Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Mianmaa

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Mianmaa

JIZỌS kwuru, sị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Luk 10:2) Ihe a o kwuru ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga na-egosi otú ihe si kwụrụ na Mianmaa taa. N’ihi gịnị? Na Mianmaa, ọ bụ naanị ihe dị ka puku ndị nkwusa anọ na narị abụọ na-ezi nde mmadụ iri ise na ise ozi ọma.

Ma Jehova, “Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ,” emeela ka ọtụtụ narị ụmụnna si ná mba dị iche iche bịa n’obodo a dị n’ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia ikwusa ozi ọma. Olee ihe mere ha ji hapụ obodo ha bịa ebe a? Olee otú e si nyere ha aka ịhapụ obodo ha? Oleekwa otú Jehova si na-agọzi ha? Ka anyị chọpụta.

“BỊAWANỤ, ANYỊ CHỌKWURU NDỊ ỌSỤ ỤZỌ”

N’afọ ole na ole gara aga, akwụkwụ dọrọ otu nwanna bi na Japan aha ya bụ Kazuhiro, nke mere na ọ maghịzi onwe ya, e buru ya gaa ụlọ ọgwụ. Dọkịta gwara ya anyala ụgbọala ruo afọ abụọ. Ihe a wutere Kazuhiro. Ọ jụrụ onwe ya, sị: ‘Olee otú m ga-esi nọgide na-asụ ụzọ na-atọgbu m atọgbu?’ Ọ rịọsiri Jehova arịrịọ ike ka o nyere ya aka ịnọgide na-asụ ụzọ.

Kazuhiro na Mari

Kazuhiro kwuru, sị: “Mgbe otu ọnwa gachara, enyi m na-eje ozi na Mianmaa nụrụ ihe mere m. Ọ kpọrọ m, gwa m, sị: ‘Ihe akacha eji eme njem na Mianmaa bụ bọs. Ị bịa ebe a, ị ga na-aga ozi ọma ma i jighị ụgbọala gị.’ M jụrụ dọkịta m ma ahụ́ m ọ̀ ga-ekwe m ịga Mianmaa. O juru m anya na ọ zara m, sị: ‘Dọkịta bụ́ ọkachamara n’ịgwọ ọrịa ụbụrụ na Mianmaa nọ na Japan ugbu a. Mụ na gị ga-aga hụ ya ka ọ mata gị. Akwụkwụ ahụ dọọ gị ọzọ, ọ ga-elebara gị anya.’ M weere ihe a ọ gwara m ka otú Jehova si za m ekpere.”

Ozugbo ahụ, Kazuhiro zigaara alaka ụlọ ọrụ dị na Mianmaa ozi iimel, gwa ha na ya na nwunye ya chọrọ ịbịa sụọ ụzọ na Mianmaa. Mgbe naanị ụbọchị ise gara, alaka ụlọ ọrụ zara ya, sị: “Bịawanụ, anyị chọkwuru ndị ọsụ ụzọ.” Kazuhiro na nwunye ya Mari rere ụgbọala ha abụọ, gbaa visa, kwụọkwa ụgwọ ụgbọelu. Taa, obi dị ha ụtọ na ha so ìgwè ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na-eje ozi na Mandelei. Kazuhiro kwuru, sị: “Anyị chere na ihe a merenụ emeela ka okwukwe anyị nwere ná nkwa Chineke kwere n’Abụ Ọma 37:5 sikwuo ike. Ebe ahụ sịrị: ‘Nyefee ụzọ gị n’aka Jehova, dabere n’ebe ọ nọ, ya onwe ya ga-emekwa ihe.’”

JEHOVA MEPEERE ANYỊ ỤZỌ

N’afọ 2014, e nwere mgbakọ pụrụ iche na Mianmaa. Ọtụtụ ụmụnna si mba dị iche iche bịara ya. Otu n’ime ha bụ nwanna nwaanyị dị afọ iri atọ na anọ aha ya bụ Monique, si Amerịka. O kwuru, sị: “Mgbe m si mgbakọ ahụ lọta, m rịọrọ Jehova ka o nyere m aka ịmata ihe ọzọ m ga-eme. M gwakwara nne na nna m ihe m chọrọ ime n’ozi Jehova. Anyị niile kwuru na m ga-agaghachi Mianmaa. Ma, m kpesiri ekpere ike, ya ewetụkwa oge tupu mụ ekpebie ihe m ga-eme.” Monique kwuru ihe kpatara ya.

