Gaa n'Isiokwu

Ọ Bụ A Kwaa A Kwụrụ n’Agbanyeghị Ọrịa Ọjọọ Bịara Ya

Ọ Bụ A Kwaa A Kwụrụ n’Agbanyeghị Ọrịa Ọjọọ Bịara Ya

 Virginia, otu nwaanyị bụ́ Onyeàmà Jehova, na-arịa otu ọrịa ọjọọ nke na-eme ka ahụ́ mmadụ kpọnwụọ. Ọrịa a mekwara ka ahụ́ ya niile kpọnwụọ. Ọ na-ahụ ụzọ na-anụkwa ihe, ọ na-emepeli ma na-emechi anya ya, na-emegharịkwa isi ya ntakịrị. Ọ naghị ekwuli okwu ma ọ bụ rie nri. Nwanna nwaanyị a nwere mgbe ahụ́ dị ya mma, ya agbasiekwa ike. Ma otu ụbọchị n’afọ 1997, otu akụkụ n’azụ isi ya bịara na-egbu ya ezigbo mgbu, na-adị ya ka e nwere onye na-akụ ya ihe n’isi. Di ya kpọgara ya ụlọ ọgwụ, ọ bụkwa ná mgbede ụbọchị ahụ ka ọ tụbọrọ n’amaghịzi ebe ọ nọ. O tetara mgbe izu abụọ gachara. Ebe ọ nọ bụ n’ebe a na-elekọta ndị ọrịa ha siri ezigbo ike, ma ahụ́ ya akpọnwụọla, e tinyekwaara ya ihe ga-enyere ya aka iku ume. Ọ nọrọ abalị ole na ole n’amaghị ebe ọ nọ, ọ naghịdị echeta ihe ọ bụla, ma ọ bụdị onye ọ bụ.

 Nwanna nwaanyị Virginia kọrọ ihe mechaziri mee. “Eji m nwayọọ nwayọọ bido chetawa ihe. Anọ m na-ekpesi ekpere ike. Achọghị m ịnwụ hapụ nwa m nwoke ka dị obere ka ọ ghọọ nwa na-enweghị nne. Ihe m mere ka o nyere m aka ka obi na-esi m ike bụ ịna-echeta amaokwu Baịbụl dị iche iche m nwere ike icheta.

 “Ka e mechara, ndị dọkịta kpọpụtara m n’ebe ahụ a na-elekọta ndị ọrịa ha siri ezigbo ike. Mgbe m nọrọ ọnwa isii n’ụlọ ọgwụ dị iche iche nakwa n’ebe a nọ gbalịa ime ka akụkụ ahụ́ m ndị kpọnwụrụ akpọnwụ dịghachi mma, a gwara m ka m laa. Ahụ́ m niile ka kpọnwụrụ akpọnwụ, ọ bụkwa ndị ọzọ na-emere m ihe niile. Nke ahụ mere ka ike ụwa gwụ m! Ọ bịara dị m ka o nweghị uru m baara ndị ọzọ ma ọ bụdị Jehova. Ihe ọzọkwa nọ na-echu m ụra bụ otú m ga-esi elekọta nwa m nwoke.

 “E bidoziri m ịgụ akụkọ ụmụnna ndị rịatụrụla ọrịa ndị yiri nke a m na-arịa. Otú ha si jeere Jehova ozi n’agbanyeghị nsogbu ha tụkwara m n’anya. Nke a mere ka m kwụsị ichegbu onwe m gbasara nsogbu nke m kama lekwasịwazie anya n’ihe ndị m ga-emeli. Tupu m rịawa ọrịa, anaghị m enwecha ohere eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke. Ma ugbu a enweziri m ohere ụbọchị niile. N’ihi ya, kama ịnọ na-echegbu onwe m, ebidoro m ime ihe ndị ga-enyere m aka ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma.

