Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ụzọ Ọhụrụ E Si Akụzi Ihe”

“Ụzọ Ọhụrụ E Si Akụzi Ihe”

SOO-JEONG, bụ́ onye nkụzi na-enye ụmụ akwụkwọ ndụmọdụ n’otu ulọ akwụkwọ sekọndrị dị na Saụt Koria, ejirila vidio ndị dị na jw.org kụziere ụmụ akwụkwọ ya ihe. Ọ sịrị: “Ụmụ akwụkwọ ahụ mere ihe tụrụ m n’anya mgbe ha lechara vidio aha ya bụ Olee Otú E Si Amata Ezigbo Enyi? Ha kwuru, sị: ‘Anyị esitụbeghị otú a chee gbasara imeta enyi. Otú a e si kụziere anyị ihe a magburu onwe ya.’ Ụfọdụ n’ime ha sị na ha ga-aga na jw.org mgbe ọ bụla ha chọrọ ịmata ihe ha ga-eme.” Soo-jeong kwukwara, sị: “Agwala m ndị nkụzi ibe m ka ha were vidio ahụ na-akụzi ihe. Ha na-enwekwa obi ụtọ iji ya akụziri ụmụ akwụkwọ ha ihe.”

Vidio ọzọ nyeerela ọtụtụ ụmụ akwụkwọ nọ na Saụt Koria aka bụ katuun a na-ese na bọọdụ nke isiokwu ya bụ Otú Ị Ga-esi Emeri Onye Na-achọ Gị Okwu n’Emetụghị Ya Aka. Otu onye nkụzi na-arụ n’ebe a na-akpọ Juvenile Violence Prevention Foundation gosiri ya ụmụ akwụkwọ ya. O kwuru, sị: “Ihe mere katuun a ji amasịkarị ọtụtụ ndị na-eto eto bụ n’ihi otú e si ese ihe ndị a na-egosi na ya. Ọ na-akụzikwara ha ihe ha ga-eme ma mmadụ chọwa ha okwu na ihe ha ga-eme iji gbochie mmadụ ịchọ ha okwu.” Ụlọ ọrụ ahụ nataziri ikike iji vidio ahụ na-akụzi ihe. Ha na-eji ya akụziri ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ihe. Ndị uwe ojii na-ejikwa vidio ndị dị na jw.org enyere ndị mmadụ aka.

Ọ bụrụ na ị gatụbeghị na jw.org/ig, biko gbalịa gaa. Ọ dị mfe ịchọta ihe na ya. Ị gaghị akwụ ụgwọ iji danloduo ihe ndị a na-egere egere, vidio, Baịbụl na ihe ndị ọzọ dị na ya.