Gaa n'Isiokwu

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Bọlgeria

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Bọlgeria

 Ndịàmà Jehova nọ na Bọlgeria ji oge buru ibu na-akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Chineke na Okwu ya, bụ́ Baịbụl. Kemgbe afọ 2000, ọtụtụ Ndịàmà Jehova esila ná mba ndị ọzọ kwaga Bọlgeria ka ha nye aka kwusaa ozi ọma n’ebe ahụ. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ịna-echegbu mmadụ ma ọ chọọ ịkwaga obodo ọzọ ikwusa ozi ọma? Olee uru ime ya bara? Lee ihe ụfọdụ ndị kwagarala Bọlgeria kwuru.

Kpebie na Ị Chọrọ Ime Ya

 Darren, onye bi n’Ịngland, sịrị: “Kemgbe ụwa, ọ dị mụ na nwunye m n’obi ịkwaga obodo ọzọ ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.’ ’ “Mgbe mụ na nwunye m Dawn lụchara, anyị kwagara Lọndọn ka anyị nye aka kụziere ndị na-asụ asụsụ Rọshịan bi ebe ahụ Baịbụl. E nwere oge ndị anyị gbalịrị ịkwaga obodo ọzọ, ma, e nwere ọtụtụ ihe mere na anyị emelighị ya. Anyị echewedịla na ọ gaghịzi ekwe anyị omume, ma, otu enyi anyị bịara nyere anyị aka. O chetaara anyị na ihe ndị ahụ mere na anyị emelighị ya mgbe ahụ adịghịzi. N’ihi ya, anyị nweziri ike ịkwaga obodo ọzọ otú ahụ anyị bu n’obi ime kemgbe.” Darren na Dawn chọwaziri obodo ha ga-akwagali bụ́ ebe a chọkwuru ndị ga-enye aka kụziere ndị mmadụ Baịbụl. N’afọ 2011, ha kwagara Bọlgeria.

Darren na Dawn

 Ndị kwagara obodo ọzọ ka ha nye aka kwusaa ozi ọma na-enwe ezigbo obi ụtọ. Otú a obi si atọ ha ụtọ na-agbakwa ụfọdụ ndị na-ebubughị n’obi ịga mba ọzọ kwusaa ozi ọma ume ime ka ha. Nwanna nwaanyị Giada na di ya, bụ́ Luca, bi n’Ịtali. Nwanna nwaanyị a, sịrị: “Ahụrụ m ụmụnna ndị kwagara Saụt Amerịka na Afrịka ka ha nye aka kwusaa ozi ọma ebe ahụ. Ụdị obi ụtọ ha na-enwe na ihe ndị ha kọrọ gbasara ozi ha tọrọ m ezigbo ụtọ. Ọ bụ ya nyeere m aka ikpebi ijekwuru Jehova ozi.”

Luca na Giada

 Tomasz na Veronika na ụmụ ha abụọ bụ́ Klara na Mathias si mba Chek Ripọblik kwaga Bọlgeria n’afọ 2015. Gịnị mere ha ji mee ihe a? Tomasz sịrị: “Ọ bụ ihe ndị anyị chọpụtara gbasara ndị ikwu anyị na ndị ọzọ kwagara mba ndị ọzọ maka ikwusa ozi ọma nakwa ihe ndị ha kọọrọ anyị ka anyị chebaara echiche ma kpebie ime ya. Obi ụtọ ha na-enwe ruru anyị n’ahụ́. Anyị na-ekwukwa gbasara ya mgbe ọ bụla n’ezinụlọ anyị.” Tomasz na ndị ezinụlọ ya niile mechara jiri obi ụtọ kwaga Bọlgeria ma na-ekwusa ozi ọma n’otu obodo a na-akpọ Montana.

Klara, Tomasz, Veronika, na Mathias

 Linda bụ Onyeàmà Jehova ọzọ kwagara Bọlgeria. Ọ sịrị: “Ọtụtụ afọ gara aga, agara m Ekwedọ. Mgbe m ruru, m hụrụ ụfọdụ ndị kwagara ebe ahụ ka ha nye aka kwusaa ozi ọma. O mere ka m chewe na mụnwa nwekwara ike ịga nye aka n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.” Petteri na Nadja, bụ di na nwunye si Finland. Ha chebakwaara ihe ndị ọzọ mere echiche. Ha sịrị: “N’ọgbakọ anyị n’ụlọ, e nwere ndị nkwusa ma nke a na-akọ, ndị nwere mgbe ha kwagara n’obodo ọzọ ka ha nwee ike inyere ndị mmadụ aka ka ha mụta eziokwu Baịbụl. Mgbe ọ bụla ha na-akọ akụkọ oge ndị ahụ, ha na-eji obi ụtọ akọ ya. Ha na-ekwu na afọ ndị ahụ ha ji gaa ozi ọma ná mba ọzọ bụ afọ ndị kacha mee ha obi ụtọ ná ndụ ha.”

