Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ike Ya Agwụla M!”

“Ike Ya Agwụla M!”

“Ike Ya Agwụla M!”

Ụlọ a adịghị mma n’anya n’ihi na e leghaara ya anya. Oké ifufe na oké mmiri ozuzo akpaala ya aka ọjọọ kemgbe ọtụtụ afọ. Ugbu a ike agwụla ya, o yikwara ihe ga-ada taa na echi.

OTÚ ahụ ụlọ ahụ dị bụ otú ọtụtụ alụmdi na nwunye taa dị. Ò nwere mgbe ọ na-adị gị ka alụmdi na nwunye gị ọ̀ na-aga itisa? Ya bụrụ na o nwere, obi amapụla gị n’ihi na o nweghị di na nwunye na-anaghị enwe nsogbu. Baịbụl kwudịrị hoo haa na ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe “ọtụtụ nsogbu.”—1 Ndị Kọrịnt 7:28, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

Iji gosi na ihe ahụ Baịbụl kwuru bụ eziokwu, mmadụ atọ ndị na-eme nnyocha kwuru na alụmdi na nwunye bụ “ihe kacha ebutere ụmụ mmadụ nsogbu, ọ bụkwa ihe ọtụtụ ndị na-etinye isi na ya n’oge anyị a.” Ha kwukwara, sị: “Alụmdi na nwunye e ji obi ụtọ bido, nke a tụkwara anya na ọ ga-adịgide otú ahụ, nwere ike ịghọ ihe kacha agbawa obi na ihe kacha akpata mwute ná ndụ.”

Olee otú alụmdi na nwunye nke gị dị? Ná nsogbu ndị a e dere n’okpuru ebe a, ò nwere otu n’ime ha ma ọ bụ karịa nke na-akpa ya aka ọjọọ?

● Ịrụkarị ụka

● Okwu ọjọọ

● Ịgba n’èzí

● Ibu iwe n’obi

Ọ bụrụ na alụmdi na nwunye gị dị ka ụlọ ahụ ike gwụrụla, nke yikwara ka ọ̀ ga-ada taa na echi, gịnị ka i kwesịrị ime? Ọ̀ bụ ịgba alụkwaghịm ga-ebi nsogbu unu?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 3]

‘IHE MMADỤ OLE NA OLE NA-EMEBU NKE GHỌRỌ IHE ỌTỤTỤ NDỊ NA-EME’

Ná mba ụfọdụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm bụzi ájá. Ka anyị were mba Amerịka mee ihe atụ. Ọtụtụ afọ gara aga, ọ na-esi ike ịhụ di na nwunye gbara alụkwaghịm. Babra Dafoo Waịthed dere n’akwụkwọ ya nke kwuru banyere ịgba alụkwaghịm na mgbe afọ 1960 gachara, “ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm rịrị elu n’ụdị dị egwu.” Ọ sịrị: “N’ihe na-erughị afọ iri, ọnụ ọgụgụ ndị na-agba alụkwaghịm mụbara okpukpu abụọ, ọ nọgidekwara na-arị elu ruo ihe dị ka afọ 1984. N’oge ahụ, ọ rịrị elu otú ọ na-arịtụbeghị mbụ ná mba ndị mepere emepe, ọ rịtukwaghị arịtu. N’ihi otú ịgba alụkwaghịm si rịa elu ngwa ngwa n’Amerịka n’arịtughị arịtu, n’ime afọ iri atọ, o sizi n’ihe mmadụ ole na ole na-eme ghọọ ihe ọtụtụ ndị na-eme.”