Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE

Ihe Unu Ga-eme Ka Ekwentị Ghara Ibutere Unu Nsogbu

Ihe Unu Ga-eme Ka Ekwentị Ghara Ibutere Unu Nsogbu

 Ekwentị ma ọ bụ ihe ndị yiri ya nwere ike ịbara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị uru ma ọ bụ butere unu nsogbu. Olee nke ọ na-emere unu?

 Ihe i kwesịrị ịma

  •   Iji ekwentị na ihe ndị yiri ya eme ezigbo ihe nwere ike ịbara di na nwunye uru. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ di na nwunye na-eji ekwentị ezirịta ozi n’ụbọchị mgbe ha abụọ na-anọghị nso.

     Otu nwoke aha ya bụ Jonathan sịrị: ‘Mgbe ọ bụla nwunye m ziteere m ozi n’ekwentị gwa m na ọ hụrụ m n’anya ma ọ bụ na ya na-eche banyere m, ọ na-eme ka m hụkwuo ya n’anya.’

  •   Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye na-apịkarị ekwentị ya, o nwere ike ime ka ha nwewe nsogbu. Dị ka ihe atụ, o nwere ndị anya ha na-atọkarị n’ekwentị nke na ha anaghị enwe ohere gee di ha ma ọ bụ nwunye ha ntị ma ọ bụdi nwee mgbe ha na ya ji ekwurịta okwu.

     Otu nwaanyị aha ya bụ Julissa sịrị: “Ama m na e nweela oge ndị di m gaara achọ ka mụ na ya kparịta ụka ma ya abụrụ na m na-apị ekwentị m.”

  •   Ụfọdụ ndị sị na ọ bụrụ na ha na-apịgodị ekwentị ha, ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha nwekwara ike ịna-akparịta ụka nke ọma n’otu oge ahụ. Ma Sherry Turkle, onye bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya, kwuru na nke ahụ bụ “ihe na-abụghị eziokwu gbasara mmadụ ime ọtụtụ ihe n’otu oge.” Ime ọtụtụ ihe otu oge abụghị ihe ọma, n’agbanyeghị na ndị mmadụ na-eche na ọ dị mma. Ọ sịrị na nke bụ́ eziokwu bụ na “ọ bụrụ na anyị achịkọta ọtụtụ ihe anyị chọrọ ime n’otu oge, anyị agaghị enwe ike imetacha ha nke ọma.” a

     Otu nwaanyị aha ya bụ Sarah sịrị: “Ọ na-atọ m ụtọ ma mụ na di m kparịtawa ụka, ma obi anaghị adị m mma mgbe ọ bụla ọ na-apị ekwentị mgbe mụ na ya na-akparịta ụka. Ihe m na-aghọta n’oge ahụ bụ na obi ga-aka adị ya ụtọ ma m hapụ ya ka ọ pịwa ekwentị ya.”

 Ihe ị ga-eburu n’obi: Otú i si apị ekwentị gị nwere ike ịkpatara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nsogbu ma ọ bụ baara unu uru.

 Ihe i nwere ike ime

 Mara ihe ndị ka mkpa. Baịbụl sịrị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) Jụọ onwe gị, sị, ‘Oge mụ na di m ma ọ bụ nwunye m na-eji apị ekwentị anyị, ọ̀ na-eme ka anyị ghara inwe ohere kparịta ụka ka di na nwunye?’

 Otu nwoke aha ya bụ Matthew, sịrị: “Ọ na-ewute m ma m hụ nwoke na nwaanyị bịara iri nri n’ebe a na-eri nri, onye nke ọ bụla anọrọ na-apị ekwentị ya. Ọ dịghị mma ka ekwentị anyị dị anyị mkpa nke na anyị ga-echefu ihe kacha mkpa, ya bụ, anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị ịbụ ezigbo enyi.”

 Kpebienụ mgbe onye ọ bụla na-agaghị emetụ ekwentị ya aka. Baịbụl sịrị: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị.” (Ndị Efesọs 5:​15, 16) Jụọ onwe gị, sị, ‘È nwere m ike iwepụta oge m ga-eji na-agụ ma na-azaghachi ozi ndị na-abụghị ihe gbata gbata ndị e ziteere m n’ekwentị kama ịna-achọ ịzaghachi ozi ọ bụla batara ozugbo?’

 Jonathan sịrị: “Achọpụtala m na ọ na-akara m mma itinye ekwentị m na “gba nkịtị,” e mechazie mụ agụọ ma zaghachi ozi ndị e ziteere m n’oge kwesịrị ekwesị. Ọ na-ara ahụ́ inwe mgbe ozi bataranụ bụ ozi gbata gbata, nke chọrọ ka e lebara ya anya ozugbo.”

 O kwe omume, ebula ọrụ gị lọta n’ụlọ. Baịbụl sịrị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.” (Ekliziastis 3:⁠1) Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Ana m ekwe ka ọrụ m na-ewekọrọ oge mụ na ndị ezinụlọ m ji anọrị n’ihi na m na-eji ekwentị m arụ ihe ndị m kwesịrị ịrụ n’ụlọ ọrụ ma m lọta n’ụlọ? Ọ bụrụ na m na-eme ya, olee otú ọ na-adị di m ma ọ bụ nwunye m? Gịnị ka di m ma ọ bụ nwunye m ga-ekwu ma a jụọ ya ajụjụ a?’

 Matthew sịrị: “Ekwentị na ihe ndị yiri ya emeela ka ọ dịrị anyị mfe ịnọ ebe ọ bụla rụọ ọrụ nakwa n’oge ọ bụla anyị chọrọ ịrụ ya. Ana m agbalịsi ike ka m ghara ịna-ele ekwentị m anya mgbe niile, ma ọ bụ na-arụ ọrụ ndị m kwesịrị ịrụ n’ụlọ ọrụ mgbe ọ bụla mụ na nwunye m nọ.”

 Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwurịta ihe unu ga-eme maka ekwentị unu. Baịbụl sịrị: “Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuo gbasara otú unu si apị ekwentị unu. Unu kwuokwa ma è nwere mgbanwe ndị unu kwesịrị ime. Unu nwere ike iji ajụjụ ndị dị n’ebe ahụ e kwuru ihe ga-enyere unu aka ịma ihe unu ga-akparịta, nke dị n’isiokwu a, kwurịta ya.

 Otu nwaanyị aha ya bụ Danielle sịrị: “Mụ na di m na-agwa ibe anyị eziokwu. Anyị anaghị ezoro ibe anyị ọnụ ma anyị chọpụtahaala na e nwere onye bidoro ịpị ekwentị ya karịa ka o kwesịrị. Anyị ma na ịpịkarị ekwentị nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. N’ihi ya, anyị anaghị eji ihe onye nke ọ bụla n’ime anyị kwuru egwu egwu.”

 Ihe ị ga-eburu n’obi: Hụ na ọ bụ gị na-atụrụ ekwentị gị ụka, ọ bụghị ya ga na-atụrụ gị ụka.

a Ebe e si nweta ya bụ n’akwụkwọ a kpọrọ Reclaiming Conversation​—⁠The Power of Talk in a Digital Age.