Gaa n'Isiokwu

Ihe Ga-enyere Ndị Na-arụgbu Onwe Ha n’Ọrụ n’Ụlọ Ọgwụ Aka

Ihe Ga-enyere Ndị Na-arụgbu Onwe Ha n’Ọrụ n’Ụlọ Ọgwụ Aka

 Bryn, bi na Nọt Karolaịna dị n’Amerịka. O so na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ. Ọrụ ndị kọmitii a bụ ịhụ na ndị dọkịta gwọrọ Ndịàmà Jehova n’ejighị ọbara.

 N’ihi ọrịa koronavaịrọs, ọtụtụ ụlọ ọgwụ anaghị ekwe ka ndị mmadụ na-abịa eleta ndị ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ ha. Ọ bụ ya mere Bryn ji kpọọ otu onyeisi na-ahụ maka ndị mmadụ ịbịa leta ndị ahụ́ na-adịghị n’otu ụlọ ọgwụ ka ọ mara otú o nwere ike isi nyere Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ aka.

 Onye zara Bryn n’ekwentị bụ onye na-enyere onyeisi ahụ aka. Bryn ma na a naghị ekwe ka ndị mmadụ bịa leta ndị nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ, n’ihi ya, ọ rịọrọ nwoke ahụ ma ò nwere ike inyetụ Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ nọmba fon ya ka ha na ya kwuo. Nwoke ahụ kwetara.

 Bryn chekwara ihe o nwere ike ime iji nyere ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ aka. Ọ gwara nwoke ahụ na obi dị ya ụtọ maka otú ha si na-elekọta ndị nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ, jụọkwa ya ma ahụ́ ọ̀ dịkwa ndị niile na-arụ ebe ahụ. Ọ gwakwara nwoke ahụ na ya agụọla gbasara otú ndị mmadụ nakwa karịchaa ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ si na-arụgbu onwe ha n’ọrụ n’oge a e nwere ọrịa koronavaịrọs.

 Nwoke ahụ na-enyere onyeisi ahụ aka kwetara na ọrịa koronavaịrọs emeela ka ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ.

 Bryn gwaziri ya, sị: “E nwere ihe ndị dị n’adres Ịntanet anyị ga-abara ndị na-arụgbu onwe ha n’ọrụ uru. Ọ bụrụ na ị gaa na jw.org denye ‘ọrụ’ n’ebe a na-achọ ihe na ya, ị ga-ahụ ọmarịcha isiokwu ndị ga-enyere ndị ọrụ unu aka.”

 Ka ha ka nọ na-ekwu okwu, nwoke ahụ chọwara isiokwu ahụ n’adres Ịntanet anyị, ọ hụrụ isiokwu kwuru gbasara ‘ọrụ.’ O ji obi ụtọ kwuo, sị; “Ehee!, m ga-egosi onyeisi anyị isiokwu a. Isiokwu a ga-abara ma ndị ọrụ anyị ma ndị ọzọ ezigbo uru. M ga-ebipụta ya kee ndị ọrụ anyị.”

 Mgbe izu ole na ole gachara, Bryn na onyeisi ụlọ ọgwụ ahụ kwuru, ya agwa Bryn na ha ebipụtala isiokwu ahụ na isiokwu ndị ọzọ yiri ya. Ha kekwara ya ndị nọọsụ na ndị ọzọ na-arụ n’ụlọ ọgwụ ahụ.

 Bryn kwuru, sị: “Onyeisi ahụ kelere m maka ọrụ anyị na-arụ, kwuokwa na isiokwu ndị ahụ dị mma, nakwa na ha baara ha ezigbo uru.”