Gaa n'Isiokwu

Baịbụl na Sayensị Hà Na-ekwu Otu Ihe?

Baịbụl na Sayensị Hà Na-ekwu Otu Ihe?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee. Ha na-ekwu otu ihe. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ sayensị, ihe ọ bụla o kwuru gbasara sayensị na-adaba n’ihe ndị sayensị chọpụtara. Legodị ihe ụfọdụ gosiri na sayensị na Baịbụl na-ekwu otu ihe nakwa na ihe Baịbụl kwuru dị ezigbote iche n’ihe ọtụtụ ndị kweere n’oge a na-ede Baịbụl.

  •   Eluigwe na ụwa nwere oge ha malitere ịdị. (Jenesis 1:1) Ma, ihe a na-akọ n’ọtụtụ akụkọ ifo ndị oge ochie bụ na eluigwe na ụwa nọkatara dịrị, ọ bụghị na e kere ha eke. Ndị Babịlọn kweere na chi ndị mere ka eluigwe na ụwa dịrị si n’oké osimiri abụọ. A na-akọkwa n’akụkọ ifo ndị ọzọ na eluigwe na ụwa si n’otu nnukwu àkwá pụta.

  •   Ọ bụ Chineke nyere iwu ndị na-achị ihe ndị dị n’eluigwe nakwa n’ụwa, ọ bụghị chi ọzọ dị iche iche. (Job 38:33; Jeremaya 33:25) Ma, ihe a na-akọ n’ebe niile n’ụwa bụ na ihe niile gbasara ụmụ mmadụ dị chi dị iche iche n’aka nakwa na chi ndị a na-emesi ha ike mgbe ụfọdụ.

  •   Ọ dịghị ihe e kokwasịrị ụwa na ya. (Job 26:7) Ọtụtụ ndị oge ochie kweere na ụwa dị larịị nakwa na e nwere otu nnukwu anụmanụ bu ya. Anụmanụ a nwere ike ịbụ atụ ma ọ bụkwanụ mbe mmiri.

  •   Anwụ na-amịrị mmiri si n’oké osimiri nakwa n’ebe ndị ọzọ gaa n’ígwé. E mechaakwa mmiri ahụ dị n’ígwé ezoo. Ya zowe, o nwere ike ịbụ snoo ma ọ bụ akụ́ mmiri ígwé ma ọ bụkwanụ mmiri ozuzo nkịtị ma sọbazie n’osimiri nakwa n’iyi dị iche iche. (Job 36:27, 28; Ekliziastis 1:7; Aịzaya 55:10; Emọs 9:6) Ndị Grik oge ochie chere na mmiri dị n’osimiri si n’oké osimiri dị n’ime ala. Ihe a ka ndị mmadụ nọ na-eche ruo n’ihe dị ka narị afọ atọ gara aga.

  •   Ugwu nwere ike ịdị taa, echi ọ gaghịzi adị. Mmiri tochibukwara ugwu ndị e nwere taa. (Abụ Ọma 104:6, 8) Ma, ihe a na-akọ n’ọtụtụ akụkọ ifo bụ na ọ bụ chi dị iche iche kere ugwu ha adịrị otú ha dị taa.

  •   Ịdị ọcha na-eme ka ahụ́ dị mmadụ mma. Ụfọdụ n’ime iwu ndị e nyere ụmụ Izrel bụ gbasara ihe ndị ha ga-asa ma ha metụ ozu aka, ịkpọpụ ndị bu ọrịa na-efe efe iche ruo mgbe ha gbakere, nakwa ikpochi nsị mmadụ nyụrụ ájá. (Levitikọs 11:28; 13:1-5; Diuterọnọmi 23:13) Ma n’oge e nyere ndị Izrel iwu ndị ahụ, ndị Ijipt na-eme ihe dị iche. Ọ na-abụ onye merụọ ahụ́, ha agwakọta nsị mmadụ na ihe ndị ọzọ tee n’ebe onye ahụ merụrụ ahụ́.

È nwere ihe Baịbụl kwuru na-adabaghị n’ihe ndị sayensị chọpụtara?

 Anyị leruo ihe Baịbụl kwuru anya, anyị ga-achọpụta na e nweghị. Ugbu a, ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru ụfọdụ ndị chere na ha adabaghị n’ihe ndị sayensị chọpụtara:

 Ụgha: Baịbụl kwuru na Chineke ji ụbọchị isii nkịtị kee eluigwe na ụwa.

 Eziokwu: Baịbụl kwuru na Chineke kere eluigwe na ụwa ná mmalite. O nweghị oge ọ kpọrọ aha. (Jenesis 1:1) Ihe ọzọkwa bụ na mgbe Jenesis isi mbụ kwuru gbasara ụbọchị dị iche iche e kere ihe, o kwughị awa ole ụbọchị ndị ahụ bụ. Baịbụl kwudịrị na oge niile o were iji kee ma eluigwe ma ụwa bụ otu ‘ụbọchị.’—Jenesis 2:4.

 Ụgha: Baịbụl kwuru na e bu ụzọ kee ahịhịa na osisi dị iche iche. Mgbe e kechara ha, e keziri anyanwụ ka o nwee ike na-enyere ha aka ịna-eme nke ọma.—Jenesis 1:11, 16.

 Eziokwu: Baịbụl kwuru na e bu ụzọ kee anyanwụ, nke bụ́ otu n’ime kpakpando ndị dị ‘n’eluigwe,’ tupu e kee ahịhịa na osisi dị iche iche. (Jenesis 1:1) Ìhè anyanwụ rutere n’ụwa ‘n’ụbọchị’ nke mbụ, ya bụ, n’oge na-abụghị ụbọchị nkịtị e kere ihe. Ka ọ na-erule ‘n’ụbọchị’ nke atọ, mbara ígwé agbachapụla, ìhè anyanwụ maliteziri inyere ahịhịa na osisi aka ịna-eme nke ọma. (Jenesis 1:3-5, 12, 13) Ọ bụzi ka oge na-aga ka anyanwụ pụtara otú onye nọ n’ụwa nweziri ike ịna-ahụ ya nke ọma.—Jenesis 1:16.

 Ụgha: Baịbụl kwuru na anyanwụ na-agba ụwa gburugburu.

 Eziokwu: Ekliziastis 1:5 sịrị: “Anyanwụ na-awa, anyanwụ na-adakwa;Ọ na-emekwa ngwa ngwa laghachi n’ebe o si awa.” Mana, ihe ebe a na-ekwu bụ ihe ọ dị onye nọ n’ụwa ka anyanwụ ọ̀ na-eme. Taakwa, ndị mmadụ ka na-ekwu na anyanwụ na-awa ma ọ bụkwanụ na ọ na-ada, n’agbanyeghị na ha ma na ọ bụ ụwa na-agba anyanwụ gburugburu.

 Ụgha: Baịbụl kwuru na ụwa dị larịị.

 Eziokwu: “N’ebe ụwa sọtụrụ” e kwuru gbasara ya na Baịbụl apụtaghị na ụwa dị mbadamba ma nwee ebe o jedebere. (Ihe e dere n’ala ala peeji Ọrụ Ndịozi 1:8). Kama, ọ pụtara ‘ebe kacha anya n’ụwa’ ma ọ bụ ụwa niile.—Aịzaya 11:12; Luk 13:29.