Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

M Kpebisiri Ike Ịbụ Onye Agha Kraịst

M Kpebisiri Ike Ịbụ Onye Agha Kraịst

Ka mgbọ nọ na-efefe n’ebe m nọ, m ji nwayọọ welie hankachiif ọcha elu. Ndị agha ahụ nọ na-agba égbè ji olu ike gwa m ka m pụta n’ebe ahụ m zoro. M ji akọ gakwuru ha n’amaghị ma m̀ ga-adị ndụ ma m̀ ga-anwụ. Olee otú m si baa ná nsogbu a?

M PỤTARA ụwa n’afọ 1926. Abụ m nwa nke asaa n’ime ụmụ asatọ papa m na mama m mụrụ na Karitsa, bụ́ obere obodo dị na Gris. Papa m na mama m dị ike ọrụ.

N’afọ 1925, papa m na mama m hụrụ Nwanna John Papparizos. Ọ bụ Onye Mmụta Baịbụl na-anụ ọkụ n’obi na onye ekwurekwu. Ihe a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ bụ Ndị Mmụta Baịbụl. Papa m na mama m malitere ịga ọmụmụ ihe Ndị Mmụta Baịbụl n’obodo anyị n’ihi otú Nwanna John si na-akọwa Baịbụl nke ọma. Okwukwe mama m nwere na Jehova Chineke siri ezigbo ike. N’agbanyeghị na ọ maghị agụ ihe, ọ na-eji ohere ọ bụla na-agwa ndị ọzọ ihe ọ na-amụta. Ọ dị mwute na papa m lekwasịrị anya n’ezughị okè ndị mmadụ, jiri nwayọọ nwayọọ kwụsị ịga ọmụmụ ihe.

Mụ na ụmụnne m ejighị Baịbụl egwu egwu, ma ikpori ndụ megharịrị anyị anya mgbe anyị na-eto eto. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitere na Yurop n’afọ 1939, ihe mere n’obodo anyị juru anyị anya. Ndị agha Gris kpụụrụ Nicolas Psarras, bụ́ nwa nwanne papa m ka mere baptizim ọhụrụ, ka o soro ha lụwa agha. Ọ dị afọ iri abụọ mgbe ahụ. Ọ katara obi gwa ndị isi ndị agha ahụ, sị: “Agaghị m alụ agha n’ihi na m bụ onye agha Kraịst.” E kpere ya ikpe n’ụlọikpe ndị agha ma tụọ ya mkpọrọ afọ iri. O nyeghị anyị ọnụ okwu.

Ihe ọma merenụ bụ na n’afọ 1941, ndị agha Briten na ndị agha ndị ọzọ batara Gris, a kpọpụta Nicolas n’ụlọ mkpọrọ. Ọ laghachiri Karitsa. Nwanne m nke tọrọ m, bụ́ Ilias, ajụkasịa ya ajụjụ ahụ́ gbasara Baịbụl. M gere ntị nke ọma. Mụ na Ilias na nwanne anyị nwaanyị anyị tọrọ bụ́ Efmorfia malitere ịmụ Baịbụl, gachiwekwa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova anya. N’afọ na-eso ya, anyị atọ nyefere Jehova onwe anyị, e mee anyị baptizim. Mmadụ anọ n’ime ụmụnne anyị mechara ghọọkwa Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi.

N’afọ 1942, e nwere ụmụnna itoolu bụ́ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ nọ n’agbata afọ iri na ise na iri abụọ na ise n’ọgbakọ dị na Karitsa. Anyị niile ma na ọnwụnwa kpụ ọkụ n’ọnụ ga-abịara anyị. Ọ bụ ya mere anyị ji na-ezukọta mgbe ọ bụla o kwere omume na-amụ Baịbụl, na-abụ abụ, na-ekpekwa ekpere ka okwukwe anyị sie ike. Ihe ndị a mere ka okwukwe anyị sie ike.

