Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha—Na Brazil

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha—Na Brazil

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha​—Na Brazil

E NWERE otu nwanna nwaanyị dị afọ iri atọ ugbu a. Aha ya bụ Rúbia (1). Afọ ole na ole gara aga, ọ gara leta nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Sandra (2), onye bụ́ ọsụ ụzọ n’otu obere ọgbakọ dị n’ebe ndịda Brazil. Ihe mere mgbe Rúbia gara ebe ahụ metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu ma mee ka ọ gbanwee ihe o kpebiri iji ndụ ya mee. Gịnị bụ ihe ahụ merenụ? Ka Rúbia kọọrọ anyị.

“IHE M NỤRỤ JURU M ANYA”

“M so Sandra gaa ileta otu nwaanyị ọ na-amụrụ Baịbụl. Mgbe ọ na-amụrụ nwaanyị ahụ ihe, nwaanyị ahụ kwuru, sị: ‘Sandra, ụmụ agbọghọ atọ mụ na ha na-arụkọ ọrụ chọrọ ka ị mụwara ha Baịbụl, ma agwara m ha na ha ga-echere mgbe ọ ga-eruru ha. Ama m na i nwetachaala ndị ị ga-amụrụ ihe n’afọ a.’ Ihe m nụrụ juru m anya. A na-agwa ndị chọrọ ịmụ banyere Jehova ka ha chere mgbe ọ ga-eruru ha. N’ọgbakọ anyị, o siiri m ike inwetadị otu onye m na-amụrụ ihe. Ozugbo ahụ, mgbe m ka nọ n’ụlọ nwaanyị ahụ, ọ gụsiri m agụụ ike inyere ndị bi n’obere obodo ahụ aka. N’oge na-adịghị anya, esi m ná nnukwu obodo m bi kwaga n’obodo ahụ Sandra nọ na-asụ ụzọ.”

Gịnị mechara mee mgbe Rúbia gara ebe ahụ? O kwuru, sị: “N’ime ọnwa abụọ, enwetara m mmadụ iri na ise m na-amụrụ Baịbụl. N’eziokwu, n’oge na-adịghị anya, e nwere ọtụtụ ndị na-eche m otú ahụ a na-eche Sandra ka o ruoro ha tupu mụ amalite ịmụrụ ha ihe!”

O MERE KA O CHEBARA OZI YA ECHICHE

Diego (3), bụ́ nwanna nwoke dị ihe dị ka afọ iri abụọ na atọ ugbu a, gara leta di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ na Prudentópolis, bụ́ obere obodo dị n’ebe ndịda Brazil. Ihe mere n’ebe ahụ ọ gara metụrụ ya n’ahụ́; n’eziokwu, o mere ka o chebara ozi nke ya echiche. O kwuru, sị: “Anaghị m arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ anyị, ọ bụ naanị awa ole na ole ka m ji ekwusa ozi ọma kwa ọnwa. Ma, mgbe m gara leta ndị ọsụ ụzọ ahụ, nụ ihe ndị ha kọrọ banyere ozi ọma ha na-eje, eji m ọṅụ ha na-enwe n’ozi ha tụnyere otú m si eji ozi ọma egwuri egwu. Mgbe m hụrụ ụdị obi ụtọ ha na-enwe, ọ dị m ka ya bụrụ m na-enwe ụdị obi ụtọ ahụ.” Mgbe Diego lara, ọ malitere ịsụ ụzọ.

Ị̀ bụ Onyeàmà Jehova ka na-eto eto? Dị ka Diego, ị̀ na-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe, ma ya abụrụ na ozi ọma anaghị atọcha gị ụtọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ì nwere ike ịgbanwe ihe ụfọdụ ị na-eme ka i nwee ike ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, nke ga-eme ka ị na-enwe ọṅụ n’ozi gị? N’eziokwu, ọ bụrụ na i bi n’ebe obi ruru gị ala, o nwere ike isiri gị ike ịhapụ ebe ahụ kwaga ebe ọzọ. Ma, ọtụtụ ndị na-eto eto ekpebiela ime otú ahụ. Ha akatala obi gbanwee ihe ndị ha kpebiri ime na ihe ndị na-agụ ha agụụ ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Ka anyị tụlee ihe Bruno mere.

ONYE NA-AKỤZI EGWÚ KA Ọ̀ BỤ ONYE OZI CHINEKE?

