Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 9

M̀ Kwesịrị Ikwere na E Keghị Mmadụ Eke?

M̀ Kwesịrị Ikwere na E Keghị Mmadụ Eke?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na e keghị mmadụ eke, ọ pụtara na ndụ enweghị isi na ọdụ. Ọ bụrụ na e kere mmadụ eke, anyị ga-amatali azịza ajụjụ ndị na-echu anyị ụra banyere ndụ na ihe ga-eme n’ọdịnihu.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: Alex amaghị ihe ọ ga-eme eme. O kweere kemgbe na Chineke dị nakwa na e kere mmadụ eke. Ma, taa, onye na-akụziri ha ihe ọmụmụ bayọlọji kụziiri ha na e keghị mmadụ eke, na ọ bụ ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala. Alex achọghị ka ndị ọzọ lee ya anya ka onye iberiibe. Ọ gwara onwe ya, sị: ‘A sị kwuwe, ọ bụrụ na ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala na e keghị mmadụ eke, ọ̀ bụzi mụnwa ga-arụwa ha ụka?’

Ọ bụrụ na ị bụ Alex, ị̀ ga-ekweta na e keghị mmadụ eke naanị n’ihi na e nwere akwụkwọ sayensị ndị kwuru na ọ bụ eziokwu?

CHEGODỊ ECHICHE

Ọtụtụ mgbe, ọ na-adịrị ndị mmadụ mfe ikwu na ha kweere na e kere mmadụ eke ma ọ bụ na ha ekweghị. Ma ha amaghị ihe mere ha ji kwere ma ọ bụ ghara ikwere.

  • Ụfọdụ ndị kweere na e kere mmadụ eke naanị n’ihi na ọ bụ ihe a kụziiri ha na chọọchị.

  • Ụfọdụ ndị kweere na e keghị mmadụ eke naanị n’ihi na ọ bụ ihe a kụziiri ha n’ụlọ akwụkwọ.

AJỤJỤ ISII Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

Baịbụl kwuru, sị: “Ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ dabara adaba?

Ikwu na e keghị mmadụ eke dị ka ikwu na o nweghị onye rụrụ ụlọ a. Ọ dabaghị adaba

IHE ỤFỌDỤ NDỊ KWURU: Eluigwe na ụwa pụtara na mberede n’ihi otu nnukwu ihe gbawaranụ.

1. Ònye ma ọ bụ gịnị mere ka otu nnukwu ihe ahụ gbawaa?

2. Olee nke na-ada ka ihe mere eme? Ọ̀ bụ ikwu na ihe niile nọkatara pụta, ka ọ̀ bụ ikwu na e nwere onye kere ha?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ KWURU: Ndị mmadụ si n’ụmụ anụmanụ pụta.

3. Ọ bụrụ na mmadụ si n’enwe ma ọ bụ n’anụmanụ ọzọ pụta, gịnị mere e ji nwee ezigbo ihe dị́ iche n’otú ụmụ mmadụ si eche echiche na otú enwe si eche echiche?

4. Gịnịzi mere ihe ndị dị́ ndụ ji dị́ oké mgbagwoju anya, ma ihe ndị yiri ka o nweghị ihe ha bụ?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ KWURU: Ndị sayensị achọpụtala ihe gosiri na e keghị mmadụ eke.

5. Onye na-ekwu ihe a ò jirila aka ya chọpụta na e keghị mmadụ eke?

6. Ị̀ ma na ọtụtụ ndị kweere na e keghị mmadụ eke naanị n’ihi na a gwara ha na ndị niile ma ihe kweere na ya?

Otu nwa agbọgho aha ya bụ Julia sịrị: “Ọ bụrụ na ị na-aga n’ọhịa hụ ọmarịcha ụlọ, ị̀ ga-echewe, sị: ‘Ụlọ a amagbuola onwe ya. Ọ ga-abụrịrị na osisi ndị a dara, hazichaa onwe ha, ghọọ ụlọ a.’ Mbanụ. Ichewe otú ahụ adabaghị adaba. Gịnịzi mere anyị ga-eji kwere na ihe niile dị́ n’ụwa ji aka ha pụta?”

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Gwen sịrị: “Ka e were ya na mmadụ gwara gị na n’ụlọ ọrụ na-ebi akwụkwọ, otu ebe a wụnyere ịnk gbawara, ịnk efesachaa ma n’ahụ́ ụlọ ma n’uko ụlọ, ghọọ nnukwu akwụkwọ ọkọwa okwu. Ị̀ ga-ekweta?”

GỊNỊ MERE Ị GA-EJI KWERE NA CHINEKE DỊ?

Baịbụl kwuru na i kwesịrị iji ‘ike iche echiche gị’ na-ekpebi ihe ị na-eme. (Ndị Rom 12:1) Ọ pụtara na i kwesịghị ikwere na Chineke dị naanị maka na ọ bụ

  • IHE OBI GỊ GWARA GỊ (Obi m na-agwa m na a ga-enwerịrị onye ike ya karịrị ike onye ọ bụla)

  • IHE NDỊ ỌZỌ KWEERE (M bi n’ebe ọtụtụ ndị kweere na Chineke dị)

  • IHE A KỤZIIRI GỊ (Papa m na mama m kụziiri m ka m kwere na Chineke dị. M̀ ga-emekwanụ gịnị?)

Kama ikwere n’ihi ihe ndị a, i kwesịrị ịmata ihe mere i ji kwere na Chineke dị.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Teresa sịrị: “Ọ na-abụ m nọrọ na klas na-ege onye nkụzi anyị ntị mgbe ọ na-akọwa otú ahụ́ anyị si arụ ọrụ, obi na-esi m ike na Chineke dị. Ihe ndị dị́ n’ahụ́ anyị nwere ihe ha na-arụ, ma nke kacha arụ obere ọrụ. Ọtụtụ mgbe, anyị anaghị ama mgbe ha na-arụ ọrụ ndị ahụ. N’eziokwu, otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ dị ezigbo mgbagwoju anya.”

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Richard sịrị: “M hụ ụlọ elu dị́ ezigbo elu, ụgbọ mmiri ma ọ bụ ụgbọala, m na-ajụ onwe m, sị: ‘Ònye rụrụ ihe a?’ Dị ka ihe atụ, ọ bụ amamihe ka e ji arụ ụgbọala, n’ihi na ọtụtụ obere ihe e ji rụọ ya kwesịrị ịna-arụ ọrụ nke ọma tupu ụgbọala arụwa ọrụ. Ebe ọ bụ mmadụ na-arụ ụgbọala ndị a, ọ pụtara na e nwere onye kere anyị.”

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Anthony sịrị: “Ka m na-amụkwu gbasara sayensị, o sikwuuru m ike ikweta na e keghị ihe niile eke.” O kwukwara na o siri ike ikwere na e keghị mmadụ eke karịa ikwere na e nwere Onye kere ihe niile.

IHE Ị GA- ECHEBARA ECHICHE

N’agbanyeghị ọtụtụ afọ ndị ọkà mmụta sayensị jirila mee nchọnchọ, ha niile ekwekọrịtabeghị n’ihe ha na-ekwu na e keghị mmadụ eke. E weere na ndị ọkà mmụta sayensị bụ ndị ọkachamara. Ma ebe ọ bụ na ha ekwekọrịtaghị n’ihe ha na-ekwu, ọ̀ dị njọ ma gịnwa ghara ikwere na e keghị mmadụ eke?