Mgbe Demetrius na ndị enyi ya nọ na Karitsa

AGHA NDỊ GRIS

Ka Agha Ụwa nke Abụọ na-ebi, agha ọzọ dara na Gris n’ihi na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Kọmunist nke ndị Gris nupụụrụ ọchịchị Gris isi. Ndị agha nnupụisi ahụ nọ na-agagharị ebe niile n’ime ime obodo, na-amanye ndị mmadụ ka ha soro ha lụwa agha. Ha bịara n’obodo anyị kpụrụ ụmụnna atọ bụ́ ndị na-eto eto, ya bụ, Antonio Tsoukaris, Ilias, na mụnwa. Anyị rịọrọ ka ha hapụ anyị, na anyị anaghị alụ agha. Ma, ha manyere anyị iso ha gaa n’Ugwu Olimpọs. O were anyị ihe dị ka awa iri na abụọ.

Mgbe obere oge gara, otu n’ime ndị isi n’òtù ndị Kọmunist ahụ nyere anyị iwu ka anyị soro òtù ọ lụọ ọ gbalaga. Anyị gwara ya na ezigbo Ndị Kraịst anaghị eburu ngwá agha gaa lụso mmadụ ibe ha ọgụ. Ezigbo iwe abịa ya, ya akpọrọ anyị gakwuru onye ka ya n’ọkwá. Anyị gwakwara onye ahụ ihe anyị gwara onye nke mbụ, ya enye anyị iwu, sị: “Werezienụ ịnyịnya ibu gaa n’ihu agha, buru ndị agha e merụrụ ahụ́ gawa n’ụlọ ọgwụ.”

Anyị zara ya, sị: “Ndị agha gọọmenti jidekwanụ anyị, ọ̀ bụ na ha agaghị eche na anyị bụ ndị agha?” Ọ sịrị: “Bugarazienụ ndị na-alụ agha nri.” Ma anyị sịrị ya, “Onyeisi ndị agha hụkwanụ ịnyịnya ibu anyị ji ma nye anyị iwu ka anyị buga ngwá agha n’ihu agha?” Ọchịagha ahụ gbara nkịtị, chewe ihe anyị gwara ya. O mechara sị: “Unu nweziri ike ilekọtawa atụrụ. Nọrọnụ n’ugwu a lekọtawa atụrụ.”

N’ihi ya, ka agha ahụ na-akpọtụ, akọnuche anyị kwere anyị ka anyị lekọtawa atụrụ. N’afọ na-eso ya, a hapụrụ ọkpara nne m bụ́ Ilias ka ọ lawa gaa lekọtawa mama anyị, bụ́zi nwaanyị di ya nwụrụ. Ọrịa bịara Antonio, a tọhapụ ya. Ma, ha ekweghị ahapụ m.

N’oge ahụ, ndị agha Gris ji nwayọọ nwayọọ na-achụkwute ndị agha nnupụisi ndị ahụ, na-achọ ịgba ha gburugburu. Ndị ahụ ji m eji kpọọrọ anyị si n’ugwu dị ebe ahụ gbawa ọsọ, tinye isi n’Albenia anyị na ha gbara agbata obi. Mgbe anyị ruwere n’ókè anyị na ha, anyị chọpụtara na ndị agha Gris agbaala anyị gburugburu. Ụjọ bịara ndị agha nnupụisi ahụ. Ha erie mbọmbọ. M gara zoo n’otu osisi dara ada. Ọ bụ ya bụ mgbe m hụrụ ndị agha ahụ m kọrọ akụkọ ha ná mmalite.

Mgbe m gwara ndị agha Gris na ndị agha nnupụisi ji m eji, ha kpọọrọ m gaa n’ogige ndị agha dị nso na Veria, bụ́ obodo Beria ahụ a kpọrọ aha ya na Baịbụl, ka ha kpebie ihe ha ga-eme m. Ọ bụ ebe ahụ ka a gwara m ka m gwuwere ndị agha ala. Ekweghị m egwu. Onyeisi ha enye iwu ka a kpọga m n’otu agwaetiti ndị mmadụ na-atụ ụjọ, nke a kpọrọ Makrọsisos, (nke bụ́zi Makrọnisi).

AGWAETITI A NA-ATỤ EGWU

Agwaetiti Makrọnisos dị n’akụkụ osimiri n’Atika. E nweghị ezigbo ihe dị na ya. Mmiri anaghị ezocha na ya. Anwụ na-achakwa nnukwu na ya. Isi Atens gaa ya dị ihe dị ka kilomita iri ise. Ọ dị naanị kilomita iri na atọ n’ogologo. Ebe kacha obosara na ya dịkwa naanị kilomita abụọ na ọkara. Ma, si n’afọ 1947 ruo 1958, ndị mkpọrọ a kpọgara ebe ahụ karịrị otu narị puku mmadụ, ma ndị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Kọmunist ma ndị bụ́bu ndị agha nnupụisi ma ọtụtụ Ndịàmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi.

