Gaa n'Isiokwu

Foto Wọwik nke 4 (Malite n’ọnwa Mee Ruo n’ọnwa Ọgọst Afọ 2015)

Foto Wọwik nke 4 (Malite n’ọnwa Mee Ruo n’ọnwa Ọgọst Afọ 2015)

Lee foto ndị dị ebe a ka ị mata otú ọrụ si na-aga n’ebe Ndịàmà Jehova na-arụ isi ụlọ ọrụ ọhụrụ ha na otú ndị mmadụ si wepụta onwe ha rụọ ọrụ ebe ahụ n’agbata ọnwa Mee na Ọgọst afọ 2015.

Ụlọ ndị a rụcharala arụcha na Wọwik. I si n’aka ekpe n’elu gụwa gaa n’aka nri, ha bụ:

  1. Ebe A Na-arụzi Ụgbọala

  2. Ebe Ndị Ọbịa Na-adọwa Ụgbọala

  3. Ebe A Na-arụzi Ihe na Ebe Ndị Ga-ebi na Wọwik Ga Na-adọwa Ụgbọala

  4. Ụlọ Obibi nke B

  5. Ụlọ Obibi nke D

  6. Ụlọ Obibi nke CH

  7. Ụlọ Obibi nke A

  8. Ọfis Ụfọdụ

Ihe a rụrụ na Wọwik na Mee 6, afọ 2015

Mgbe a na-etinye ígwè n’ọmarịcha mmiri na-acha anụnụ anụnụ dị na Wọwik. Ígwè a ga-eme ka ihe dị iche iche ghara ịna-adaba n’ebe mmiri a na-esi asọfe.

Ihe a rụrụ na Mee 6, afọ 2015 n’Ebe A Na-arụzi Ihe na n’Ebe Ndị Ga-ebi na Wọwik Ga Na-adọwa Ụgbọala

Ebe e ji siment a gwara agwa na-agba n’ahụ́ paseeji. Isi otú a arụ ya na-eme ka a rụọ ya ngwa ngwa karịa nke a na-awụ awụ.

Ihe a rụrụ na Wọwik na Mee 6, afọ 2015

Ebe onye na-arụ ọrụ na ngalaba na-edekọ ihe ji kamera na-ese ihe ndị a na-arụ. Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-ele foto ndị a kwa izu ka ha mata otú ọrụ si na-aga.

Ihe e mere na Tuzedo na Mee 30, afọ 2015

Mgbe di na nwunye sí n’ebe ndịda Kalifonịa bịara na Tuzedo. Ha ga-arụ ọrụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Ili Paịpụ Mmiri. Ha so n’ọtụtụ narị mmadụ ndị bịara ịrụ ọrụ na Wọwik. Ndị ọrụ na-esi na Tuzedo aga ọrụ na Wọwik. N’abalị mbụ n’ọnwa Ọgọst, narị ndị ọrụ ọhụrụ asaa na asaa wụchara na Tuzedo ịrụ ọrụ na Wọwik.

Ihe a rụrụ n’Ụlọ obibi nke B na Jun 9, afọ 2015

Mgbe ndị ọrụ ngo ji kren na-ebugo ahụ́ ụlọ èzí nke ụlọ obibi nke B. Ya bugochaa ya, ndị ọrụ etinyekọtazie ya ọnụ. Ụlọ obibi a bụ ụlọ obibi ikpeazụ e si otú a rụọ ahụ́ ya.

Ihe ndị a rụrụ n’Ụlọ obibi nke CH na nke D na Jun 16, afọ 2015

Ebe onye ọrụ ngo na-etinye paseeji si n’elu ga-ejikọta Ụlọ Obibi CH na D.

Ihe a rụrụ n’Ụlọ obibi nke CH na Jun 25, afọ 2015

Ebe ndị na-achọ ala mma na-akụ ahịhịa n’ebe ndịda ụlọ obibi nke CH.

Ihe a rụrụ na Wọwik na Julaị 2, afọ 2015

Ebe ndị ọrụ na-arụzigharị ọwa mmiri. Mmiri ga na-esi n’ọwa mmiri a na-asọba ná nnukwu olulu mmiri. A rụburu ya n’agbata afọ 1951 na afọ 1959. Ebe ọ bụ na mmiri na-ezokarị n’ebe a, ọwa mmiri a ga-eme ka idei mmiri ghara ịna-akpa Wọwik na ụlọ ndị dị gburugburu ebe ahụ aka ọjọọ.

