Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị GA-AGHỌTALI IHE BAỊBỤL NA-EKWU

Olee Ihe Mere I Kwesịrị Iji Chọọ Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu?

Olee Ihe Mere I Kwesịrị Iji Chọọ Ịghọta Ihe Baịbụl Na-ekwu?

Otu nwaanyị Chaịna aha ya bụ Lin kwuru, sị: “Baịbụl bụ akwụkwọ okpukpe a ma ama. Ma ndị Chaịna amaghị akwụkwọ a, ọ dịghịkwa ha mkpa.”

Otu nwoke India aha ya bụ Amit kwuru, sị: “Anaghịdị m aghọta akwụkwọ ndị dị́ nsọ ndị okpukpe anyị, bụ́ Hindu, na-eji akụziri anyị ihe. Oleezi otú m ga-esi aghọta Baịbụl Nsọ?”

Otu nwaanyị Japan aha ya bụ Yumiko kwuru na ya ma na o teela Baịbụl dịwara, nakwa na ya nụrụ na ọ bụ akwụkwọ ndị mmadụ kacha nwee, ma, na ya ahụtụbeghị Baịbụl mbụ.

Ọtụtụ ndị nọ́ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-ekwu okwu ọma gbasara Baịbụl. Ma, o nwere ike ha amachaghị ihe dị́ na Baịbụl. Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ nde mmadụ bí n’Eshia nakwa ndị bí n’ebe ọtụtụ ndị nwere Baịbụl.

Ma, i nwere ike ịna-ajụ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ga-eji chọwa ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu?’ Ọ bụrụ na ị ghọta ihe dị́ n’akwụkwọ a dị́ nsọ, ọ ga-enyere gị aka:

  • Ịna-enwe obi ụtọ

  • Idozi nsogbu ezinụlọ

  • Ịkwụsị ịna-echegbu onwe gị

  • Ime ka gị na ndị ọzọ na-adị ná mma

  • Iji ego gị eme ihe bara uru

Ka anyị lebagodị anya n’otú Baịbụl si nyere otu nwaanyị Japan aka. Aha nwaanyị ahụ bụ Yoshiko. Ọ na echekarị ihe ọ ga-abụ ya ka Baịbụl na-ekwu. O mechara kpebie ịgụ Baịbụl ka ọ mata ihe dị́ na ya. Gịnị meziri? O kwuru, sị: “Ihe m gụtara na Baịbụl emeela ka ndụ m nwee isi. O meekwala ka m nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu.” O kwukwara, sị: “Anaghịzi m eche na ndụ m abaghị uru.” Amit, bụ́ nwoke ahụ anyị dere ihe o kwuru ná mbido isiokwu a, kpebikwara ịmụ Baịbụl n’onwe ya. O kwuru, sị: “Ihe m gụtara tụrụ m n’anya. Ihe e dere na Baịbụl ga-abara onye ọ bụla uru.”

Baịbụl abaarala ọtụtụ nde mmadụ uru. Ọ́ gaghị adị mma ma ị mụọ Baịbụl n’onwe gị, ka ị hụ otú ọ ga-esi baara gị uru?