Gaa n'Isiokwu

Ha Ji Telefon Ọhaneze Amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl

Ha Ji Telefon Ọhaneze Amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl

 Daiane bụ Onyeàmà Jehova bi na Brazil, bụrụkwa onye na-ezisa ozi ọma oge niile. Otu ụbọchị, ka o ji telefon na-ezi ozi ọma, ya na di na nwunye na-akatabeghị ahụ kwuru. Ha nwekwara mmasị. Ha gwara Daiane na ha ga-akwaga n‘otu ime ime obodo ebe a na-enweghị ọkụ eletrik na Ịntanet. E nweghịkwa Onyeàmà Jehova ọ bụla bi ebe ahụ. Di na nwunye ahụ nyeziri Daiane akara telefon ọhaneze nke dị n’obodo ahụ. Ha na Daiane kwekọrịtakwara ụbọchị na oge ọ ga na-akpọ ha ka ha na-amụ Baịbụl.

 Mgbe oge ha kwuru ruru, Daiane kpọrọ telefon ọhaneze ahụ, di na nwunye ahụ aza ya. Ha ji telefon ahụ mụọ Baịbụl ugboro atọ ọzọ n’ime izu abụọ sochirinụ.

 Ma, mgbe ha kwuchara ugboro abụọ ahụ, di na nwunye ahụ azaghịzi telefon ahụ ọzọ. N’agbanyeghị ya, Daiane adaghị mbà, ọ ka na-akpọ telefon ọhaneze ahụ ugboro atọ n’izu. Ọ na-ezikwa onye ọ bụla zara ya ozi ọma. Ihe a mere ka Daiane malite ịmụrụ ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ Baịbụl.

 Otu ụbọchị, mgbe Daiane na di ya ji telefon ọhaneze ahụ na-amụrụ otu nwa okorobịa Baịbụl, otu onyeisi chọọchị dị n’obodo ahụ nụpeere ihe ha na-ekwu. Ọ gaziri onye ahụ a na-amụrụ ihe nso ka o nwee ike ịnụ ihe ha na-ekwu nke ọma. Mgbe e mechara, onyeisi chọọchị ahụ kwuru na ya chọrọ ka ya na Daiane na di ya kwuo. Ihe ndị ọ nụrụ tọrọ ya ezigbo ụtọ nke na ọ chọrọ ka a mụwara ya Baịbụl.

 Ka oge na-aga, Daiane na di ya si na telefon ọhaneze ahụ na-amụrụ onyeisi chọọchị ahụ na mmadụ ise ọzọ Baịbụl n’obodo ahụ dịpụrụ adịpụ. Mmadụ abụọ n’ime ha esikwala na telefon ọhaneze ahụ gere ọmụmụ ihe ọgbakọ. Otu onye n’ime ha rụdịrị bench ndị ahụ a na-amụrụ Baịbụl ga na-anọ ma ha bịa ịmụ ihe.

 Obi dị Daiane na di ya ezigbo ụtọ maka ihe ọma Jehova meere ha kwe ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze ya, nke mere ka ha nwee ike izi ndị bi n’obodo ahụ dịpụrụ adịpụ ozi ọma. Daiane kwuru, sị: “Jehova ga-emeli ka onye ọ bụla nụ ozi ọma, ọ bụrụgodị na onye ahụ bi n’ebe dịpụrụ adịpụ.”