Monique na Li

O kwuru, sị: “Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha buru ụzọ ‘gbakọọ ihe ọ ga-efu.’ N’ihi ya, m jụrụ onwe m, sị: ‘M̀ nwere ego m ga-eji eme njem a? M̀ ga-akpali afọ m n’obodo ahụ n’ejighị oge buru ibu rụọ ọrụ?’” O kwuziri, sị: “M chọpụtara ozugbo ahụ na enweghị m ego ga-ezuru m ịkwaga obodo ahụ.” Olee otú o si mechaa kwaga ebe ahụ?—Luk 14:28.

Monique kwuru, sị: “Otu ụbọchị, onyeisi ọrụ anyị gwara m ka m hụ ya. Ụjọ tụrụ m n’ihi na m chere na ọ chọrọ ịchụ m n’ọrụ. Ma, ihe mezirinụ bụ na o kelere m maka ịrụsi ọrụ ike. Ọ gwaziri m na ya kwuru ka a tụkwasịrị m ego n’ụgwọ ọnwa m. Ego a bụ ego ole m chọrọ.”

Monique na-eje ozi na Mianmaa kemgbe Disemba afọ 2014. Olee otú obi dị ya maka ozi ọ na-eje n’ebe a a chọkwuru ndị nkwusa? Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ na m na-eje ozi n’obodo a. M na-amụrụ mmadụ atọ Baịbụl. Otu n’ime ha bụ nwaanyị dị afọ iri isii na asaa. Ọ na-ejikarị ọnụ ọchị ekele m ma na-amakụ m. Anya mmiri gbara ya mgbe ọ matara na aha Chineke bụ Jehova. Nwaanyị ahụ kwuru, sị: ‘Nke a bụ nke mbụ m na-anụ na aha Chineke bụ Jehova. M tọgburu gị atọgbu, ma ị kụzierela m ihe kacha mkpa m nwere ike ịmụta.’ Anya mmiri gbakwara m. Ụdị akụkọ a na-eme ka obi na-atọ ndị na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa ụtọ.” N’oge na-adịbeghị anya, Monique gara Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze.

Ihe ọzọ mere ka ụfọdụ ndị kwaga Mianmaa bụ ihe e kwuru gbasara Mianmaa n’Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke afọ 2013. E nwere otu nwanna nwaanyị karịrị afọ iri atọ aha ya bụ Li, bi n’ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia. Ihe e kwuru n’Akwụkwọ Mgbaafọ ahụ mere ka o chewe ịhapụ ọrụ ya kwaga Mianmaa. O kwuru, sị: “N’afọ 2014, mgbe m gara mgbakọ pụrụ iche na Yọngọn, m hụrụ otu di na nwunye na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa na Mianmaa. Ha na-ezi ndị na-asụ asụsụ Chaịniiz ozi ọma na Mianmaa. Ebe m na-asụ Chaịniiz, m kpebiri na m ga-akwaga Mianmaa ka m soro ìgwè na-eji asụsụ Chaịniiz amụ ihe na-eje ozi. Mụ na otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Monique so gawa Mandelei. Jehova nyeere anyị aka ịchọta otu ụlọ akwụkwọ anyị na-eji ụbọchị ụfọdụ akụzi ihe. Anyị chọtakwara ụlọ n’ebe dị nso n’ebe ahụ. Ozi ọma m na-eje n’obodo a na-atọ m ụtọ n’agbanyeghị otú o si ekpo ọkụ nakwa nsogbu ụfọdụ m na-enwe. Ndị bi ebe a anaghị ebi ndụ okomoko, ha na-emeso ndị mmadụ ihe otú dị mma, dịkwa njikere ige ozi ọma. Otú Jehova si eme ka a na-ekwusa ozi ọma n’ike n’ike n’obodo a na-atọ anyị ụtọ. M kwetasiri ike na ọ bụ uche Jehova ka m bịa jewe ozi na Mandelei.”