Ihe ndị a rụrụ n’Ụlọ obibi nke A na Julaị 15, afọ 2015

Ka a ghara inwe ọtụtụ ndị n’ebe a na-arụ ọrụ, a rụrụ ọrụ ụfọdụ ma n’ụtụtụ ma n’abalị. Ọrụ ndị ahụ bụ ite ime ụlọ agba na ifuchi paịpụ ihe. Mgbe ndị na-arụ ọrụ n’ehihie bịara ọrụ, e kenyere ọtụtụ narị mmadụ ịrụ ọrụ malite n’elekere anya atọ nke ehihie ruo n’elekere anya abụọ nke ụtụtụ.

Ihe a rụrụ n’Ụlọ obibi nke D na Julaị 20, afọ 2015

Ebe onye na-etinye ntụ oyi na-akụziri onye ọrụ ibe ya otú e si afụchi paịpụ ihe.

Ihe a rụrụ n’Ụlọ obibi nke B na Julaị 21, afọ 2015

Mgbe a na-ete ígwè ndị ji paseeji si n’elu jikọta Ụlọ obibi nke B na Ebe A Na-arụzi Ihe agba.

Ihe e mere na Tuzedo na Julaị 27, afọ 2015

Ebe ọtụtụ ndị ọrụ na-eche ụgbọala ga-ebu ha gaa ọrụ na Wọwik. Ọtụtụ ụgbọala na-ebu ndị ọrụ bịa, burukwa ha laa ma e mechie ọrụ.

Ihe e mere na Tuzedo na Julaị 27, afọ 2015

Mgbe a na-akpụ mmadụ atọ só na-arụ ọrụ na Wọwik isi. A na-akpụ ihe karịrị narị mmadụ anọ isi kwa izu n’ebe a na-akpụ isi na Tuzedo, Wọwik, nakwa n’ebe a na-edosa ihe na Mọntgomeri.

Ihe a rụrụ na Wọwik n’Ọgọst 3, afọ 2015

Mgbe a na-arụ ebe ga na-eme ka ime ụlọ na-ekpọkwu ọkụ n’oge oyi, na-emekwa ka ime ụlọ na-ajụkwu oyi n’oge ọkọchị. Ihe a ga-eme ka a ghara ịna-emefu nnukwu ego n’ihe na-ajụ ụlọ oyi nakwa n’ihe na-ekpo ụlọ ọkụ. Ọ ga-emekwa ka ikuku ọjọọ ghara ịna-akpa ebe ahụ aka ọjọọ.

Ihe a nọ na Mọntgomeri nakwa na Niu Yọk mee n’Ọgọst 7, afọ 2015

Ebe a bụ ebe a na-ebubata ngwá ọrụ dị iche iche a na-eji arụ ọrụ na Wọwik. E bubata ha, e tinye ha n’akpa ma buru ha gaa Wọwik.

Ihe e mere na Tuzedo na Niu Yọk, n’Ọgọst 14, afọ 2015

Ebe mmadụ abụọ só na-arụ ọrụ na Wọwik na otu ezinụlọ bí na Wọwik na-eri nri. Ha bụ onye nke abụọ na onye nke atọ ma i si n’aka nri gụrụ gawa. Ọtụtụ Ndịàmà Jehova bí na Wọwik wepụtara ụlọ ha ka ọtụtụ ndị ọrụ biri na ha. Ọ bụkwa ihe ezinụlọ a ị na-ahụ ebe a mere.

Ihe e mere n’Ọgọst 17, afọ 2015 n’Ebe A Na-arụzi Ihe na Ebe Ndị Ga-ebi na Wọwik Ga Na-adọwa Ụgbọala

Ebe otu onye ọrụ ji ihe e ji enyo sọfịa na-enyocha otú ala dị.

Ihe a rụrụ n’Ọfis Ụfọdụ n’Ọgọst 20, afọ 2015

Mgbe e tinyechara windo ụlọ ebe ndị bịara ilegharị anya ga-anọ tupu e dugharịwa ha.

Ihe ndị a rụrụ na Wọwik n’Ọgọst 26, afọ 2015

N’agbata ọnwa Mee na Ọgọst, a rụchara ahụ́ Ụlọ obibi nke B, kụchaakwa ya gbamgbam. Ụlọ obibi nke B bụ ụlọ obibi ikpeazụ a rụrụ. A rụchakwara paseeji niile si n’elu jikọta ụlọ na ụlọ. Ndị na-achọ ala mma malitekwara ịchọ ọtụtụ ala mma.