Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-ejide Onwe Gị ma A Kpasuo Gị Iwe

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-ejide Onwe Gị ma A Kpasuo Gị Iwe

 Di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuru ma ọ bụ mee ihe were gị iwe, gị agbalịa ime ka o nweghị ihe merenụ. Ma, ya emechaa chọpụta na o nwere ihe na-ewe gị iwe, ya ajụwazie gị ihe na-ewe gị. Ihe a ọ na-ajụ gị bịaziri wewekwuo gị iwe. Olee ihe ga-enyere gị aka ijide onwe gị ma ụdị ihe a mee?

 Ihe I Kwesịrị Ịma

  •   Iwe iwe nwere ike ịkpatara gị ọrịa. Ndị ọkachamara na-ekwu na mmadụ iwe oké iwe nwere ike ịkpatara ya ọbara mgbali elu, ọrịa obi, na ịda mbà n’obi. O nwekwara ike ime ka ihe ndị na-eme ka nri na-agbari n’ahụ́ mmadụ ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma. E kwukwara na iwe nwere ike iso n’ihe ndị na-akpata ehighị ụra nke ọma, oké echiche, ọrịa strok na ọrịa ndị ọzọ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Hapụ iwe, . . . ewela iwe naanị iji mee ihe ọjọọ.”​—Abụ Ọma 37:8.

  •   Ibu iwe n’obi nwekwara ike ịkpatara gị nsogbu. Mmadụ ibu iwe n’obi ruo ogologo oge yiri ọrịa nwere ike iri mmadụ ahụ́. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka ị ghara ịna-atụkwasị ndị ọzọ obi. Ụdị àgwà a nwere ike ime ka gị na ndị ọzọ na-esekarị okwu, o nwekwara ike isere gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ezigbo okwu.

 Ihe I Nwere Ike Ime

  •   Chọpụta àgwà ọma ndị di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere. Depụta àgwà atọ di gị ma ọ bụ nwunye gị nwere na-amasị gị. Mgbe ọzọ ọ ga-eme ma ọ bụ kwuo ihe kpasuru gị iwe, chee banyere àgwà ndị ahụ i depụtara. O nwere ike inyere gị aka ijide onwe gị ma ọ kpasuo gị iwe.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.”​—Ndị Kọlọsi 3:15.

  •    Na-agbaghara ma e mejọọ gị. Buru ụzọ ghọta ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ekwu. Ọ ga-eme ka ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. (1 Pita 3:8) Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịjụ onwe gị, sị, ‘Ihe a o mere m ọ̀ dị oké njọ nke na agaghị m agbagharali ya?’

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.”​—Ilu 19:11.

  •    Na-ekwu okwu otú na-egosi na i nwere obiọma, jirikwa akọ kwuo ya. Ị chọọ ikwu ihe merenụ, kwuo otú obi dị gị maka ya kama ịtawa di gị ma ọ bụ nwunye gị ụta. Dị ka ihe atụ, kama ịsị, “Ị naghị achọ ịma gbasara m, ọ bụ ya mere na ị kpọghị m, gwa m ebe ị nọ,” kwuo, sị, “M nọ na-echegbu onwe m na chi ejiela ma ị lọtabeghị, amaghịkwanụ m ma udo ọ̀ dịkwa.” Iji nwayọọ kwuo okwu nwere ike inyere gị aka ijide onwe gị ma a kpasuo gị iwe.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.”​—Ndị Kọlọsi 4:6.

  •    Na-ege ntị nke ọma. I kwuchaa otú obi dị gị, chere ka di gị ma ọ bụ nwunye gị zaghachi. Anarakwala ya okwu n’ọnụ. Mgbe di gị ma ọ bụ nwunye gị kwuchara, kwughachi ihe ahụ o kwuru ka ị mata ma ị̀ ghọtakwara ihe o kwuru. Naanị ntị ahụ i gere ya nke ọma nwere ike ime ka i jide onwe gị.

     Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “[Bụrụ] onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.”—Jems 1:19.