Linda

Nadja na Petteri

Buru Ụzọ Hazie Onwe Gị

 Ndị chọrọ ịkwaga obodo ọzọ iji nye aka kwusaa ozi ọma kwesịrị ịkwadebe nke ọma. (Luk 14:28-30) Otu Onyeàmà Jehova si Beljọm aha ya bụ Nele kwuru, sị: “Mgbe ọ gụsiwere m agụụ ike ịkwaga obodo ọzọ ka m gaa kwusaa ozi ọma, ekpere m ekpere maka ya, bidokwa ịchọta isiokwu ụfọdụ gbara n’akwụkwọ anyị kwuru banyere ịkwaga obodo ọzọ kwusaa ozi ọma. Agụrụ m ha ọfụma ma gbalịa ka m chọpụta ihe ndị m kwesịrị ime ka m nwee ike ịkwadebe nke ọma.”

Nele (aka nri)

 Kristian na Irmina si Poland ebiela na Bọlgeria ihe karịrị afọ itoolu. Ha so ìgwè na-asụ asụsụ Bọlgeria na-amụ ihe mgbe ha nọ na Poland. Ma, ọ bụzi ugbu a ha nọ na Bọlgeria ka ha hụrụ uru ịmụta asụsụ ahụ baara ha. Ụmụnna nọ n’ìgwè ahụ ha na-esobu amụ ihe gbara ha ume ma nyere ha aka ịmụta asụsụ ahụ. Kristian na Irmina sịrị: “Anyị aghọtala na o nweghị ihe dị ka mmadụ iwepụta onwe ya ijere Jehova Chineke ozi. I mee ya, ị ga-ahụ otú Jehova ga-esi na-egboro gị mkpa gị. Mgbe ọ bụla i ji obi gị niile sị Jehova, ‘Lee m, ziga m,’ ị ga-eme ihe ị na-echeghi na ị ga-emeli.”—Aịzaya. 6:8.

Kristian na Irmina

 Reto na na nwunye ya Cornelia, bụ́ ndị Swizaland, hapụrụ ihe ụfọdụ, gharakwa ịna-ebi ndụ ka ndị aka ji akụ̀ ka ha nwee ike ịhazi onwe, nwetakwa ego ha ga-eji gaa ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Ha kwuru na otu afọ tupu ha akwaga Bọlgeria, ha gara ebe ahụ ma nọọ otu izu iji mara otú ibi ebe ahụ ga-adị. Ha kwukwara na ha na ndị sikwa mba ọzọ bịa n’obodo ahụ kpara nkata, ndị ahụ enyere ha aka ịmata ihe ndị ha kwesịrị ime. Reto na Cornelia mere ihe ndị ahụ tụụrụ ha aro ya. Ugbu a, ha bizi na Bọlgeria na-ekwusa ozi ọma. Ha anọọkwala ebe ahụ ihe karịrị afọ iri abụọ.

Cornelia, Reto na ụmụ ha ndị nwoke abụọ bụ́ Luca na Yannik

Otú Mmadụ Nwere Ike Isi Merie Ihe Ndị Nwere Ike Ịna-echegbu Ya

 Ihe anaghị adịchara ndị kwagara obodo ọzọ ikwusa ozi ọma mfe n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ha ga-amalite ịmụ n’ebe ọhụrụ ahụ ha gara. Ọ ga-ewetụkwa ha oge tupu ebe ahụ amara ha ahụ́. (Ọrụ Ndịozi 16:9, 10; 1 Ndị Kọrịnt 9:19-23) Otu ihe na-esiri ọtụtụ n’ime ha ike bụ ịmụ asụsụ ọhụrụ. Luca anyị kwuburu gbasara ya kwuru, sị: “Isi n’obi anyị aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe na-atọgbu mụ na nwunye m atọgbu. Ma, mgbe anyị bịara n’obodo a, o siiri anyị ezigbo ike ịkwadebe ma zaa otu obere ajụjụ n’asụsụ ndị Bọlgeria. Anyị bịara dị ka ụmụaka ndị ka na-amụ okwu amụ. Azịza ụmụaka ndị Bọlgeria na-aza n’ọmụmụ ihe kadị nke anyị mma okpukpu iri.”

