Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Ọ Bịara Doo M Anya na Jehova Na-eme Ebere Ma Na-agbaghara Mmehie

Ọ Bịara Doo M Anya na Jehova Na-eme Ebere Ma Na-agbaghara Mmehie
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1954

  • ABỤ M ONYE: KANADA

  • NDỤ M BIRI: ANA M EGWUBU WAYO, NA-AGBAKWA CHAA CHAA

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

Etoro m n’obodo Mọntrịyọl. Ọtụtụ ndị nọ ná mpaghara m bi n’obodo a anaghị enwe obi ụtọ. Papa m nwụrụ mgbe m dị ọnwa isii. Ọ bụ mụnwa bụ nke ikpeazụ n’ime ụmụ asatọ papa m na mama m mụrụ. Ọnwụ papa m meziri ka ọ bụrụ mama m na-egboro anyị mkpa anyị niile.

Mgbe m na-etolite, ihe e ji mara m bụ ịṅụ ọgwụ ike, ịgba chaa chaa, ịlụ ọgụ, na iso ndị ohi na-akpa. Mgbe m dị afọ iri, m bidoro ịgara ndị akwụna na ndị omempụ na-agbazinye ndị mmadụ ego ozi. M na-aghakarị ụgha, ọ na-atọkwa m ụtọ ịghọgbu ndị mmadụ. Ihe ndị a m na-eme riri m ahụ́ ka onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ́.

Mgbe m na-erula afọ iri na anọ, abụzi m aka ochie n’ịmata otú m ga-esi na-aghọgbu ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, m na-azụ ọtụtụ elekere a na-agba n’aka, ọla aka, na iyeri ntị e ji ọlaedo machie elu ha. M na-abịazi were ihe e ji ede aha n’ọla dee na ọ bụ ọlaedo ka e ji mee ihe ndị ahụ. M na-eburuzi ha gaa ree n’okporo ámá nakwa n’ime ahịa. Otú ego si abata m aka mgbe ahụ na-atọ m ezigbo ụtọ. O nwedịrị otu ụbọchị m rechara ahịa rite puku dọla iri n’uru (ya bụ, ihe dị ka ₦1,580,600).

E mechara kpọga m n’ebe a na-enyere ụmụaka na-eme mpụ aka. Ma, mgbe m dị afọ iri na ise, a chụpụrụ m n’ebe ahụ, o nweghịzi ebe m nwere m ga-ebi. M na-ehizi n’okporo ámá, n’ebe a na-adọsa ụgbọala, na n’ụlọ ndị enyi m.

Ndị uwe ojii na-anwụchikarị m mgbe ọ bụla maka igwu ndị mmadụ wayo. Ma, o nweghị mgbe a tụrụ m mkpọrọ n’ihi na ihe ndị ahụ m na-ere abụghị ihe ndị m zuru ezu. Ma ọtụtụ oge, m kwụrụ nnukwute ụgwọ maka wayo m gwuru, na maka iduhie ndị mmadụ, nakwa maka ire ahịa n’anataghị ikike. M na-agachadị anatara ndị omempụ na-agbazinye ndị mmadụ ego ego e ji ha n’ụgwọ. Ihe a m na-eme nwere ike ịta isi m. Ma, o nweghị onye m na-atụ ụjọ. M na-ejikwa égbè mgbe ụfọdụ. O nwekwara oge ụfọdụ m na-eso ndị omempụ aga akpa arụ.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Mgbe mbụ m nụrụ gbasara Baịbụl bụ mgbe m dị afọ iri na asaa. Mụ na otu enyi m nwaanyị bi mgbe ahụ. Ya na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ma, obi adịghị mụ mma na o nwere omume ndị Baịbụl kwuru na ha adịghị mma. N’ihi ya, m hapụrụ enyi m nwaanyị a gakwuru nwaanyị ọzọ mụ na ya na-akpa.

Ma, enyi m nwaanyị nke abụọ a bidokwara soro Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Ọtụtụ ihe gbanwere ná ndụ ya. Ọ bịara na-adịkwu nwayọọ, na-enwekwukwa ndidi. Ihe a niile tọrọ m ụtọ, mụ agbanwee obi m. Otu ụbọchị, ekwetara m gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze Ndịàmà Jehova. Mgbe m rutere, ha nabatara m nke ọma. Ha niile jiri ejiji dị mma. Ha dị nnọọ iche ná ndị mụ na ha na-akpabu. Ndị ezinụlọ m egositụbeghị m na ha hụrụ m n’anya, e nweghịkwa onye gosiri m na ya hụrụ m n’anya n’oge niile m bụ nwata. Otú Ndịàmà Jehova si gosi m na ha hụrụ m n’anya bụ ihe na-agụ m agụụ kemgbe. Mgbe Ndịàmà Jehova gwara m ka mụ na ha mụwa Baịbụl, m kwetara ozugbo.

