Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU NKE 5

Otú Gị na Ndị Ọgọ Gị ma Ọ Bụ Ndị Be Di Gị Ga-esi Na-adị n’Udo

Otú Gị na Ndị Ọgọ Gị ma Ọ Bụ Ndị Be Di Gị Ga-esi Na-adị n’Udo

“Yirinụ . . . obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.”—Ndị Kọlọsi 3:12

Nwoke na nwaanyị lụọ, ha amalitela ezinụlọ nke ha. N’agbanyeghị na ha kwesịrị ịna-akwanyere nne ha na nna ha ùgwù, hụkwa ha n’anya, ebe obi onye nke ọ bụla kwesịrị ịkacha dịrị bụ n’ebe di ya ma ọ bụ nwunye ya nọ. Otú ha sizi eme nwere ike ghara ịdị ndị ezinụlọ ha mma. Ma, ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere ha aka ka ha na ndị ezinụlọ ha ghara ịna-ese okwu, hanwa ana-ebikwa n’udo.

1 ACHỤFULA NDỊ ỌGỌ GỊ MA Ọ BỤ NDỊ EZINỤLỌ DI GỊ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Ndị Efesọs 6:2) N’agbanyeghị afọ ole ị dị, i kwesịrị ịna-asọpụrụ nne gị na nna gị. Chetakwa na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwesịkwara ịna-akwanyere nne ya na nna ya ùgwù. Baịbụl kwuru na “ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.” N’ihi ya, echela na di gị ma ọ bụ nwunye gị agaghịzi ahụ gị n’anya ma ị hụ otú o si emeso ndị ezinụlọ nke ha.—1 Ndị Kọrịnt 13:4; Ndị Galeshia 5:26.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Gbalịa ka ị ghara ịna-ekwu ihe dị ka “Ndị ezinụlọ unu ejighị m kpọrọ ihe” ma ọ bụ “O nweghị ihe m na-eme na-adị mama gị mma”

  • Gbalịa ghọta ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị bu n’obi

2 GWA HA IHE UNU CHỌRỌ

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.’ (Jenesis 2:24) Mmadụ lụọ di ma ọ bụ nwunye, nne ya na nna ya nwere ike iche na ha ka kwesịrị ịna-agwa ya ihe ọ ga na-eme, ha nwere ike ịchọ ịna-ama ihe niile na-eme n’etiti ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya.

Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nọdụ ala kwuo ihe unu ga-achọ ka ha na-etinye anya na ha na ihe unu na-agaghị achọ ka ha na-etinye anya. Unu kwuchaa ya, wetuonụ obi gwa ha ihe unu kwutere. Unu nwere ike ịgwa ha ya hoo haa. Ma, unu ekwesịghị ịgwa ha okwu otú ga-egosi na unu ejighị ha kpọrọ ihe. (Ilu 15:1) Ọ bụrụ na unu adị umeala n’obi, dịkwa nwayọọ, unu ‘ga-eji ịhụnanya na-edi’ ihe ọ bụla ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mere unu, unu na ha ga-adịkwa ná mma.—Ndị Efesọs 4:2.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Ọ bụrụ na otú ndị ezinụlọ di gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ nwunye gị si etinye anya n’ihe gbasara unu adịghị gị mma, gakwuru di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbe obi jụụrụ gị ka unu kpaa banyere ya

  • Kpebienụ ihe unu ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị ezinụlọ di gị ma ọ bụ ndị ezinụlọ nwunye gị na-etinye anya n’ihe gbasara unu otú unu na-achọghị