Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha—Na Maịkronishia

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha—Na Maịkronishia

OTU nwa agbọghọ aha ya bụ Katherine toro n’Amerịka. E mere ya baptizim mgbe ọ dị afọ iri na isii, ya aghọọ Onyeàmà Jehova. O ji obi ya niile na-eje ozi ọma. Ma, ndị mmadụ anaghị egecha ntị n’ebe ọ na-ekwusa ozi ọma. O kwuru, sị: “Agụrụ m gbasara ụfọdụ ndị kpere ekpere ka Chineke zitere ha onye ga-enyere ha aka ka ha mata ya. Ọtụtụ mgbe, ọ gụrụ m agụụ ịhụ ụdị onye ahụ, ma o nweghị nke m hụrụ.”

Mgbe Katherine kwusara ozi ọma ọtụtụ afọ n’ebe ahụ, ọ malitere iche otú ọ ga-esi kwaga n’ebe ndị mmadụ ga-enwe mmasị n’ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ọ nọ na-eche ma ọ̀ ga-emeli ya. Kemgbe a mụrụ ya, ọ bụ naanị otu ugboro ka ọ hapụrụ ụlọ ha gaa ebe ọzọ. N’oge ahụ, ọ nọrọ naanị izu abụọ n’ebe ọ gara. Agụụ ịhụ ndị ezinụlọ ya nọkwa na-agụ ya kwa ụbọchị. Ma, o kweghị ka ọ kụdaa ya obi n’ihi na ihe ka ya mkpa bụ obi ụtọ ọ ga-enweta ma o nyere ndị mmadụ aka ka ha mata Jehova. Mgbe o chechara ebe ndị o nwere ike ịkwaga, o degaara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Gụwam akwụkwọ ozi. Ha zara ya ma gwa ya ihe ọ chọrọ ịmata. N’ọnwa asaa n’afọ 2007, ya bụ, mgbe ọ dị afọ iri abụọ na isii, ọ kwagara n’otu obodo a na-akpọ Saịpan, nke bụ́ agwaetiti dị n’Oké Osimiri Pasifik. Isi n’ụlọ ha gaa ebe ahụ dị ihe dị ka puku kilomita iri. Gịnị mere mgbe o ruru ebe ahụ?

OTÚ JEHOVA SI ZAA KATHERINE NA DORIS EKPERE HA

Obere oge Katherine gafere n’ọgbakọ dị n’ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwaanyị dị ihe dị ka iri afọ anọ na ise aha ya bụ Doris. O kwere ka Katherine mụwara ya Baịbụl. Mgbe ha mụruru n’isi nke atọ n’akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi, Katherine malitere ichegbu onwe ya. O kwuru, sị: “Doris na-aghọta ihe a na-akụziri ya. Achọghị m ime ka mmasị o nwere nyụọ ka ọkụ. Tupu mụ ahụ Doris, o nwetụbeghị onye m na-amụrụ Baịbụl kwa izu. N’ihi ya, m chere na m kwesịrị ịchọta nwanna nwaanyị bụ́ aka ochie ga na-amụrụ ya ihe, ikekwe onye ya na ya bụ ọgbọ.” Katherine kpere ekpere ka Jehova nyere ya aka ka ọ chọta nwanna nwaanyị ọzọ ga na-amụrụ Doris Baịbụl. O kpebiri na ya ga-agwa Doris na ọ bụzi onye ọzọ ga na-amụrụ ya ihe.

Katherine kwuru, sị: “Tupu mụ agwawa Doris ihe m chọrọ ime, ọ gwara m na e nwere nsogbu ya chọrọ ịkọrọ m. Mgbe ọ kọchaara m ya, m gwara ya otú Jehova si nyere m aka mgbe m nwere ụdị nsogbu ahụ, ya ekelee m.” Doris gwaziri Katherine, sị: “Jehova ji gị na-enyere m aka. Tupu gị abịa n’ụlọ m ụbọchị mbụ ahụ, agụọla m Baịbụl m ọtụtụ awa. Anọ m na-ebe ákwá, na-arịọ Chineke ka o zitere m onye ga-enyere m  aka ka m ghọta ihe Baịbụl na-ekwu. Ihe m nụziri bụ aka ị kụrụ n’ọnụ ụzọ m. Jehova azala ekpere m.” Anya mmiri juru Katherine n’anya ka ọ na-akọ ihe mere n’ụbọchị ahụ. O kwuru, sị: “Ihe ahụ Doris kọrọ bụ otú Jehova si zaa ekpere m. Jehova mere ka m ghọta na m ga-amụliri ya Baịbụl.”

E mere Doris baptizim n’afọ 2010. Ọ na-amụziri ọtụtụ ndị Baịbụl. Katherine kwuru, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na ihe ahụ na-agụ m agụụ kemgbe emeela, ya bụ, inyere mmadụ aka ka ọ bịa fewe Jehova.” Katherine bụzi ọsụ ụzọ pụrụ iche. O ji obi ụtọ na-eje ozi n’otu obodo a na-akpọ Kọsraị, nke bụ́ agwaetiti dị n’Oké Osimiri Pasifik.

