Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ

Mụta ezigbo ndụmọdụ na aro ndị ga-eme ka ihe gaziere gị.

AJỤJỤ NKE 1

Olee Ụdị Onye M Bụ?

Ịmata ihe ndị ị ga-emeli, ihe ndị ị na-anaghị emeta na ihe ndị ị chọrọ ime ga-enyere gị aka ma e nyewe gị nsogbu ka i mee ihe ọjọọ.

AJỤJỤ NKE 2

Gịnị Mere Otú M Dị Ji Echu M Ụra?

Obi ọ̀ na-ajọ gị njọ ma i lee onwe gị n’enyo? Olee ihe ndị i nwere ike ime ka ị dịkwuo mma nanya?

AJỤJỤ NKE 3

Olee Otú M Ga-esi Na-agwa Papa M na Mama M Okwu?

Ihe ndị e kwuru ebe a ga-eme ka ọ dịkwuoro gị mfe ịgwa papa gị na mama gị okwu.

AJỤJỤ NKE 4

Olee Otú M Ga-esi Mezie Ihe M Mejọrọ?

Ị ga-emejọrịrị ihe; o nweghị onye na-anaghị emejọ ihe. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma i mejọọ?

AJỤJỤ NKE 5

Gịnị Ka M Ga-eme ma A Chọwa M Okwu n’Ụlọ Akwụkwọ?

Ọ pụtaghị na e nweghị ihe ị ga-emeli. I nwere ike imeri onye na-achọ gị okwu n’emetụghị ya aka.

AJỤJỤ NKE 6

Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?

O nwere ike isiri gị ike ime ihe ị ma na ọ dị mma.

AJỤJỤ NKE 7

Gịnị Ka M Ga-eme ma Mmadụ Chọọ Ka Mụ na Ya Nwee Mmekọahụ?

Gụọ gbasara nsogbu ụfọdụ ịkpachi anya gafee ókè kpataara ụfọdụ ndị na-eto eto.

AJỤJỤ NKE 8

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Idina Mmadụ n’Ike?

Ndị a kacha edina n’ike bụ ndị na-eto eto. Olee otú ị ga-esi merie nsogbu a?

AJỤJỤ NKE 9

M̀ Kwesịrị Ikwere na E Keghị Mmadụ Eke?

Olee nke na-ada ka ihe mere eme?

AJỤJỤ NKE 10

Olee Otú Baịbụl Ga-esi Nyere M Aka?

Ọtụtụ ndị sịrị na ihe juru na Baịbụl bụ akụkọ ifo, na oge ya agafeela, nakwa na ọ naghị ekwe nghọta. Ma ọ bụghị eziokwu.