Gaa n'Isiokwu

Ònye Malitere Àmà Jehova?

Ònye Malitere Àmà Jehova?

 Ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke oge a malitere n’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga. N’oge ahụ, e nwere mmadụ ole na ole ndị na-ezukọta na-amụ Baịbụl n’obodo Pittsburgh, Pennsylvania, dị n’Amerịka. Aha e ji mara ha bụ Ndị Mmụta Baịbụl. Ha na-eme ha welite otu ihe a na-akụzi na chọọchị, ha achọwa ịma ihe Baịbụl kwuru gbasara ya. Ha mechaa, ha ebipụta ihe ha mụtara na Baịbụl n’akwụkwọ, n’akwụkwọ akụkọ ma ọ bụkwanụ na magazin a na-akpọzi Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova.

 E nwere otu nwoke so ná ndị ahụ ji obi ha niile na-amụ Baịbụl n’oge ahụ. Aha ya bụ Charles Taze Russell. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ nwoke a nọ na-ahazi otú ọrụ ikwusa ozi ọma si na-aga n’oge ahụ, bụrụkwa ya malitere ibipụta Ụlọ Nche, ma ọ bụghị ya malitere ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Mkpa Russell na ndị ọzọ so ná Ndị Mmụta Baịbụl bụ ịkụziri ndị mmadụ ihe Jizọs Kraịst kụziri mgbe ọ bịara n’ụwa na ime ihe ọgbakọ Ndị Kraịst e nwere n’oge ndịozi Jizọs mere. Ebe ọ bụ Jizọs malitere ọgbakọ Ndị Kraịst, ya abụrụkwa ihe ọ kụziri ka Ndịàmà Jehova na-akụzi, ọ bụ ya malitere ọgbakọ Ndịàmà Jehova.—Ndị Kọlọsi 1:18-20.