Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkume Dị́ Ịtụnanya

Nkume Dị́ Ịtụnanya

Otu akwụkwọ a na-akpọ Nature’s Building Blocks kwuru, sị: ‘Kabọn bara uru ná ndụ karịa ihe ọ bụla ọzọ.’ Otú kabọn dị na-eme ka ọ dị mfe ya na ihe ndị ọzọ ịgwakọta. Ọ bụ ya mere e ji nwee ọtụtụ ihe kabọn dị n’ime ya. A na-achọpụtakwa ọtụtụ ihe ọhụrụ ndị ọ dị na ha, na-ejikwa ya emepụta ọtụtụ ihe.

Ihe ndị a kọwara n’okpuru ebe a gosiri na irighiri kabọn nwekwara ike ịhazi onwe ha n’ụzọ dị iche iche. Ha nwere ike ịdị ogologo, gburugburu ma ọ bụkwanụ mbadamba. N’eziokwu, kabọn dị ịtụnanya.

DAYAMỌND

Ụmụ irighiri kabọn nwere otú ha nwere ike isi hazie onwe ha, ha esie ezigbo ike ghọzie dayamọnd. Dayamọnd bụ ihe kacha sie ike a chọpụtarala n’ụwa. Ezigbo dayamọnd na-enwe otu mọlekụl kabọn.

GRAFAỊT

Ọ bụrụ na ụmụ irighiri kabọn ahazie onwe ha ka ha dịrị mbadamba mbadamba, nke ọ bụla adịrị n’elu ibe ya, ọ na-aghọ grafaịt. A na-eji grafaịt emepụta mmanụ a na-atụ n’ígwè ọrụ, jirikwa ya emepụta pensụl.

GRAFỊN

Ọ bụrụ na ụmụ irighiri kabọn ahazie onwe ha ka ha dị mbadamba, nwee akụkụ isii, ọ na-aghọ grafịn. Grafịn na-esi ezigbo ike karịa ígwè. A dọtịa grafịn na ígwè, ígwè na-ebu grafịn ụzọ adọbi. E jiri pensụl kaa ihe, ihe ahụ akara nwere ike inwe grafịn ole na ole n’ime ya.

FULARIN

Ihe a bụ mọlekụl kabọn ndị nwere oghere n’ime ha. Ụfọdụ n’ime ha dị gburugburu, ndị ọzọ adịrị ogologo.

IHE NDỊ DỊ NDỤ

Kabọn dị ná mkpụrụ ndụ dị n’ime ihe niile dị ndụ, ma osisi, ma ụmụ anụmanụ ma ụmụ mmadụ. Kabọn dịkwa ná nri dị iche iche anyị na-eri.

“Àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ . . . n’ihe ndị e kere eke.”Ndị Rom 1:20.