Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọpụtara nke gosiri na imeri Jeriko eweghị oge?

Jọshụa 6:10-15, 20 kwuru na ndị agha Izrel gara Jeriko gburugburu otu ugboro n’ụbọchị ruo ụbọchị isii. N’ụbọchị nke asaa, ha gara ya gburugburu ugboro asaa. Mgbe ahụ ka Chineke mere ka mgbidi Jeriko a rụsiri ike daa, ụmụ Izrel abanye Jeriko, merie ya. È nweela ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọtarala nke gosiri na imeri Jeriko eweghị oge otú ahụ Baịbụl kwuru?

N’oge ochie, ọ na-abụ ndị agha bịa ịlụso obodo ọ bụla agha, ha eburu ụzọ nọchibido ya. Ọ bụrụ na ha anọchibido ya ruo ogologo oge, ndị obodo ahụ ga na-eri nri ndị ha chekwara. Ndị agha ahụ mechaa merie obodo ahụ, ha na-akwakọrọ ihe ọ bụla ha hụrụ, ma nri ndị fọrọnụ. N’ihi ya, ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie na-ahụ n’obodo ndị e si otú ahụ bibie na Palestaịn bụ naanị obere nri. Mgbe ụfọdụ, ha anaghịdị ahụ nke ọ bụla. Ma, ihe ha hụrụ na Jeriko oge ochie adịghị otú ahụ. Otu akwụkwọ nke kwuru banyere ihe ndị mgbe ochie sịrị: “E wezụga ite ájá, ihe a kacha hụ ebe ahụ bụ ọka.” O kwukwara na a naghị ahụkarị nri há otú ahụ n’ebe ndị ọzọ.

Baịbụl kwuru ihe mere ndị Izrel ebukọrọghị nri ndị Jeriko. Jehova gwara ha ka ha ghara iwere ihe ọ bụla. (Jọsh. 6:17, 18) Baịbụl kwukwara na mgbe ndị Izrel gara ịlụso Jeriko agha, ọ dịbeghị anya e wechara ihe ubi. N’ihi ya, ọka ha nwere ka buru ibu. (Jọsh. 3:15-17; 5:10) Ọka buru ibu a hụrụ na Jeriko gosiri na ndị Izrel anọchibidoghị Jeriko ruo ogologo oge, otú ahụ Baịbụl kwuru.