Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

Mgbe Di ma Ọ Bụ Nwunye Mmadụ Kwara Iko

Mgbe Di ma Ọ Bụ Nwunye Mmadụ Kwara Iko

Ọtụtụ ndị ma na ịkwa iko adịghị mma, ma ọ ka na-etisa ọtụtụ ezinụlọ.

E kwuo na di ma ọ bụ nwunye mmadụ kwara iko, gịnị ka ọ pụtara?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ na-ekwu na o nweghị ihe ọjọọ dị na mmadụ ịgba n’èzí, nke ka nke, ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ nwoke. E nwekwara ndị nke na-ekwu na mmadụ nwedịrị ike ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbe ọ bụla ọ sọrọ ya.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na mmadụ ahapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya, ya na onye ọzọ enwee mmekọahụ, ọ kwaala iko. (Job 24:15; Ilu 30:20) Chineke kpọrọ ụdị omume a asị. N’oge ochie, ndị Izrel na-egbu onye ọ bụla mere ụdị ihe a. (Levitikọs 18:20, 22, 29) Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịkpọ ụdị omume a asị.—Matiu 5:27, 28; Luk 18:18-20.

IHE MERE NA Ọ BỤGHỊ OBERE OKWU

Ụbọchị nwoke na nwaanyị gbara akwụkwọ, ha kwere ibe ha nkwa. Ọ bụrụ na otu onye n’ime ha akwaa iko, o mezughị nkwa ahụ o kwere. Onye mere ụdị ihe a ‘emehiekwala Chineke.’ (Jenesis 39:7-9) Mmadụ hapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya gaa kwaa iko, o nwere ike ime ka ha na ụmụ ha ghara ịna-emekọ ihe. Ihe ọzọ bụ na Baịbụl kwuru na “Chineke ga-ekpe . . . ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.”—Ndị Hibru 13:4.

“Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ.”Ndị Hibru 13:4.

Mmadụ ò nwere ike ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm maka na ọ kwara iko?

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na mmadụ nwere ike ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm ma ọ bụrụ na ọ kwara iko. (Matiu 19:9) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụ na mmadụ akwaa iko, ọ bụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ga-ekpebi ma ọ̀ ga-agbaghara ya ka ọ̀ ga-agba ya alụkwaghịm. Ọ bụghị onye ọzọ ga-agwa ya ihe ọ ga-eme.—Ndị Galeshia 6:5.

Ma, anyị ga-echeta na Chineke ejighị alụmdi na nwunye egwu egwu, ọ chọghịkwa ka ihe ọ bụla tisaa di na nwunye. (1 Ndị Kọrịnt 7:39) Obi agaghị adị Chineke mma ma ọ bụrụ na mmadụ ejiri maka ihe na-enweghị isi na ọdụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. O doro anya na ịgba alụkwaghịm abụghị ihe e ji egwuri egwu.—Malakaị 2:16; Matiu 19:3-6.

“Ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko, ọ na-eme ya ka ọ bụrụ onye nwere ike ịdaba n’ịkwa iko.”Matiu 5:32.

Di ma ọ bụ nwunye kwaa iko, ò meela mmehie na-enweghị mgbaghara?

IHE BAỊBỤL KWURU

Mba. Baịbụl kwuru na Chineke ga-agbaghara onye ọ bụla chegharịrị ma chigharịa ná mmehie ya. Ọ ga-agbagharakwa di ma ọ bụ nwunye kwara iko ma ọ bụrụ na o chegharịa. (Ọrụ Ndịozi 3:19; Ndị Galeshia 5:19-21) Baịbụl kwuru gbasara ndị na-akwabu iko, ha emechaa kwụsị ya ma ghọọ ndị enyi Chineke.—1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.

Ihe Chineke mere mgbe Eze Devid mere mmehie gosiri na ọ na-emere ndị chegharịrị ná mmehie ha ebere. Devid na nwunye otu n’ime ndị ọchịagha ya kwara iko. (2 Samuel 11:2-4) Baịbụl kwuru na “ihe Devid mere dị njọ n’anya” Chineke. (2 Samuel 11:27) Devid rịọrọ mgbaghara mgbe a dọrọ ya aka ná ntị, Chineke agbaghara ya. Ma, Devid ji isi ya buru ihe o kotere. (2 Samuel 12:13, 14) Eze Sọlọmọn mechara kwuo na “onye ọ bụla . . . na-akwa iko enweghị uche.”—Ilu 6:32.

IHE I NWERE IKE IME

Ọ bụrụ na ị kwara iko, rịọ Chineke mgbaghara, rịọkwa di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara. (Abụ Ọma 51:1-5) Kpọọ ịkwa iko asị otú ahụ Chineke kpọrọ ya. (Abụ Ọma 97:10) Adịla na-ekiri ndị gba ọtọ ma ọ bụ na-echekarị gbasara inwe mmekọahụ. Achụla nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Zerekwa ihe ọ bụla nwere ike ime ka i chewe echiche otú gị na onye na-abụghị di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-esi nwee mmekọahụ.—Matiu 5:27, 28; Jems 1:14, 15.

Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwara iko, echefula na Chineke ma otú obi dị gị. (Malakaị 2:13, 14) Rịọ ya ka ọ kasie gị obi ma nyere gị aka, ọ “ga-akwadokwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) I kpebie na ị ga-agbaghara di gị ma ọ bụ nwunye gị, unu abụọ ga-agba ezigbo mbọ ka ịhụnanya unu dị otú ọ dị ná mbụ.—Ndị Efesọs 4:32.

Devid chegharịrị mgbe ya na nwunye mmadụ kwara iko. N’ihi ya, Netan onye amụma gwara ya, sị: ‘Jehova emewo ka mmehie gị gabiga.’2 Samuel 12:13.