Gaa n'Isiokwu

Ndị Ọkà Mmụta Hà Kwetara na Jizọs Biri Ndụ n’Ụwa A?

Ndị Ọkà Mmụta Hà Kwetara na Jizọs Biri Ndụ n’Ụwa A?

 Ndị ọkà mmụta anaghị arụ ụka ma Jizọs ò biri ndụ n’ụwa a. N’oge ndịozi Jizọs, e nwere ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru gbasara Jizọs na ndị Kraịst e nwere n’oge ahụ. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu a na-akpọ Encyclopædia Britannica [nke afọ 2002] kwuru, sị: “Ihe ahụ ha kwuru gosiri na ndị na-achọghịdị iji anya ahụ Ndị Kraịst n’oge ahụ kwetara na Jizọs biri ndụ n’ụwa. Ọ bụzi n’oge anyị a ka ndị mmadụ bidoro na-ekwu na Jizọs ebighị ndụ n’ụwa a. O nweghịkwanụ ebe ha gbakwasịrị ụkwụ na-ekwu ya.”

 Otu akwụkwọ e bipụtara n’afọ 2006, a na-akpọ Jesus and Archaeology, kwuru, sị: “O nweghị ezigbote onye ọkà mmụta na-arụ ụka ma Josef, nwoke onye Juu, ò nwere nwa a kpọrọ Jizọs. Ọtụtụ n’ime ha kwuru na ndị mmadụ amatala ọtụtụ ihe Jizọs mere na ihe ndị ọ kụziri mgbe ọ nọ n’ụwa.”

 Baịbụl gosiri na e nwere onye bụ́ Jizọs. O kwudịrị aha ndị nna nna ya na aha ndị ezinụlọ a mụrụ ya. (Matiu 1:1; 13:55) O kwukwara aha ndị ọchịchị e nwere n’oge Jizọs. (Luk 3:1, 2) Ihe ndị a niile gosiri na akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl abụghị akụkọ ifo.