Mgbe m ruru ebe ahụ ná mbido afọ 1949, e dewere ndị mkpọrọ n’ebe dị iche iche. E dewere m n’ụlọ mkpọrọ bụ́ ebe a na-ahapụ ndị mkpọrọ ka ha mee ihe ụfọdụ, mụ na ọtụtụ ndị mkpọrọ ndị ọzọ. Ihe dị ka mmadụ iri anọ na-arahụ n’ala nkịtị n’otu ụlọikwuu a rụrụ maka mmadụ iri. Anyị na-aṅụ mmiri na-esi ísì. Ihe anyị kacha eri bụ lentil na ihe yiri afụfa. Uzuzu juru ebe ahụ na oké ifufe na-efe na ya mgbe niile menyụrụ anyị anya. Ma, ọ dị mma na a sịghị anyị gaa na-akwagharị nnukwu nkume ndị dị ebe ahụ, nke bụ́ ụdị ahụhụ ọ na-abụ, a tachaa ọtụtụ ndị mkpọrọ, ahụ́ akụọ ha gwoogwoo, obi agbawaakwa ha.

Mụ na ụmụnna ndị ọzọ a kpọgara n’Agwaetiti Makrọnisos

Otu ụbọchị m nọ na-agagharị n’akụkụ osimiri, m hụrụ ụfọdụ ụmụnna si n’ụlọ mkpọrọ ndị ọzọ. Obi tọgburu anyị atọgbu ịhụ ibe anyị. Anyị na-ezukọ mgbe ọ bụla o kwere omume. Ma anyị na-akpachara anya ka a ghara ịhụ anyị. Anyị na-ejikwa akọ ezi ndị mkpọrọ ndị ọzọ ozi ọma. Ụfọdụ n’ime ha mechara ghọọ Ndịàmà Jehova. Ekpere na ihe ndị a mere ka okwukwe anyị ghara ịnyụ ka ọkụ.

M JI ANYA M HỤ NTỊ M

Mgbe m nọchara ebe ahụ ọnwa iri, ndị tụrụ m mkpọrọ chere na ha emeela ka m gbanwee. Ha ekpebie na o ruola mgbe m ga-eyiri uwe ndị agha. M jụrụ. Ha akpụrụ m gaa n’ihu onyeisi ebe ahụ. M nyere nwoke ahụ akwụkwọ. Ihe m dere na ya bụ: “Naanị ihe m chọrọ bụ ịbụ onye agha Kraịst.” Onyeisi ahụ yiri m egwu, mechaa nyefee m n’aka osote ya, bụ́ achịbishọp ndị Grik Ọtọdọks, onye yi uwe ndị bishọp. Mgbe m ji Baịbụl zaa ajụjụ niile ọ jụrụ m n’atụghị egwu, o ji iwe kwuo n’olu ike, sị: “Kpọpụnụ ya. Okpukpe ya na-agba ya ara.”

N’ụtụtụ echi ya, ndị agha nyere m iwu ọzọ ka m yiri uwe ndị agha. Mgbe m jụrụ, ha ebido isu m aka, na-akụ m mkpirisi osisi ha na-eji. Ha kpọzi m gaa n’ụlọ ọgwụ dị n’ụlọ mkpọrọ ahụ ka ha mata ma ọkpụkpụ m ọ̀ gbajiri. Ha sikwa ebe ahụ kpụrụ m laghachi n’ụlọikwuu ahụ. Ha mere m ihe a kwa ụbọchị ruo ọnwa abụọ.

Ndị agha ahụ iwe ji chepụtara ihe ọzọ ha ga-eme m n’ihi na ekweghị m emebi iwu Chineke. Ha kefere m aka n’azụ, jiri ụdọ na-apịa m n’ọbụ ụkwụ. Ka ihe ahụ na-afụ m ka ose, m chetara ihe Jizọs kwuru, nke bụ́: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu . . . Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.” (Mat. 5:11, 12) Ha tagidere m ahụhụ ahụ n’akwụsịghị akwụsị ruo mgbe m tụbọrọ.

