Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

BalanceFormcreative/iStock via Getty Images Plus

Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Owu Kwụsị Ịna-ama Gị​—Ihe Baịbụl Kwuru

Na-enyere Ndị Ọzọ Aka Ka Owu Kwụsị Ịna-ama Gị​—Ihe Baịbụl Kwuru

 Owu na-ama ọtụtụ ndị ebe niile n’ụwa, ha ana-echekwa na ha agaghị emetali ndị ọzọ enyi. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na inyere ndị ọzọ aka bụ otu ụzọ mmadụ nwere ike isi kwụsị owu ịma ya.

  •   Òtù Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike n’Amerịka kwuru, sị: “Inyere ndị nọ ná mkpa aka nwere ike ime ka ndụ anyị nwee isi, ọ na-enyekwara ndị na-eche na owu na-ama ha ma ọ bụ na ha agaghị emetali ndị ọzọ enyi aka ịkwụsị iche otú ahụ.”

 Baịbụl kwuru ihe ndị bara uru anyị nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka. Ime ihe ndị o kwuru nwere ike inyere anyị aka ime ka owu kwụsị ịma anyị.

Ihe i nwere ike ime

 Na-emesapụ aka. Na-achọ ohere gị na ndị ọzọ ga-eji na-anọrị, karịchaa ihu na ihu. Gbaakwa mbọ na-enyetụ ndị ọzọ ihe ndị i nwere. I mee otú ahụ, ọ ga-abụrịrị na ha ga-ekele gị, gị na ha nweziri ike isi otú ahụ bụrụ enyi.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.”​—Luk 6:38.

 Na-emere ndị ọzọ ihe. Na-achọ ohere ị ga-eji nyere ndị ihe na-esiri ike aka. Otu ụzọ i nwere ike isi mee ya bụ iwetu obi gee ha nnọọ ntị ma ọ bụkwanụ iwepụta onwe gị meere ha ihe ga-eme ka ihe dịtụrụ ha mfe.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya.”​—Ilu 17:17.

 Ị chọọ ịmatakwu otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-adịkwu ná mma, gụọ isiokwu bụ́ “Ezinụlọ na Ndị Enyi.”