 Ravil si Jamanị kwuru, sị: “Ịmụ asụsụ ndị Bọlgeria gwụrụ m ike. Ma, m nọ na-agwa onwe m, sị, ‘Tinyere ya obiọma. Egbula onwe gị ma ị sụtaghị ya.’ Anaghị m ele ịmụ asụsụ ahụ anya ka nsogbu, kama, m weere ya ka otu ụzọ m si ejere Jehova ozi dị nsọ.”

Ravil na Lilly

 Linda anyị kwuburu gbasara ya sịrị: “Ịmụ asụsụ ọhụrụ anaghị amasị m. Asụsụ ndị Bọlgeria adịghị mfe mmụta. E nweekwala ọtụtụ ugboro ike ịmụ ya chọrọ ịgwụ m. Ọ ga-adị mmadụ ka ọ̀ bụ naanị ya nọ n’ụwa ma ọ bụrụ na ọ naghị agwali ndị mmadụ okwu nakwa ma ọ bụrụ na ọ naghị aghọta ihe ha na-ekwu. Ihe na-enyere m aka ka mụ na Jehova dịrị ná mma bụ ịmụ ihe niile m chọrọ ịmụ n’asụsụ Swidish. Ma, ezigbo ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwaanyị nyeere m aka. M mechara mụta asụsụ ahụ.”

 O nwekwara mgbe ụfọdụ agụụ ịlaru ụlọ na-adị agụ ndị kwagara mba ọzọ. Ndị ahụ kwagara mba ọzọ na-ahapụ ndị enyi ha na ikwu na ibe ha n’obodo ha. Eva, onye ya na di ya Yannis kwagara Bọlgeria, kwuru, sị: “Owu nọ na-ama m mgbe anyị bịara ebe a ọhụrụ. Ihe nyeere m aka n’oge ndị ahụ bụ na mụ na ndị enyi m nọ n’ụlọ na ndị ezinụlọ anyị na-adị akparịta mgbe niile. Anyị emetekwala ndị enyi ọhụrụ n’ebe a.”

Yannis na Eva

 E nwekwara ihe ndị ọzọ nwere ike ịna-echu ndị kwagara mba ọzọ ụra. Robert na nwunye ya Liana, bụ́ ndị si Swizaland kwaga Bọlgeria, kwuru, sị: “Ịmụta asụsụ ndị obodo a na omenala ha siiri anyị ezigbo ike. Anyị ejighịkwa ihe ndị anyị ga-eji na-achụ oyi bịa n’ihi na ebe a na-atụ ezigbo oyi.” Ma, ihe nyeere di na nwunye a aka ịna-eje ozi ọma ha na Bọlgeria bụ itinyere onwe ha obiọma na ịghara ịna-echegbu onwe ha. Ha ekwusaala ozi ọma n’obodo ahụ afọ iri na anọ.

Robert na Liana

Uru Ịkwaga Mba Ọzọ Bara

 Lilly kwuru na ịga nye aka n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma bara ezigbo uru. O kwuru, sị: “Ihe a m mere emeela ka m matakwuo Jehova otú m na-agaaraghị amata ya ma a sị na m nọ n’obodo m na-eje ozi. M na-ejikwu oge buru ibu enyere ndị ọzọ aka. Ọ na-eme ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma, na-eme m obi ụtọ, na-emekwa ka ndụ m nwee isi.” Di ya Ravil kwetara na ihe a nwunye ya kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ozi a anyị na-eje bụ ihe kacha mma mmadụ kwesịrị iji ndụ ya eme. Ọ na-eme ka mmadụ mata ụmụnna ndị ọzọ si ná mba dị iche iche, ndị ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi, ndị bụ́kwa aka ochie n’ịkụziri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl. Amụtala m ọtụtụ ihe n’aka ha.”

 Otú a ọtụtụ ndị si na-ewepụta onwe ha ijere Chineke ozi emeela ka a na-ekwusa “ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa.” (Matiu 24:14) Ndị niile wepụtara onwe ha ma kwaga Bọlgeria ahụla otú Jehova si meere ha ihe niile obi ha chọrọ, meekwa ka ihe niile ha bu n’obi ime gaziere ha.—Abụ Ọma 20:1-4.