 “Amụtara m otú e si eji kọmputa eme ihe dị iche iche. M na-eji otu ihe dị na kọmputa nke na-ahụ otú m si emegharị isi m ede ihe. Ime ihe a na-agwụ ike, ma ụdị nkà na ụzụ a na-enyere m aka ịna-enwe ọmụmụ Baịbụl nke onwe m nakwa iji akwụkwọ ozi na kọmputa na-ezi ndị ọzọ ozi ọma. Otú mụ na ndị nọ m nso si akparịta ụka bụ iji bọọdụ e dere mkpụrụ akwụkwọ na ya. Onye ahụ mụ na ya nọ ga-atụ aka ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ahụ otu otu. Ọ bụrụ na onye ahụ atụọ aka na nke m na-achọghị, mụ emepesịa anya m ike; ma ọ bụrụ na ọ tụọ aka na nke m chọrọ mụ emechie anya m. Anyị na-emegide ihe a ruo mgbe m sụpere okwu ma ọ bụ ahịrịokwu m chọrọ ikwu. Ụfọdụ ụmụnna nwaanyị ndị mụ na ha na-anọkarị aghọọla aka ochie n’ịghọta ihe m chọrọ ikwu. Ma, e nwee mgbe ha na-ekwuteghị ya, anyị ejiri ya mere ihe ọchị.

Ebe m si na bọọdụ e dere mkpụrụ akwụkwọ na-agwa otu nwanna nwaanyị ihe m chọrọ

 “Isonye n’ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ na-atọgbu m atọgbu. Ana m ahụ na m sonyere n’ọmụmụ ihe niile, ugbu a m na-eji Zoom ma ọ bụ ihe yiri ya na-esonye n’ọmụmụ ihe. Ana m ede ihe m chọrọ ịza, onye ọzọ enyere m aka gụpụta ya. E nwekwara ụmụnna ndị mụ na ha na-eso ekiri Ihe Omume Tiivi anyị a a na-eme kwa ọnwa.

 “Arịala m ọrịa a afọ iri abụọ na atọ ugbu a. Mgbe ụfọdụ, obi na-ajọ m njọ. Ma ekpere na-enyere m aka n’oge ndị ahụ. Ihe ndị ọzọ na-enyere m aka bụ mkpakọrịta mụ na ụmụnna, nakwa ịna-eme ike m niile n’ozi Jehova. Ndị ọgbakọ anyị enyerela m aka mụ enwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ruo afọ isii ugbu a. Agbalịkwara m ka nwa m nwoke bụ́ Alessandro mụta ọtụtụ ihe dị mma n’aka m. Ọ lụọla nwaanyị ugbu a, ọ bụkwa okenye ọgbakọ. Ya na nwunye ya bụkwa ndị ọsụ ụzọ oge niile.

 “Ọtụtụ mgbe, m na-eche gbasara ihe ndị m ga-enwe ike ime mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Ihe mbụ m ga-achọ ime bụ iji ọnụ m gwa ndị ọzọ gbasara Jehova. M ga-achọ ịga ije n’ebe e nwere osimiri na ọhịa nwere osisi dị iche iche ka m nwee ike kirie ihe ndị mara mma ndị Jehova kere. Ebe ọ bụkwa na ihe m na-eri kemgbe ihe karịrị iri afọ abụọ ugbu a bụ ihe dị mmiri mmiri, ana m atụ anya mgbe m ga-enwe ike ịghọrọ apụl taa n’onwe m. Ebe m bụ onye Ịtali, ana m atụkwa anya mgbe m ga na-esi ma na-eri nri obodo anyị ndị na-akasị amasị m, ma nke a na-akpọ pizza!

 “Ọ bụ ‘olileanya nzọpụta’ na-enyere m aka ka m ghara ịna-echegbu onwe m. (1 Ndị Tesalonaịka 5:8) Ịnọ na-ahụ onwe m n’ime ụwa ọhụrụ na-enye m obi ụtọ n’agbanyeghị ọrịa m. Amakwa m na n’oge na-adịghị anya nsogbu niile ga-akwụsị. N’eziokwu, ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ mgbe m ga-enwe ike ijidesi ‘ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ’ aka ike. Nke bụ́ ndụ Jehova kwere nkwa inye anyị n’Alaeze ya.”​—1 Timoti 6:19; Matiu 6:​9, 10.

a E nwere ike inweta Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova na jw.org.