Gaa n'Isiokwu

Mgbakọ E Nwere na Rom n’Asụsụ Tigalọg “Ejikọtala Anyị Ọnụ Ọzọ”

Mgbakọ E Nwere na Rom n’Asụsụ Tigalọg “Ejikọtala Anyị Ọnụ Ọzọ”

Ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova ndị na-asụ asụsụ Tigalọg si n’obodo ha bụ́ Filipinz gaa otu mgbakọ ukwu e nwere n’asụsụ ha na Rom dị́ n’Ịtali. Njem a were ha ihe karịrị puku kilomita iri. E nwere mgbakọ a na Julaị 24-​26, afọ 2015.

Otu akwụkwọ kwuru na ndị Filipinz karịrị narị puku asatọ na puku iri ise bizi na Yurop. Ọ bụ ya mere na Yurop, ihe dị ka ọgbakọ Ndịàmà Jehova iri isii na ìgwè dị iche iche na-aghọbeghị ọgbakọ na-enwe ọmụmụ ihe ha n’asụsụ Tigalọg, na-ezikwa ndị Filipinz bí ebe ahụ ozi ọma.

Ma, mgbakọ a e nwere na Rom bụ mgbakọ abalị atọ mbụ Ndịàmà Jehova ndị a na-enwe n’asụsụ ha n’obodo a. Puku mmadụ atọ na narị abụọ na iri atọ na itoolu bịara mgbakọ a. Ha nwere ezigbo obi ụtọ mgbe Nwanna Mark Sanderson, onye só n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, onye jebukwarala ozi n’obodo Filipinz, na-ekwu okwu mmechi n’ụbọchị ọ bụla ná mgbakọ ahụ.

O Ruru M Nnọọ n’Obi

Ò nwere oké uru ọ bara ma mmadụ gaa mgbakọ e nwere n’asụsụ ya, kama ịga nke e nwere n’asụsụ ọzọ ọ ma? Otu nwaanyị aha ya bụ Eva, bụ́ nne naanị ya na-azụ ụmụ, kwuru na ya na-anụtụ Bekee, mana na mgbakọ a e nwere n’asụsụ ha mere ka ihe ndị e ji Baịbụl kụzie ruo ya nnọọ n’obi. O nwere ihe ya na ụmụ ya abụọ mere nyeere ha aka inweta ego ha ji si Spen gaa mgbakọ a n’Ịtali. Ha na-emebu, otu ụbọchị n’izu ọ bụla, ha agaa rie nri na họtel. Ma, ha kpebiziri ịna-aga otu ugbo n’ọnwa. Nwaanyị ahụ kwuru na mbọ niile ọ gbara gaa mgbakọ a efughị ọhịa n’ihi na ya ghọtara ihe niile e kwuru.

Otu nwaanyị aha ya bụ Jasmin, onye bí na Jamanị, rịọrọ nne ya ukwu ka o kwe ka ya ghara ịbịa ọrụ n’ụbọchị ndị ọ ga-eji gaa mgbakọ a. Jasmin kwuru, sị: “Tupu oge mgbakọ ahụ eruo, a gwara m na agaghị m ahapụ ọrụ gaa mgbakọ ahụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ọrụ anyị ga-arụ mgbe ahụ. Kama iwewa iwe, arịọrọ m Jehova ka o nyere m aka, gakwuruzie nne m ukwu ka mụ na ya kparịta ya. Mụ na ya haziri otú a ga-esi rụọ ọrụ ndị ahụ, mụ enweekwa ohere gaa mgbakọ ahụ. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na m gara mgbakọ ahụ, mụ na ụmụnna m ndị Filipinz bí na Yurop anọrịa.”

O teela ọtụtụ ndị Filipinz ndị a bí ná Yurop na-ahụbeghị ala nna ha nakwa ndị enyi ha bí n’obodo ndị ọzọ dị́ na Yurop. Ná mgbakọ a, ọtụtụ n’ime ha hụrụ ndị enyi ha ha na ha matara mgbe ha dum na-aghọbeghị Ndịàmà Jehova. Mana ugbu a, ha niile bụzi ụmụnna. (Matiu 12:48-​50) Otu nwoke aha ya bụ Fabrice kwuru, sị, “Ịhụ ndị mụ na ha si otu ebe mere m nnọọ obi ụtọ.” Ka e mechara mgbakọ a, otu nwanna nwaanyị ji obi ụtọ na-asị, “Mgbakọ a ejikọtala anyị ọnụ ọzọ.”