Ihe ndị m na-amụta na Baịbụl zọrọ mụ ndụ. Mụ na ndị enyi m nwoke abụọ na-akpabu nkata ịga ohi iji nweta ego m ga-eji akwụ ụgwọ m ji ndị mụ na ha gbakọrọ chaa chaa. M ji ha ihe karịrị puku dọla iri ise (ya bụ, ihe dị ka ₦7,875,500). Ma, obi dị m ụtọ na esoghịzi m ha gaa ohi ahụ. Ha abụọ gawaziri naanị ha. Ndị uwe ojii jidere otu n’ime ha ma gbagbuo onye nke ọzọ.

Ka mụ na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, m bịara mata na e nwere ọtụtụ omume ọjọọ m na-eme m kwesịrị ịkwụsị. Dị ka ihe atụ, 1 Ndị Kọrịnt 6:10 kwuru, sị: “Ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa alaeze Chineke.” Mgbe m gụrụ amaokwu Baịbụl a, anya mmiri gbawara m n’ihi na ọ bụ ihe ndị ahụ ka m na-eme. Ọ bịara doo m anya na m kwesịrị ịgbanwe ndụ m kpamkpam. (Ndị Rom 12:2) Ana m eme ihe ike, na-ewe iwe ọkụ, ụgha anaghịkwa akọ m ụkọ n’ọnụ.

Ma, amụtakwara m na Jehova dị obi ebere, na-agbagharakwa mmehie. (Aịzaya 1:18) Ekpesiri m ekpere ike na-arịọ Jehova ka o nyere m aka ka m hapụ ndụ ọjọọ ahụ m na-ebi. Jehova nyeere m aka mụ ejiri nwayọọ nwayọọ kwụsị ihe ọjọọ ndị ahụ m na-eme. Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ m mere bụ ịlụ enyi m nwaanyị ahụ otú iwu kwuru.

Ọ bụ n’ihi na m mụrụ Baịbụl, meekwa ihe ndị m mụtara mere m ka ji dịrị ndụ taa

Adị m afọ iri abụọ na anọ mgbe ahụ, anyị jikwa ụmụ atọ. Ihe bụ́zi mkpa m ugbu a bụ ịchọta ezigbo ọrụ m ga na-arụ. Ma, agachaghị m akwụkwọ, o nweghịkwa ụlọ ọrụ nyerela m akwụkwọ m nwere ike iji nweta ọrụ. Mgbe m rịọsichara Jehova arịrịọ ike ka o nyere m aka, m gawaziri ịchọ ọrụ. M gwara ndị nwere ike iwe m n’ọrụ na m chọrọ ịgbanwe ndụ m ma bido rụwa ezigbo ọrụ. Mgbe ụfọdụ, m na-akọwara ha na m na-amụ Baịbụl, nakwa na m chọrọ ịbụ ezigbo mmadụ ga na-abara obodo uru. Ọtụtụ ndị ekweghị ewe m n’ọrụ. Ma n’ikpeazụ, enwetara m onye were m n’ọrụ. Mgbe m kọchaara ya ụwa m, o kwuru, sị: “Obi m na-agwa m wee gị n’ọrụ, ma amaghị m ihe mere o ji na-agwa m wee gị.” Ọ bịara doo m anya na Jehova azala ekpere m. Mụ na nwunye m mechara mee baptizim ma ghọọ Ndịàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERE:

Ọ bụ n’ihi na m mụrụ Baịbụl, meekwa ihe ndị m mụtara mere m ka ji dịrị ndụ taa. Mụ na ezinụlọ m bụzi ndị e ji ama atụ. Obi na-eruzi m ala ugbu a, n’ihi na m ma na Jehova agbagharala m.

Kemgbe afọ iri na anọ gara aga, m na-ekwusa ozi ọma oge niile, na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta Baịbụl. Na nso nso a, nwunye m amalitekwala ịna-ekwusa ozi ọma oge niile. Kemgbe af iri atọ ugbu a, enyerela m mmadụ iri abụọ na abụọ mụ na ha na-arụ ọrụ aka ha ebido fewe Jehova. M ka na-aga n’ebe a na-ere ahịa, ma ọ bụghịzi ịga gwuo ndị mmadụ wayo, kama ọ bụ ịga kọọrọ ha ihe ndị m mụtarala na Baịbụl. M na-akọrọ ha banyere ụwa ọhụrụ nke ndị aghụghọ na-agaghị anọ na ya.—Abụ Ọma 37:10, 11.