Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Olee ihe di na nwunye ga-eme ka ha na-ebi n’udo?

Ihe niile Baịbụl kwuru gbasara otú di na nwunye ga-esi na-ebi n’udo ga-abara di na nwunye uru n’ihi na ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ Onye malitere alụmdi na nwunye, kwuru ihe ndị ahụ. Baịbụl na-akụziri di na nwunye àgwà ndị nwere ike ime ka ha na-ebi n’udo, na-akụzikwara ha àgwà ndị ha na-ekwesịghị ịkpa bụ́ ndị nwere ike ime ka ha ghara ibi n’udo. Ọ na-akụzikwara ndị di na nwunye otú ha ga-esi na-ekwurịta okwu ka ha na-enwekwu obi ụtọ n’ezinụlọ ha.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:8-10, 12-14.

Ndị bụ́ di na nwunye kwesịrị ịna-akwanyere ibe ha ùgwù. Ha ga na-ebi n’udo ma ọ bụrụ na onye nke ọ bụla n’ime ha ana-arụ ọrụ Chineke nyere ya.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:18, 19.

Olee ihe di na nwunye ga-eme ka ha ghara ịhapụ ibe ha?

Ọ bụrụ na di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya, ha agaghị ahapụ ibe ha. Chineke na-akụziri anyị otú anyị ga-esi hụ ndị ọzọ n’anya. Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, gosikwara anyị otú anyị ga-esi na-eme ya eme.—Gụọ 1 Jọn 4:7, 8, 19.

Ọ bụrụ na di na nwunye aghọta na alụmdi na nwunye si n’aka Chineke ma jiri ya kpọrọ ihe, ha agaghị ahapụ ibe ha. Mgbe Chineke malitere alụmdi na nwunye, ọ chọrọ ka a ghara inwe mgbe di na nwunye ga-ahapụ ibe ha. Di na nwunye nwere ike ibi n’enweghị onye ga-ahapụ ibe ya n’ihi na Chineke kere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị otú ha ga-enwe ike ịna-egboro ibe ha mkpa ha. O kekwara ha n’onyinyo ya, ka ha nwee ike ịna-ahụ ibe ha n’anya.—Gụọ Jenesis 1:27; 2:18, 24.