OTÚ E NWERE IKE ISI MERIE NSOGBU ATỌ NDỊ KWAGARA MBA ỌZỌ NA-ENWE

Ihe karịrị otu narị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị esila ná mba ndị ọzọ kwaga n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa na Maịkronishia. Ha dị n’agbata afọ iri na itoolu na iri asaa na itoolu. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Erica dị afọ iri na itoolu mgbe ọ kwagara n’obodo Gụwam n’afọ 2006. O kwuru, sị: “Ịsụ ụzọ n’ebe ndị mmadụ chọrọ ịmụta eziokwu dị na Baịbụl na-atọ ụtọ. Obi dị m ụtọ na Jehova nyeere m aka ka m jewere ya ụdị ozi a. Ọ bụ ihe kacha mma mmadụ nwere ike iji ndụ ya mee.” Ihe a o kwuru bụ otú obi dị ndị ọzọ na-eje ozi n’ebe ahụ. Erica ji obi ụtọ na-eje ozi ugbu a n’otu obodo a na-akpọ Ibaị, nke dị na Mashal Aịlandz. E nwere nsogbu ụfọdụ ndị na-eje ozi ná mba ọzọ na-enwe. Ka anyị leba anya n’atọ n’ime ha ma hụ otú ndị kwagara na Maịkronishia si merie ha.

Erica

Otú ihe dị n’ebe ahụ. E nwere otu nwanna nwoke dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Simon. Mgbe ọ kwagara n’agwaetiti a na-akpọ Palawụ n’afọ 2007, ọ chọpụtara na ego a na-akwụ ya ma ọ rụchaa ọrụ enweghị ebe o ruru ma e jiri ya tụnyere ego a na-akwụ ya n’Ingland o si bịa. O kwuru, sị: “Amụtara m ịna-azụ naanị ihe ndị dị m mkpa. M gaa ịzụ ihe m ga-eji esi nri, m na-asa anya ná mmiri họta nke dị mma. M na-ekwe ọnụ n’ebe dị iche iche ka m nwee ike inweta ya ọnụ ala. Ọ bụrụ na ihe m emebie, m na-aga zụrụ nke ochie m ga-eji arụzi ya, chọtakwa onye ga-enyere m aka rụzie ya.” Olee uru Simon ritere n’ụdị ndụ a ọ na-ebi? O kwuru, sị: “O mere ka m mata ihe ndị dị mkpa ná ndụ nakwa otú m ga-esi jiri obere ihe m nwere na-egbo mkpa m. Ihe ndị mere ugboro ugboro emeela ka m ghọta na Jehova na-elekọta m. Kemgbe afọ asaa m jewere ozi ebe a, o nweghị mgbe m na-enweghị ihe m ga-eri na ebe m ga-arahụ.” O doro anya na Jehova na-akwado ndị na-anaghị ebi ndụ okomoko n’ihi na ha chọrọ ibu ụzọ na-achọ Alaeze ya.—Mat. 6:32, 33.

Ọ na-agụ ha agụụ ịhụ ndị ezinụlọ ha. Erica kwuru, sị: “Mụ na ndị ezinụlọ m dị n’ezigbo mma. N’ihi ya, m ma na ịhụ ha anya ga na-agụsi m agụụ ike. M chere na ọ ga-eme ka obi m ghara ịdị n’ozi ọma m gara ikwusa.” Gịnị ka o mere? O kwuru, sị: “Tupu mụ agawa, m gụrụ isiokwu Ụlọ Nche ndị kwuru gbasara ndị nwere ụdị nsogbu ahụ. O nyeere m aka ka m jikere ejikere. N’otu isiokwu m gụrụ, otu nwanna nwaanyị mesiri nwa ya nwaanyị obi ike na Jehova ga-elekọta ya. Ọ sịrị ya: ‘Jehova ga-elekọta gị karịa otú mụnwa ga-esi elekọta gị.’ Ihe a ọ gwara nwa ya mere ka obi sie m  ike.” E nwere nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Hannah. Ya na di ya bụ́ Patrick na-eje ozi n’obodo a na-akpọ Majuro, nke dị na Mashal Aịlandz. Ihe nyeere Hannah aka ka agụụ ịla ụlọ ghara ịna-agụ ya mgbe niile bụ ịna-eche otú ọ ga-esi nyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha aka. O kwuru, sị: “Ana m ekele Jehova mgbe niile maka ụmụnna anyị ndị nọ n’ụwa niile n’ihi na ha bụkwa ndị ezinụlọ m. E wepụ aka ha na-enyere m, agaraghị m ejeli ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma.”