M hụziri onwe m n’ụlọ mkpọrọ jụrụ oké oyi, n’enweghị nri, mmiri, ma ọ bụ blanket. Ma, obi ruru m ala. “Udo nke Chineke” nọ ‘na-eche obi m na ike iche echiche m nche’ otú ahụ Baịbụl kwere anyị ná nkwa.” (Fil. 4:7) N’echi ya, otu onye agha dị obiọma nyere m achịcha na mmiri na kootu. Onye agha ọzọ enyekwa m nri e kenyere ya. Jehova si otú a nakwa n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ na-elekọta m.

Ndị ọchịchị weere m ka onye isi ike na-ekweghị agbanwe. Ha kpọgara m Atens ka e kpee m ikpe n’ụlọikpe ndị agha. N’ebe ahụ, a mara m ikpe ịga mkpọrọ afọ atọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Yiaros, (nke a na-akpọzi Giaros), n’otu agwaetiti dị ihe dị ka kilomita iri ise n’ebe ọwụwa anyanwụ Makrọnisos.

“ANYỊ GA-ATỤKWASỊLI UNU OBI”

Ụlọ mkpọrọ dị na Yiaros bụ agadaga ụlọ siri ike e ji brik na-acha uhie uhie rụọ. Ndị mkpọrọ nọ na ya karịrị puku ise, bụ́ ndị a tụrụ mkpọrọ maka ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. E nwekwara Ndịàmà Jehova asaa n’ebe ahụ. A tụrụ ha mkpọrọ maka na ha ekweghị aga agha. Anyị mmadụ asaa na-ezukọ amụ Baịbụl na nzuzo n’agbanyeghị na a machibidoro ya iwu. Anyị na-enwetadị Ụlọ Nche a na-ezo ezo ewebatara anyị. Anyị ejirizie aka depụta ya ka onye ọ bụla nwee nke ọ ga-agụ n’ọmụmụ ihe anyị.

Otu ụbọchị anyị nọ na-amụ ihe na nzuzo, otu onye nche hụrụ anyị na mberede, kpokọrọ akwụkwọ anyị ji na-amụ ihe. A kpọpụrụ anyị n’ihu osote onyeisi, anyị echee na a ga-agbatịkwu oge anyị ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ. Kama, ime otú ahụ, osote onyeisi ahụ sịrị: “Anyị ma ndị unu bụ. Anyị na-akwanyere unu ùgwù. Anyị ma na anyị ga-atụkwasịli unu obi. Gaanụ rụwa ọrụ unu.” O nyedịrị ụfọdụ n’ime anyị ọrụ na-esighị ike. Obi abụrụ anyị sọ aṅụrị. Irubere Jehova isi nwedịrị ike ime ka e too ya, ma n’ụlọ mkpọrọ.

Ntachi obi anyị rụpụtakwara ihe ọma ndị ọzọ. Otu onye mkpọrọ bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara mgbakọ na mwepụ hụrụ àgwà ọma anyị na-akpa, ya ajụwa ajụjụ banyere ihe anyị kweere. A tọhapụkwara ya mgbe a tọhapụrụ anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ná mmalite afọ 1951. E mechara mee ya baptizim, ya aghọọ Onyeàmà Jehova, mechaakwa jewe ozi oge niile.

M KA BỤ ONYE AGHA

Mụ na Janette nwunye m

Mgbe a tọhapụrụ m, m laghachiri Karitsa, bụ́ ebe ndị ezinụlọ m nọ. Mụ na ọtụtụ ndị obodo anyị mechara kwaga Melbọn dị n’Ọstrelia. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m hụrụ otu ọmarịcha nwanna nwaanyị aha ya bụ Janette. Mụ na ya lụrụ, mụta otu nwoke na ụmụ nwaanyị atọ, zụọkwa ha, ha abụrụ Ndị Kraịst.

Agafeela m afọ iri itoolu. Ma, m ka bụ okenye ọgbakọ. N’ihi ahụ́ e meruchara m n’oge gara aga, ahụ́ na ụkwụ na-egbu m mgbu mgbe ụfọdụ, nke ka nke, ma m gachaa ozi ọma. Ma, m ka kpebisiri ike ịbụ ‘onye agha Kraịst.’—2 Tim. 2:3.