Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Tiri Iwu Gbasara Otú Nwoke na Nwaanyị Ga-esi Na-akpa Tupu Ha Alụọ?

Ndịàmà Jehova Hà Tiri Iwu Gbasara Otú Nwoke na Nwaanyị Ga-esi Na-akpa Tupu Ha Alụọ?

 Ndịàmà Jehova kweere na iwu na ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere onye ọ bụla aka ịna-eme ihe na-amasị Chineke nakwa ihe ga-abara anyị uru. (Aịzaya 48:17, 18) Ọ bụghị anyị ji aka anyị mee iwu ndị ahụ ma ọ bụ dee ihe ndị ahụ dị́ na Baịbụl, ma anyị na-eme ha. Lee otú ụfọdụ n’ime ha si gbasa nwoke na nwaanyị ịkpa tupu ha alụọ. a

  •   Chineke achọghị ka di na nwunye tisaa. (Matiu 19:6) Ndịàmà Jehova ejighị okwu nwoke na nwaanyị ịkpa egwu egwu n’ihi na ha weere ya na nwoke na nwaanyị kpawa, ọ pụtara na ha chọrọ ịlụ.

  •   Ọ bụ naanị ndị toruru ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịna-akpa. Ndị dị́ otú ahụ agafeela oge Baịbụl kpọrọ “oge ntoju ntorobịa” ma ọ bụ oge agụụ mmekọahụ na-agụsi mmadụ ike.​—1 Ndị Kọrịnt 7:​36.

  •   Onye ya na mmadụ na-akpa kwesịrị ịbụ onye nweere onwe ya ịlụ di ma ọ bụ nwunye. N’anya Chineke, ụfọdụ ndị gbara alụkwaghịm ma ọ bụghị n’ihi na di ha ma ọ bụ nwunye ha kwara iko, ekwesịghị ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye.​—Matiu 19:9.

  •   E nyere Ndị Kraịst chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye iwu ka ha lụọ naanị onye ha na ha kweere otu ihe. (1 Ndị Kọrịnt 7:​39) Ndịàmà Jehova kweere na iwu a anaghị ekwu banyere onye na-anaghị akatọ ihe anyị kweere, kama na ọ bụ onye kweere ihe anyị kweere, bụrụkwa Onyeàmà Jehova e mere baptizim. (2 Ndị Kọrịnt 6:​14) Kemgbe ụwa, Chineke na-agwa ndị na-efe ya ka ha na-alụ naanị ndị ha na ha kweere otu ihe. (Jenesis 24:3; Malakaị 2:​11) Ndị na-eme nchọnchọ n’oge a achọpụtala na iwu a Chineke nyere bara ezigbo uru. b

  •   Ndị na-eto eto kwesịrị ịna-erubere ndị mụrụ ha isi. (Ilu 1:8; Ndị Kọlọsi 3:​20) Iwu a pụtara na ndị na-eto eto ka bi n’ụlọ nne na nna ha kwesịrị irube isi n’ihe nne na nna ha kpebiri gbasara otú ha na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ga-esi na-akpa. Ha nwere ike ikwu afọ ole nwa ha ga-adị tupu ya na mmadụ akpawa nakwa ihe ndị ha nwere ike ime na ihe ndị ha na-ekwesịghị ime.

  •   Onyeàmà Jehova ọ bụla na-eburu ihe Baịbụl kwuru n’obi jiri aka ya kpebie ma ya na mmadụ ọ̀ ga-akpa nakwa onye ya na ya ga-akpa. Ihe a dabara n’ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” (Ndị Galeshia 6:5) Ma, abịa n’ihe gbasara nwoke na nwaanyị ịkpa, ọtụtụ ndị na-agakwuru ụmụnna ndị ma nke a na-akọ, ndị chọkwara ka ihe gaziere ha, ka ha nye ha ndụmọdụ.​—Ilu 1:5.

  •   Ọtụtụ ihe ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye na-eme mgbe ha na-akpa bụ mmehie dị́ oké njọ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl nyere iwu ka anyị zere mmekọahụ rụrụ arụ. Ọ bụghị naanị ịkwa iko ka a na-ekwu okwu ya, kama omume rụrụ arụ ndị na-alụbeghị di na nwunye na-eme, dị ka imetụ ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị aka ma ọ bụ isi n’ọnụ ma ọ bụ n’ikè na-enwe mmekọahụ. (1 Ndị Kọrịnt 6:​9-​11) Ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye igwusadị ibe ha egwuregwu ga-eme ka inwe mmekọahụ gụwa ha agụụ bụ “adịghị ọcha.” Jehova kpọkwara ya asị. (Ndị Galeshia 5:​19-​21) Baịbụl katọkwara iji “okwu rụrụ arụ” akparịta ụka.​—Ndị Kọlọsi 3:8.

  •   Obi mmadụ, ma ọ bụ ihe mmadụ bụ n’ime, dị́ aghụghọ. (Jeremaya 17:9) O nwere ike ime ka mmadụ mee ihe ọ ma na ọ dịghị mma. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ chọrọ ịlụ achọghị ka obi ha ghọgbuo ha, ha agaghị na-anọ naanị ha n’ebe ọnwụnwa nwere ike ịbịara ha. Ha nwere ike ikpebi ihe ndị ga-enyere ha aka izere ọnwụnwa, dị ka ịna-eso ndị ọzọ akpapụ ma ọ bụ ịchọta onye ga na-anọnyere ha. (Ilu 28:26) Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma na isi n’Ịntanet achọ onye ha ga-alụ na-akpata ọtụtụ nsogbu. Otu n’ime nsogbu ahụ bụ mmadụ na onye ọ na-amachaghị ịkpa.​—Abụ Ọma 26:4.

a Nwoke na nwaanyị ịkpa tupu ha alụọ abụghị omenala obodo niile. Baịbụl ekwughị na nwoke na nwaanyị ga-akparịrị tupu ha alụọ, o kwughịkwa na ọ bụ naanị otú e si alụ di na nwunye.

b Dị ka ihe atụ, otu isiokwu dị́ n’akwụkwọ a kpọrọ Marriage & Family Review kwuru na e mere nchọpụta ugboro atọ gbasara ihe na-eme ka di na nwunye na-ebite aka. Nchọpụta ndị ahụ gosiri na ikpe otu okpukpe na ikwere otu ihe so eme ka ndị di na nwunye ghara itisa. Ha na-ebirukwa iri afọ abụọ na ise ruo iri afọ ise, ka na-ebikwa.