JEHOVA NA-AZA EKPERE

Ọtụtụ ndị na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa achọpụtala na ekpere na-akpa ike. Jumpei onye dị afọ iri atọ na asaa na Nao nwunye ya, onye dị afọ iri atọ na ise nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na Japan. Gịnị mere ha ji kwaga Mianmaa? Jumpei kwuru, sị: “Mụ na nwunye m chọrọ ịga jee ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa na mba ọzọ. Otu nwanna anyị na ya nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na Japan kwagara Mianmaa. N’ọnwa Mee afọ 2010, anyị kwagakwara Mianmaa n’agbanyeghị na anyị nwere obere ego. Ụmụnna nọ na Mianmaa ji obi ụtọ nabata anyị.” Olee otú obi dị nwanna a n’ozi ọ na-ezi ndị ogbi na Mianmaa? O kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ogbi nwere ezigbo mmasị n’ozi anyị na-ezi ha. Anyị gosi ha vidio ndị dị n’asụsụ ndị ogbi, ọ na-eju ha anya. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị kpebiri ijere Jehova ozi n’obodo a.”

Nao na Jumpei

Olee otú Jumpei na nwunye ya si akpa afọ ha? Jumpei kwuru, sị: “Mgbe afọ atọ gachara, ego anyị ji fọrọ obere ka ọ gwụ, anyị enwechaghịkwa ego anyị ga-eji akwụ ụgwọ ụlọ n’afọ ọzọ ya. Mụ na nwunye m kpesiri ekpere ike. Ihe anyị na-atụghị anya ya mere. Alaka ụlọ ọrụ detaara anyị akwụkwọ ozi ma gwa anyị ka anyị bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nke nwa oge. Anyị tụkwasịrị Jehova obi, anyị jikwa anya anyị hụ na ọ hapụghị anyị. Ọ na-egboro anyị mkpa anyị niile.” N’oge na-adịbeghị anya, Jumpei na nwunye ya gakwara Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze.

JEHOVA NA-EME KA ỌTỤTỤ NDỊ KWAGA MIANMAA

Gịnị mere Simone, nwanna dị afọ iri anọ na atọ bụ́ onye Ịtali, na Anna nwunye ya, onye dị afọ iri atọ na asaa bụ́ onye Niu Ziland ji kwaga Mianmaa? Anna sịrị: “Ọ bụ ihe Akwụkwọ Mgbaafọ nke afọ 2013 kọrọ gbasara Mianmaa.” Simone kwuru, sị: “Obi dị m ezigbo ụtọ ịnọ na Mianmaa na-eje ozi. Ihe esighị ike ebe a, enwekwara m oge buru ibu m ji ejere Jehova ozi. Obi na-atọ anyị ụtọ ịhụ na Jehova na-elekọta ndị na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa.” (Ọma 121:5) Anna kwuru, sị: “Enwetụbeghị m ụdị obi ụtọ m nwere ugbu a. Anyị anaghị ebi ndụ okomoko. Mụ na di m na-ewepụtakwu oge anọrị, anyị dịkwa n’ezigbo mma ugbu a karịa. Anyị enwetakwala ezigbo ndị enyi. Ndị obodo a akpọghị Ndịàmà Jehova asị, ụdị mmasị ha nwekwara n’ozi ọma dị egwu.” Olee otú ha si enwe mmasị?

Simone na Anna

Anna kwuru, sị: “Otu ụbọchị, m ziri otu nwa agbọghọ bụ́ nwa akwụkwọ mahadum ozi ọma n’ahịa ma gwa ya na m ga-abịaghachi. Mgbe m gaghachiri, ọ kpọtara enyi ya nwaanyị ka o soro anyị mụọ ihe. N’oge ọzọ m gara, ọ kpọtakwuru ndị enyi ya. O mechakwara kpọtakwuo ndị ọzọ. Mụ na mmadụ ise n’ime ha na-amụ Baịbụl ugbu a.” Simone sịrị: “Ndị anyị na-ahụ n’ozi ọma na-anabata ndị ọbịa, ha na-achọkwa ịmata ihe mere anyị ji bịa. Ọtụtụ n’ime ha nwere mmasị n’ozi ọma anyị na-ezi ha. Oge anaghị ezuru anyị ịga na nke ndị niile nwere mmasị.”

