Gaa n'Isiokwu

Ònye Bụ Meri Magdalin?

Ònye Bụ Meri Magdalin?

Ihe Baịbụl kwuru

 Meri Magdalin bụ ezigbo onye soro ụzọ Jizọs Kraịst. O yiri ka e si n’obodo Magdala (ma ọ bụ Magadan), nke dị nso Osimiri Galili, nweta aha ahụ bụ́ Magdalin. O nwekwara ike ịbụ na e nwere mgbe Meri biri ebe ahụ.

 Meri Magdalin so n’otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị so Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-ejegharị. Ha na-ejikwa ihe ndị ha nwere na-enyere ha aka. (Luk 8:​1-3) O so ná ndị ji anya ha hụ mgbe e gburu Jizọs, sorokwa ná ndị mbụ hụrụ ya mgbe o si n’ọnwụ bilie.​—Mak 15:40; Jọn 20:​11-18.

 Meri Magdalin ọ̀ bụ nwaanyị akwụna?

 Baịbụl ekwughị na Meri Magdalin bụ nwaanyị akwụna. Naanị ihe Baịbụl kwuru bụ na Jizọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ asaa n’ahụ́ ya.​—Luk 8:2.

 Oleezi otú ndị mmadụ si bido kwuwe na ọ bụ nwaanyị akwụna? Ọtụtụ narị afọ ka nwaanyị a nwụchara, ụfọdụ ndị bịara kwuwe na ọ bụ ya bụ nwaanyị ahụ a na-akpọghị aha ya na Baịbụl (onye o yiri ka ọ̀ bụ nwaanyị akwụna), onye e kwuru na o ji anya mmiri ya saa ụkwụ Jizọs ma jirizie ntutu isi ya hichaa ya. (Luk 7:​36-38) Ma, e nweghị ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ gosiri na nke a bụ eziokwu.

 Meri Magdalin ọ̀ bụ “onyeozi nke ndịozi”?

 Mba. Chọọchị Katọlik na-ekwu na Meri Magdalin bụ “Senti,” na-akpọkwa ya “onyeozi nke ndịozi” n’ihi na o so ná ndị mbụ bịara gwa ndịozi Jizọs na Jizọs esila n’ọnwụ bilie. (Jọn 20:18) Ma nke a emeghị ka o soro n’otu n’ime ndịozi Jizọs. O nweghịkwanụ ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru na ọ bụ onyeozi.​—Luk 6:​12-16.

 E dechara Baịbụl n’ihe dị ka afọ 98 Oge Ndị Kraịst. Ma ka ihe dị ka narị afọ ise gara, ndị isi chọọchị Katọlik malitere ikwu na Meri Magdalin bụ “senti.” E nwere akwụkwọ ụfọdụ na-esoghị na Baịbụl, ndị e dere n’ihe dị ka afọ 100 ruo 300 Oge Ndị Kraịst. N’akwụkwọ ndị ahụ ka e kwuru na ụfọdụ ndịozi Jizọs nọ na-emere Meri anyaụfụ. Ma ụdị akụkọ ifo a enweghị ebe ọ gbadoro ụkwụ n’Akwụkwọ Nsọ.

 Meri Magdalin ọ̀ bụ nwunye Jizọs Kraịst?

 Mba. Baịbụl kwuru hoo haa na Jizọs alụghị nwaanyị. a