Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Jizọs ò bu n’uche ịkparị ndị na-abụghị ndị Juu mgbe o mere ihe atụ gbasara “ụmụ nkịta”?

Nwatakịrị ku nwa nkịta n’aka. Ọ ga-abụ ndị Grik ma ọ bụ ndị Rom kpụrụ ihe a (n’agbata afọ 101 Tupu Oge Ndị Kraịst na afọ 199 Oge Ndị Kraịst)

E nwere otu oge Jizọs nọ na Siria bụ́ obodo ndị Rom na-achị, nke dị ná mpụga ókèala Izrel, otu nwaanyị onye Grik abịakwute ya na-arịọ ya ka o nyere ya aka. Jizọs meere nwaanyị ahụ ihe atụ. N’ihe atụ ahụ, o ji ndị na-abụghị ndị Juu tụnyere “ụmụ nkịta.” N’Iwu Mozis, a na-ewere nkịta ka anụ na-adịghị ọcha. (Levitikọs 11:27) Ma, Jizọs ò bu n’uche ịkparị nwaanyị onye Grik a na ndị niile na-abụghị ndị Juu?

Mbanụ. Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gosiri na ihe ọ na-ekwu bụ na ihe ka ya mkpa n’oge ahụ bụ inyere ndị Juu aka. Ọ bụ ya mere o ji meere nwaanyị onye Grik ahụ ihe atụ, sị: “O zighị ezi iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.” (Matiu 15:​21-26; Mak 7:26) Ndị Grik na ndị Rom anaghị eji nkịta egwu egwu. Ha na nkịta na-ebi n’ụlọ, ụmụaka ha na nkịta ana-egwurikwa egwu. N’ihi ya, mgbe nwaanyị ahụ nụrụ “ụmụ nkịta,” o nwere ike ịbụ na o chetara otú ha na nkịta si adị ná mma. Ọ zaghachiri Jizọs ozugbo, sị: “Ee, Onyenwe anyị; ma n’ezie, ụmụ nkịta na-eri irighiri ihe na-esi na tebụl nna ha ukwu na-adapụsị.” Jizọs kelere ya maka okwukwe o nwere, ma gwọọ nwa ya nwaanyị.​—⁠Matiu 15:​27, 28.

Ihe Pọl onyeozi kwuru ka ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ha nọ na ya ghara ịkwọrọ ya gawa, ò ziri ezi?

Nnukwu ugbo a tụrụ atụ (ihe dị ka otu puku afọ na narị itoolu gara aga)

Ebili mmiri nọ na-enye ụgbọ mmiri bu Pọl na-aga Ịtali nsogbu. Mgbe ha kwụsịtụrụ n’otu ebe, Pọl onyeozi tụrụ aro ka ha ghara ịkwọrọ ụgbọ ahụ gawa n’oge ahụ. (Ọrụ Ndịozi 27:​9-12) È nwere ezigbo ihe mere o ji kwuo ihe a?

Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri n’oge ochie ma na ịkwọ ụgbọ mmiri n’osimiri Mediterenian na-adị ize ndụ n’oge oyi. A na-ewere ya na e kwesịghị ịna-agba n’osimiri ahụ malite n’etiti ọnwa Nọvemba ruo etiti ọnwa Mach. Ma, ọ bụ n’ọnwa Septemba ma ọ bụ Ọktoba ka ụgbọ mmiri ahụ bu Pọl onyeozi chọrọ isi n’osimiri ahụ gbafee. E nwere ihe otu onye Rom na-ede akwụkwọ dere n’akwụkwọ ya bụ́ Epitome of Military Science gbasara ịgba n’osimiri ahụ. Aha nwoke ahụ bụ Vegetius. O biri ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii gara aga. O dere, sị: “Ụfọdụ ọnwa na-adị mma ịgba n’osimiri ahụ, ụfọdụ anaghị adịcha, e nwekwara ndị a na-ekwesịghị ịgba na ya chaa chaa.” Vegetius kwuru na oge dị mma ịgba n’osimiri ahụ n’afọ, bụ malite n’abalị 27 n’ọnwa Mee ruo n’abalị 14 n’ọnwa Septemba. O kwukwara na oge abụọ ahụ na-adịchaghị mma ịgba n’osimiri ahụ bụ malite n’abalị 15 n’ọnwa Septemba ruo n’abalị 11 n’ọnwa Nọvemba nakwa malite n’abalị 11 n’ọnwa Mach ruo n’abalị 26 n’ọnwa Mee. Ebe ọ bụ na Pọl na-esikarị n’osimiri eme njem, ọ ga-abụrịrị na ọ ma gbasara oge ndị a ọ na-adị ize ndụ ịgba n’osimiri ahụ. Ọ ga-abụkwa na ọkwọ ụgbọ mmiri ahụ na onye nwe ụgbọ mmiri ahụ ma ihe ndị a, ma ha egeghị Pọl ntị. Ụgbọ mmiri ha mechara kpuo.​—⁠Ọrụ Ndịozi 27:​13-44.