Sachio na Mizuho

Oleekwanụ gbasara ihe ndị mmadụ ga-ebu ụzọ mee tupu ha ekpebie ịkwaga Mianmaa? Mizuho, onye si Japan kwuru, sị: “Ọ dịla anya ọ gụwara mụ na di m Sachio agụụ ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa ná mba ọzọ. Ajụjụ abụrụ, olee ebe anyị ga-aga? Mgbe anyị gụchara ihe a kọrọ gbasara Mianmaa n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke afọ 2013, o metụrụ anyị n’ahụ́ nke mere na anyị malitere iche ma ọ̀ ga-adịrị anyị mfe ịga obodo ahụ.” Sachio kwuru, sị: “Anyị kpebiri na anyị ga-eji otu izu gaa legharịa anya na Yọngọn, bụ obodo kacha buo ibu na Mianmaa, ka anyị mara otú ọ dị. Obere njem a anyị mere mere ka obi sie anyị ike na anyị kwesịrị ịkwaga ebe ahụ.”

Ị̀ GA-AZALI ÒKÙ A NA-AKPỌ?

Jane, Danica, Rodney, na Jordan

Rodney na nwunye ya Jane ndị karịrịla afọ iri ise si Ọstrelia, na nwa ha nwoke Jordan, na nwa ha nwaanyị Danica na-eje ozi na Mianmaa kemgbe afọ 2010. Rodney kwuru, sị: “Otú ọtụtụ ndị si chọọ ịmụta gbasara Chineke na-atọ anyị ezigbo ụtọ. A sị m kwuo, m ga-asị ka ezinụlọ ndị ọzọ gaa jee ozi n’obodo dị ka Mianmaa.” Maka gịnị? Ọ sịrị: “Ọ na-atụ anyị n’anya ịhụ otú ozi ọma anyị na-ezi ebe a sirila mee ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Ihe ọtụtụ ndị na-eto eto ji oge ha na-eme bụ ịpịgharị ekwentị ha, ịna-agbagharị ụgbọala ha, ịrụ ọrụ ha, na ihe ndị ọzọ. Ma ihe ụmụ anyị ji oge ha na-eme bụ ịmụ okwu ndị ha ga-eji ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ha na-amụkwa otú ha na ndị na-amachaghị ihe Baịbụl na-ekwu ga-esi na-ekwurịta okwu n’ozi ọma, nakwa otú ha ga-esi aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ha na-emekwa ihe ndị ọzọ na-atọ ụtọ a na-eme n’ofufe Chineke.”

Oliver na Anna

Otu nwanna si Amerịka aha ya bụ Oliver, onye dị afọ iri atọ na asaa kwuru ihe mere o ji agwa ndị ọzọ ka ha jee ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Ọ sịrị: “Ịhapụ ebe na ihe ndị maara m ahụ́ bịa ebe a ijere Jehova ozi abaarala m ọtụtụ uru. Ebe a m bịara emeela ka m tụkwasikwuo Jehova obi na ọ ga-enyere m aka n’agbanyeghị ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya. Mụ na ụmụnna ndị m na-amabughị na-eje ozi, ma anyị dị n’otu n’ihi ihe ndị anyị kweere. Ọ bụ naanị ná nzukọ Jehova ka ị ga-ahụ ụdị ihe a.” Taa, Oliver na nwunye ya Anna ji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị na-asụ Chaịniiz ozi ọma.

Trazel

Trazel, bụ nwanna nwaanyị dị afọ iri ise na abụọ si Ọstrelia. Ọ na-eje ozi na Mianmaa kemgbe afọ 2004. Ọ sịrị: “M na-agba ndị ọnọdụ ha ga-ekwe mee ume ka ha gaa jee ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. Achọpụtala m na ọ bụrụ na mmadụ a gbaa mbọ jee ụdị ozi a, Jehova na-agọzi ya. Amaghị m na m ga-ejili ndụ m jeere Jehova ozi otú a. O nweghị ihe ọzọ na-eme obi ụtọ m gaara eji ndụ m eme karịa ya.”

Ka okwu ndị a ụmụnna ndị a na-eje ozi na Mianmaa si n’ala ala obi ha kwuo mee ka ị chọọ inyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka n’ebe ndị a na-anaghị ekwusa ozi ọma na ha. N’eziokwu, ụmụnna anyị ndị a na-akpọ òkù, sị, “Biko, gafeta na Mianmaa nyere anyị aka.”