Afọ ole na ole gara aga, Bruno (4), onye dị afọ iri abụọ na asatọ ugbu a, gara ụlọ akwụkwọ a ma ama, bụ́ ebe a na-akụzi egwú. Ọ chọrọ ịbụ onye na-akụzi egwú. N’eziokwu, o mere nke ọma n’egwú ahụ ọ na-amụ nke na a kpọrọ ya ugboro ugboro ka o duzie òtù egwú. O yiri ka ọ̀ ga-aghọ onye a ma ama n’ịkụzi egwú. Bruno kwuru, sị: “Ma, ọ dị ka ò nwere ihe kọrọ m. Ararala m onwe m nye Jehova, ma amaara m na ejighị m ike m niile na-ejere ya ozi, ọ na-ewutekwa m. M kpere ekpere gwa Jehova otú obi dị m, kọkwaara ya ụmụnna tozuru okè n’ọgbakọ. Mgbe m chebachaara ya echiche nke ọma, m kpebiri igosi na ozi m dị mkpa karịa egwú m na-amụ. M kwụsịrị ịga ụlọ akwụkwọ ahụ, kwaga n’ebe a chọrọ ndị ga na-ekwusa ozi ọma.” Gịnị mechara mee?

Bruno kwagara n’obodo Guapiara, bụ́ ebe ihe dị ka puku mmadụ asaa bi. Obodo a dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri isii ma e si obodo Saụ Paụlo gawa ya. Ihe a bụ nnukwu mgbanwe. O kwuru, sị: “M kwabara n’obere ụlọ na-enweghị friji, tiivi, na Ịntanet. Ma, ụlọ ahụ mere ka m nwee ihe ndị m na-enwetụbeghị, ya bụ, ebe a kụrụ akwụkwọ nri na osisi!” Bruno nọ n’otu obere ọgbakọ n’ebe ahụ. Otu ugboro n’izu, ọ na-eji ọgba tum tum ya buru ma nri ma mmiri ma akwụkwọ gawa ikwusa ozi ọma n’ime ime obodo. Ọtụtụ ndị bi n’ebe ahụ anụtụbeghị ozi ọma. Ọ kọrọ, sị: “Amụụrụ m mmadụ iri na asatọ Baịbụl. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ ịhụ ka ha gbanwere otú ha si ebi ndụ!” O kwukwara, sị: “N’oge ahụ, achọpụtara m na mụ enwetala ihe kọrọ ná ndụ m, ya bụ, ezigbo obi ụtọ mmadụ na-enwe ma ọ bụrụ na o buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. A sị na m gara ịchụ ego, m gaaraghị enwe ụdị ọṅụ ahụ.” Olee otú Bruno si na-enweta ego o ji na-egbo mkpa ya n’obodo Guapiara? Ọ mụmụrụ ọnụ ọchị, sị: “M na-akụziri ndị mmadụ otú e si akpọ ụbọ.” E nwere ike ikwu na ọ ka na-akụzi egwú.

“EKPEBIRI M IBI EBE AHỤ”

Mariana (5), onye dị ihe dị ka afọ iri abụọ na asatọ ugbu a, nwere ụdị nsogbu ahụ Bruno nwere. Ọ bụ ọkàiwu, ma n’agbanyeghị na ọrụ ahụ na-enye ya ezigbo ego, ọ naghị enwe obi ụtọ. O kwuru, sị: “Ọ dị m ka m̀ ‘na-achụso ifufe.’” (Ekli. 1:17) Ọtụtụ ụmụnna gbara ya ume ka o chebara ịsụ ụzọ echiche. Mgbe Mariana chebachaara ya echiche, ya na ndị enyi ya bụ́ Bianca (6), Caroline (7), na Juliana (8), kpebiri inyere otu ọgbakọ dị na Bara do Bugres aka. Ọ bụ obodo dịpụrụ adịpụ nke dị nso na Bolivia. Isi n’obodo ha gaa ebe ahụ dị ọtụtụ puku kilomita. Gịnịzi mere?

