Gaa n'Isiokwu

Foto Filipinz nke 1 (Febụwarị 2014 Ruo Mee 2015)

Foto Filipinz nke 1 (Febụwarị 2014 Ruo Mee 2015)

Ndịàmà Jehova na-arụ ụlọ ndị ọhụrụ, na-arụzigharịkwa ndị nke ochie n’alaka ụlọ ọrụ ha dị na Kesọn Siti, nke dị́ na Filipinz. Ebe ọ bụ na alaka ụlọ ọrụ ha dị na Japan na-ebiziri Ndịàmà Jehova nọ na Filipinz akwụkwọ, e jizi ebe a na-ebibu akwụkwọ n’alaka ụlọ ọrụ dị́ na Filipinz mere ebe ngalaba ụfọdụ ga-anọ na-arụ ọrụ ha. Ngalaba ndị ahụ bụ Ndị Na-ahụ Maka Kọmputa, Ndị Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ndị Na-ahụ Maka Idozi Ihe, Ndị Na-ezipụ Akwụkwọ, nakwa Ngalaba Nsụgharị. Foto ndị a ị na-ahụ ebe a na-egosi ụfọdụ ọrụ a arụrụ n’ụlọ ebe a na-ebibu akwụkwọ nakwa n’ụlọ ndị ọzọ n’agbata Febụwarị afọ 2014 na Mee afọ 2015. A tụrụ anya ịrụcha ha n’Ọktoba afọ 2016.

Ihe a bụ ụlọ ọhụrụ ndị a ga-arụ na ndị nke a ga-arụzigharị arụzigharị:

  • Ụlọ nke 4 bụ Ụlọ obibi

  • Ụlọ nke 5 bụ maka Ngalaba Na-ahụ Maka Vidio na Ihe Ndị A Na-egere Egere, nakwa Ngalaba Ije Ozi

  • Ụlọ nke 6 bụ maka Ndị Na-achọ Ala Mma, Ndị Na-arụzi Ụgbọala, nakwa Ndị Na-agba Ihe Ọkụ

  • Ụlọ nke 7 bụ maka Ndị Na-ahụ Maka Kọmputa, Ndị Na-ahụ Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ndị Na-ahụ Maka Idozi Ihe, Ndị Na-ezipụ Akwụkwọ, nakwa Ngalaba Nsụgharị

Febụwarị 28, 2014​—Ụlọ nke 7

Ebe ndị ọrụ nwa oge na-etinye ihe na-eme ka ụlọ ghara ịgba ọkụ n’akpa ka mmiri ghara imebi ya. Ha yi ihe ga-eme ka ọ ghara ịna-agbakasị ha ahụ́.

Eprel 2, 2014​—Ụlọ nke 7

Foto a na-egosi ebe ndị ọrụ tinyenyecharala uko n’ụlọ ebe a ga na-etinye ihe n’ígwè maka asụsụ Ndị Ogbi nke Filipinz. Oghere ndị dị n’uko ụlọ a bụ ebe a ga-etinye ihe ga-eme ka ntụoyi na-agazu ebe niile na ya.

Ọktoba 21, 2014​—Kesọn Siti

Mgbe a na-egwu ebe a ga-etinye paịpụ mmiri oyi ga-esi gazuo ebe niile n’alaka ụlọ a.

Disemba 19, 2014​—Mgbe a na-arụ paseeji si n’elu jikọta ụlọ nke 1, nke 5, na nke 7

Paseeji a ga-ejikọta ọtụtụ ụlọ dị́ n’alaka ụlọ ọrụ a, ma Ụlọ nke 1, bụ́ ebe e nwere ọnụ ụlọ a ga-anọ na-eri nri. Ihe karịrị narị mmadụ atọ na-arụ ọrụ n’Ụlọ nke 7 ga-esi na paseeji a na-agafe.

Jenụwarị 15, 2015​—Ụlọ nke 5

Ebe e ji kren na-ebugo gbamgbam ndị e ji akụ ụlọ. Ọ bụ ndị ọrụ ngo ji kren a n’ụdị ya dị iche iche na-ebugo ihe.

Jenụwarị 15, 2015​—Ụlọ nke 5A (Ụlọ a jikọrọ ụlọ ndị ọzọ)

Ụlọ a dị otu narị mita na iri abụọ na ise n’ogologo, nakwa otu narị mita na iri abụọ na ise n’uhie. O nwere ọnụ ụlọ mposi abụọ, nweekwa steepụ na ígwè na-ebugo ihe. Ụlọ mposi na steepụ dị n’ụlọ a mere ka e nwekwuo ohere n’Ụlọ nke 5. Ígwè na-ebugo ihe a rụnyere n’Ụlọ nke 5A kama ịrụnye ya n’Ụlọ nke 5, na-eme ka ụzụ ígwè a na-eme ghara ịbata mgbe a na-ese vidio ma ọ bụ na-etinye ihe ndị a na-egere egere n’ígwè.

Jenụwarị 15, 2015​—Ụlọ nke 5A (Ụlọ a jikọrọ ụlọ ndị ọzọ)

Ebe ndị ọrụ nọ na ndò na-akpa ígwè na-eme ka ụlọ sikwuo ike. A na-enwe oké okpomọkụ n’ọnwa Jenụwarị n’ehihie, na-enwekwa ya n’ọnwa Eprel.

Mach 5, 2015​—Ụlọ nke 5

Mgbe a na-akụ ụlọ osisi tupu a kụọ ya gbamgbam. E ji ihe dị ka narị osisi asatọ siri ezigbo ike kụọ Ụlọ nke 5.

Mach 17, 2015​—Ụlọ nke 5

Ebe ndị ọrụ ji aka na-agwa siment e ji arụ obere ọrụ. Ndị so rụọ ụlọ ndị ahụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ a karịrị otu narị mmadụ. Ha si n’Ọstrelia, Kanada, Frans, Japan, Niu Ziland, Saụt Koria, Spen, Amerịka, nakwa ná mba ndị ọzọ.

Mach 25, 2015​—Ụlọ nke 5

Ebe a na-akụ Ụlọ nke 5 gbamgbam. Ebe a ka Ngalaba Nsụgharị dịbu. A na-arụgharị ya maka Ngalaba Na-ahụ Maka Vidio na Ihe Ndị A Na-egere Egere, nakwa Ngalaba Ije Ozi.

Mee 13, 2015​—Ụlọ nke 5

Mgbe a na-akwọbi ígwè ndị a ga-eji kebichie ọfis dị iche iche.