Simon

Imete ndị enyi. Simon kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ akwaga ná mba ọzọ, otú e si eme ihe n’ebe ahụ na-adị iche n’otú e si eme ya n’ebe o bibu. Mgbe ụfọdụ, anaghị m ama otú m ga-esi gwa ndị mmadụ okwu ka ha chịa ọchị ma ọ bụkwanụ ka ha ghọta ihe m na-ekwu.” Erica kwuru, sị: “Mgbe m gara ebe ahụ ọhụrụ, ọ dị m ka m̀ bụ onye a jụrụ ajụ. Ma, o mere ka m chebara ihe mere m ji kwaga ebe ahụ echiche. Ihe mere m ji gaa bụ ka m jekwuoro Jehova ozi, ọ bụghị maka ihe m ga-enweta.” O kwukwara, sị: “Ka oge na-aga, enwetara m ezigbo ndị enyi m na-anaghị eji egwu egwu.” Simon gbara mbọ mụta asụsụ Palọwan a na-asụ ebe ahụ, ya emezie ka ọ na-agwa ụmụnna bi ebe ahụ ihe dị ya n’obi. (2 Kọr. 6:13) Mbọ ọ gbara ka ọ mụta asụsụ ahụ mere ka ụmụnna ndị bi ebe ahụ hụ ya n’anya. Ọ bụrụ na ndị kwagara ná mba ọzọ na ụmụnna ndị bi n’ebe ahụ ha kwagara ana-arụkọ ọrụ, ọ ga-eme ka ha niile bụrụ ezigbo enyi n’ọgbakọ. Olee uru ndị ọzọ ndị ji obi ha wepụta onwe ha ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa na-erite?

‘ỊGHỌRỌ MKPỤRỤ N’ỤBA’

Pọl onyeozi kwuru, sị: ‘Onye na-agha mkpụrụ n’ụba ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba.’ (2 Kọr. 9:6) Ihe a o kwuru na-emezukwa n’isi ndị wepụtara onwe ha na-ejekwuru Jehova ozi. E nwere ike iji uru ndị ha na-erite na Maịkronishia tụnyere ịghọrọ mkpụrụ n’ụba. Olee ụfọdụ n’ime uru ndị ahụ?

Patrick na Hannah

Na Maịkronishia, ọtụtụ ndị ka na-ekweta ka a mụwara ha Baịbụl. Ị gaa ebe ahụ, ị ga-eji anya gị hụ otú ndị mụtara eziokwu dị na Baịbụl ma mee ihe ha mụtara si na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Ebe ọzọ Patrick na Hannah kwusara ozi ọma bụ n’otu obere agwaetiti a na-akpọ Angaụ. Ọ bụ naanị narị mmadụ atọ na iri abụọ bi n’ebe ahụ. Mgbe ha kwusara ozi ọma ebe ahụ ọnwa abụọ, ha hụrụ otu nwaanyị naanị ya na-azụ ụmụ ya. O kwere ozugbo ka a mụwara ya Baịbụl, kweta na ihe a na-akụziri ya bụ eziokwu ma gbanwee otú o si ebi ndụ. Hannah kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla anyị mụchaara ya ihe ma gbara ígwè anyị na-ala, anyị na-ele ibe anyị anya ma kwuo, sị: ‘Jehova, i meela.’” Hannah kwukwara, sị: “Ama m na Jehova gaara esi n’ụzọ ọzọ mee ka nwaanyị a bịa fewe ya. Ma, ozi anyị na-eje n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa mere ka anyị hụ onye a yiri atụrụ ma nyere ya aka ka ọ mata Jehova. Ihe a so n’ihe ndị kacha eme anyị obi ụtọ kemgbe anyị jewere ozi.” Erica kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i nyere mmadụ aka ka o fewe Jehova, ị ga-enwe obi ụtọ na-enweghị atụ.”

Ị̀ GA-EMELI YA?

N’ọtụtụ mba, a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ì nwere ike iso ná ndị na-akwaga n’ụdị ebe ahụ? Rịọ Jehova ka o mee ka ị chọsie ike ijekwuru ya ozi. Kọtara ya ndị okenye ọgbakọ unu, onye nlekọta sekit unu, ma ọ bụ ndị jetụrụla ozi n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na ị malite ịhazi otú ị ga-esi kwaga ebe ahụ, degara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ebe ahụ ị chọrọ ịga akwụkwọ ozi ma jụta ha ihe ndị ọzọ. * Ọtụtụ puku ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ewepụtala onwe ha ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi ma ndị lụrụ di na nwunye ma ndị na-alụbeghị. Gịnwa nwekwara ike ‘ịghọrọ mkpụrụ n’ụba’ ma nwee ọṅụ.’

^ para. 17 Gụọ isiokwu bụ́ “Ì Nwere Ike ‘Ịgafe na Masedonia’?” nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke Nọvemba 2011.