmadụ atọ bụ́ ndị na-eto eto n’ọgbakọ ahụ ume ka ha na-ewepụta oge na-arụkwu ọrụ n’ọgbakọ. Ha atọ na-ekwusasi ozi ọma ike ugbu a. N’eziokwu, e meela mmadụ abụọ n’ime ha baptizim. Ha sụkwara ụzọ inyeaka n’ọnwa atọ n’afọ 2012. Okwukwe otu n’ime ha jibu nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ. O mechara kelee Fabian na Isabel maka aka ha nyeere ya ịmalitekwa ịnụ ọkụ n’obi. Fabian kwuru, sị: “Ihe ahụ o kwuru metụrụ m n’ahụ́. Inyere mmadụ aka na-atọ ụtọ!” Isabel kwuru, sị: “N’ebe a anyị na-eje ozi, ‘edetụla m Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’” (Ọma 34:8) O kwukwara, sị: “Ije ozi n’ebe a na-atọkwa ezigbo ụtọ!”

Marelius na Kesia anaghịzi ebi ndụ okomoko, ma ha na-enwekwu obi ụtọ. E nweziri ndị nkwusa iri anọ na otu n’ọgbakọ ahụ dị n’Ọlta, bụ́ ebe ha kwagara. Marelius kwuru, sị: “M cheta afọ ndị gara aga, obi na-adị m ụtọ ịhụ otú ndụ m sirila gbanwee. Anyị na-ekele Jehova na anyị bụ ndị ọsụ ụzọ na-ejere ya ozi ebe a. O nweghị ihe na-eme obi ụtọ karịa nke a.” Kesia kwukwara, sị: “Amụtala m ịtụkwasị Jehova obi m niile. Ọ na-elekọtakwa anyị nke ọma. Achọpụtakwala m na ebe ọ bụ na anyị na ndị ikwu anyị ebighị nso, obi na-atọkwu anyị ụtọ mgbe ọ bụla anyị na ha nọrịrị. O nwebeghị mgbe m kwara ụta maka ihe a anyị kpebiri ime.”

Ebe Knut na Lisbeth na-amụrụ otu ezinụlọ ihe na Yuganda

Olee otú Knut na Lisbeth na-eme na Yuganda? Knut kwuru, sị: “O were oge tupu ebe ahụ na omenala ha amara anyị ahụ́. Mgbe ụfọdụ, mmiri na-akpọchi, a na-ewere ọkụ, afọ na-arụkwa anyị. Ma, anyị nwere ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl!” Lisbeth kwuru, sị: “E nwere ókèala ndị a na-ekwusatụbeghị ozi ọma na ha. Ịga ha na-ewe anyị naanị nkeji iri atọ. Ma, ọ na-abụ anyị gaa ebe ahụ, anyị na-ahụ ka ndị mmadụ na-agụ Baịbụl, na-arịọ anyị ka anyị bịa kụziere ha. Ịkụziri ndị dị umeala n’obi Baịbụl na-eme ka mmadụ nwee ọṅụ na-enweghị atụ!”

Ebe ọ bụ Onye Ndú anyị, bụ́ Kraịst Jizọs, malitere ozi ọma a anyị na-ekwusa, ọ ga-abụrịrị na obi na-adị ya ụtọ ịhụ otú e si na-ekwusa ya n’ọtụtụ ebe n’ụwa karịa ebe yanwa kwusaruru! N’eziokwu, obi dị ndị niile na-efe Chineke ezigbo ụtọ iwepụta onwe ha na-arụ ọrụ ahụ Jizọs nyere n’iwu, nke bụ́ ‘ime ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’—Mat. 28:19, 20.