Mariana kwuru, sị: “Ebu m n’obi ịnọ ebe ahụ ọnwa atọ. Ma mgbe ọnwa atọ gachara, ndị m na-amụrụ Baịbụl dị mmadụ iri na ise! N’eziokwu, e kwesịrị inyekwuru ndị ahụ m na-amụrụ ihe aka ka ha nwee ọganihu n’eziokwu Baịbụl. N’ihi ya, obi akaghị m ịgwa ha na m chọrọ ịla. Ekpebiri m ibi ebe ahụ.” Ọ bụ ihe ụmụnna nwaanyị anọ ahụ mere. Ihe ahụ Mariana kpebiri ime ò mere ka ndụ ya bakwuoro ya uru? O kwuru, sị: “Obi na-atọ m ụtọ ma m cheta na Jehova si n’aka m na-enyere ndị mmadụ aka ka ndụ ha ka mma. Obi dị m ụtọ na m ji oge m na ike m na-eme ihe bara ezigbo uru.” Ihe Caroline kwuru gosiri otú obi dị ụmụnna nwaanyị anọ ahụ. O kwuru, sị: “Ọ na-abụ m dinara ala n’abalị, obi adị m ezigbo ụtọ n’ihi na eji m ike m niile na-eme ihe gbasara Alaeze Chineke. Ihe kacha m mkpa bụ otú m ga-esi nyere ndị m na-amụrụ Baịbụl aka. Obi na-adị m ezigbo ụtọ ịhụ ka ha na-eme nke ọma. Achọpụtala m na ihe ahụ Baịbụl kwuru bụ eziokwu, ya bụ, ‘Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’”—Ọma 34:8.

Ọ ga-abụrịrị na obi dị Jehova ezigbo ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ụmụnna na-eto eto n’ụwa niile ‘na-ewepụta onwe ha’ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ime ime obodo! (Ọma 110:3; Ilu 27:11) Jehova na-agọzikwa ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi otú ahụ.—Ilu 10:22.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

“O Nwebeghị Ihe Kọrọ Anyị”

Mgbe João Paulo na nwunye ya, bụ́ Noemi, kwuru na ha chọrọ ịga jewe ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ha gwara ha ihe ga-akụda ha obi. Ụmụnna ụfọdụ gwara ha, sị: “Ihe ga-esiri unu ike ma unu kwaga n’obere obodo.” “Gịnị mere unu ji chọọ ịkwapụ? A ka nwere ọtụtụ ihe a ga-arụ n’ọgbakọ anyị.” João Paulo kwuru, sị: “Ndị kwuru ihe ahụ na-echere anyị echiche ọma, ma ndụmọdụ ha agbaghị anyị ume. N’ihi ya, ọ dịghịrị anyị mfe ịnọsi ike n’ihe anyị kpebiri ime.” Ma ugbu a, ka João Paulo na Noemi jerela ozi ọtụtụ afọ n’ebe ahụ a chọkwuru ndị nkwusa, obi dị ha ụtọ na ha kpebisiri ike ijekwuru Jehova ozi. João Paulo kwuru, sị: “Kemgbe mụ na nwunye m bi ebe a, o nwebeghị ihe kọrọ anyị. Ugbu a, anyị nwere ihe ndị dị anyị mkpa n’ezie karịa ka anyị nwere n’oge gara aga.” Noemi kwuru, sị: “Mbọ anyị gbara efughị ọhịa.”

Ọ naghị adịrị ndị bi n’obere obodo mfe ịkpata ego ha ga-eji na-egbo mkpa ha. Olee otú ndị kwagara n’ime ime obodo si enweta ego ha ji egbo mkpa ha? Ha na-echepụta otú ha ga-esi jiri nkà ndị ha nwere na-arụ ọrụ. Ụfọdụ na-akụzi Bekee ma ọ bụ asụsụ ọzọ. Ụfọdụ na-akụziri ụmụ akwụkwọ ihe n’ụlọ. Ụfọdụ na-akwa ákwà ma ọ bụ na-ete ụlọ ágbá ma ọ bụkwanụ na-arụ ihe ọ bụla ga-eme ka ha nwekwuo oge ịga ozi ọma. Gịnị ka ndị niile jere ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu kwuru? Ha kwuru na ngọzi ha nwetara enweghị atụ!

[Igbe/Foto dị na peeji nke 6]

“Ọ Gụsiri M Agụụ Ike Ịlaghachi Ụlọ”

Tiago kwuru, sị: “Mgbe m gara ọgbakọ ahụ ọhụrụ, obi malitere ịda m mbà. E nweghị ọtụtụ ndị nkwusa n’obodo ahụ, e nweghịkwa ọtụtụ ihe e ji atụrụ ndụ. Ọ gụsiri m agụụ ike ịlaghachi ụlọ. Ama m na m kwesịrị ime ihe ga-eme ka obi dị m mma. N’ihi ya, agbalịwara m ịmatakwu ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ. Ime otú ahụ nyeere m aka! M nwetara ọtụtụ ndị enyi. N’oge na-adịghị anya, m malitere inwe obi ụtọ, ahụ́ eruokwa m ala.”

[Foto dị na peeji nke 3]

Noemi na João Paulo, n’obodo Askọra dị na Santa Katarina