Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Jụọ Gị Ajụjụ Gbasara Ọnwụ

Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Jụọ Gị Ajụjụ Gbasara Ọnwụ

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

Weregodị ya na nwa gị dị afọ isii bịakwutere gị jụọ gị ma ị̀ ga-emecha nwụọ. I nwere ike ịjụwa onwe gị ma nwa gị ahụ ò toruola ịma ihe ọnwụ bụ. I nwekwara ike ichewe otú kacha mma ị ga-esi kọwaara ya ihe ọ bụ.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ụmụaka na-eche gbasara ọnwụ. Ụfọdụ na-abụ ha na-egwu egwu, ha emee ka hà anwụọla. N’ihi ya, i kwesịghị ichewe na nwa gị ekwesịghị ịma ihe ọ bụla gbasara ọnwụ. Wetuo obi kọwaara ya ihe ọ bụla ọ jụrụ gị gbasara ọnwụ. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ọ ga-enyere ya aka idi ọnwụ onye ọ bụla.

Ịkọrọ nwa gị gbasara ọnwụ agaghị eme ka ọ tụwa ụjọ na-enweghị isi na ọdụ. Kama, ọ ga-eme ka ụjọ pụọ ya n’ahụ́. Ma, e nwere ihe ụfọdụ ụmụaka na-aghọtahie gbasara ọnwụ. I kwesịrị inyere nwa gị aka ka ọ ghọta ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na ọtụtụ ụmụaka na-erubeghị afọ isii na-eche na onye nwụrụ anwụ anwụchabeghị. Ọ bụ ya mere ụmụaka ụfọdụ ji eme ha na-egwu egwu, ha ana-eme ka hà anwụọla, ma ọ naghị anọ ọdụ ha ebilite.

Ma, ka ha na-etolite, ha na-aghọtawa na ọnwụ abụghị okwu egwuregwu. N’ihi ya, ha nwere ike ịmalite jụwa ajụjụ, chegbuwe onwe ha, ma ọ bụkwanụ tụwa ụjọ ma onye ha ma nwụọ. Ọ bụ ya mere na i kwesịghị ịgbara okwu gbasara ọnwụ ọsọ. Otu dọkịta kwuru, sị: “Nwatakịrị ga na-echegbu onwe ya gbasara ọnwụ ma ọ bụrụ na a naghị ekwe ya kwuo gbasara ya n’ụlọ ha.”

I kwesịghị ịna-echegbu onwe gị gbasara ihe ị ga-ekwu. Otu nchọpụta e mere gosiri na naanị ihe ụmụaka chọrọ bụ ka e jiri olu ọma gwa ha nke bụ́ eziokwu. Buru n’obi na nwatakịrị agaghị anọkata jụwa gị ajụjụ ma ọ bụrụ na ihe ahụ ọ na-ajụ gị adịghị ya mkpa.

IHE I NWERE IKE IME

Jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ kọwaara ya ihe ọnwụ bụ. Ọ bụrụ na gị na nwa gị na-aga n’ụzọ, unu ahụ ọkụkọ ma ọ bụ anụmanụ ọzọ nwụrụ anwụ, jụọ ya ajụjụ ga-eme ka ọ gwa gị obi ya. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịjụ ya, sị: “Ọkụkọ a nwụrụ anwụ ọ̀ na-ata ahụhụ? Oyi ọ̀ na-atụ ya? Agụụ ọ̀ na-agụ ya? Olee otú ị ga-esi ama na anụmanụ ma ọ bụ mmadụ anwụọla?”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 3:1, 7.

Gwa ya nke bụ́ eziokwu. Ọ bụrụ na onye ikwu unu ma ọ bụ onye ọzọ nwa gị ma anwụọ, agwala ya na e nwere ebe onye ahụ gara. Ị gwa ya ụdị ihe a, o nwere ike ichewe na onye ahụ ga-alọta n’oge na-adịghị anya. Kama ịgwa ya otú ahụ, gwa ya ihe ga-eme ka ọ ghọta ihe ị na-ekwu ozugbo. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ya, sị: “Mgbe ahụ mama m nwụrụ, ihe niile dị ya n’ahụ́ kwụsịrị ịrụ ọrụ. Anyị enweghị ike ịgwa ya okwu. Ma, anyị agaghị echefu ya.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Efesọs 4:25.

Ebe ọ bụ na nwatakịrị nwere ike ịna-eche na ọnwụ na-efe efe, mee ka obi sie ya ike na ọnwụ anaghị efe efe

Mee ka ọ ghọta na ọ bụghị ya mere onye ahụ ji nwụọ. Mmadụ nwụọ, nwa gị nwere ike ịna-eche na o nwere ihe ya mere kpatara onye ahụ ji nwụọ. Kama ịgwa ya naanị na ọ bụghị ya mere onye ahụ ji nwụọ, i nwere ike ịjụ ya, sị, “Gịnị mere i ji chee na ọ bụ gị mere o ji nwụọ?” Gee ya ntị nke ọma. Ewerekwala ihe ọ bụla o kwuru ka okwu ụmụaka. Ebe ọ bụ na ụmụaka nwere ike ịna-eche na ọnwụ na-efe efe, mee ka obi sie ya ike na ọnwụ anaghị efe efe.

Mee ka o kwuo obi ya. Kọọrọ ya gbasara ndị ikwu na ibe unu nwụrụla anwụ, ma ndị nke ọ na-amaghị. I nwere ike ịgwa ya gbasara otu onye n’ime ha na ihe onye ahụ mere mgbe ọ dị ndụ nke ọ na-abụ i cheta, obi ana-atọ gị ụtọ. Ọ bụrụ na ị na-ekwu gbasara ha, ọ ga-eme ka nwa gị ghọta na o nweghị ihe ọjọọ dị n’ikwu gbasara ndị ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ịna-eche gbasara ha. Ma, ọ bụrụ na nwa gị achọghị ikwu ihe o bu n’obi, ejila ike eme ka o kwuo ya. Ị ka nwere ike ikwulite ya n’oge ọzọ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 20:5.

Akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, isi nke 34 na nke 35 nwere ike inyere ụmụ gị aka ịmụta ihe Baịbụl na-akụzi gbasara ọnwụ. Ị gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa ebe e dere AKWỤKWỌ NA BROSHỌ