Akwụkwọ Ozi Jems Dere 2:1-26

  • Ile mmadụ anya n’ihu bụ mmehie (1-13)

    • Ịhụ ndị ọzọ n’anya bụ iwu eze nyere (8)

  • Okwukwe onye na-anaghị eme ihe dị mma abaghị uru ọ bụla (14-26)

    • Ndị mmụọ ọjọọ kwekwara ma kụja (19)

    • A kpọrọ Ebreham enyi Jehova (23)

2  Ụmụnna m, ebe ọ bụ na unu nwere okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, onye dị ebube, gịnị mere unu ji na-ele mmadụ anya n’ihu?+  Ka e were ya na mmadụ gbajuru ọla e ji ọlaedo mee ná mkpịsị aka ya, yirikwa ákwà mara mma, bata ebe unu zukọrọ, otu ogbenye nke yi ákwà ruru unyi abatakwa.  Ùnu na-aka akwanyere onye nke yi ákwà mara mma ùgwù wee sị ya, “Nọdụ ala n’ebe a mara mma,” ma sị onye ogbenye ahụ, “Enyi, guzoro ọtọ,” ma ọ bụ, “Nọrọ ọdụ n’ala ebe ahụ”?+  Ọ bụrụ ihe unu na-eme, ọ pụtara na unu na-ewere na otu onye ka ibe ya mma,+ unu aghọọkwala ndị ikpe na-ekpe ikpe mkpegbu.+  Ụmụnna m m hụrụ n’anya, geenụ ntị. Ọ̀ bụ na Chineke ahọrọghị ndị ụwa weere na ha dara ogbenye ka ha bụrụ ndị bara ọgaranya n’okwukwe?+ N’eziokwu, ọ bụ ha ka ọ họọrọ ka ha keta Alaeze ya, nke o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya.+  Ma, unu menyere ogbenye ahụ ihere. Ọ́ bụghị ndị bara ọgaranya na-emegbu unu,+ na-akpụpụkwa unu ụlọikpe?  Ọ́ bụghị ha na-ekwulu aha pụrụ iche unu na-aza?  Ọ bụrụ na unu na-edebe iwu a eze nyere, nke e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị,”+ unu na-agba nnọọ mbọ.  Ma ọ bụrụ na unu na-ele mmadụ anya n’ihu,+ unu na-eme mmehie, iwu ahụ na-emekwa ka o doo anya na unu na-emebi iwu.+ 10  N’ihi na ọ bụrụ na mmadụ na-edebe Iwu niile ma daa otu n’ime ha, ọ daala ha niile.+ 11  N’ihi na ọ bụ onye sịrị, “Akwala iko,”+ sịkwara, “Egbula mmadụ.”*+ N’ihi ya, ọ bụrụ na ị naghị akwa iko ma ị na-egbu mmadụ, ị na-ada iwu. 12  Ka otú unu si ekwu okwu na otú unu si akpa àgwà na-egosi na unu nweere onwe unu, nakwa na a ga-eji iwu e nyere unu kpee unu ikpe.+ 13  N’ihi na a ga-ekpe onye na-anaghị eme ebere ikpe n’emereghị ya ebere.+ Ma, e kpewe onye na-eme ebere ikpe, a ga-emere ya ebere.* 14  Ụmụnna m, olee uru ọ bara ma mmadụ sị na ya nwere okwukwe ma ọ naghị eme ihe dị mma?+ Okwukwe ahụ ọ̀ ga-azọpụtali ya?+ 15  Ọ bụrụ na e nwere nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị na-enweghị uwe* na ihe oriri ga-ezuru ya n’ụbọchị, 16  ma otu onye n’ime unu asị ya: “Ya dịrị gị ná mma, nwetakwa uwe ị ga-eyi na nri ga-ezuru gị n’ụbọchị,” ma unu enyeghị ya ihe ahụ́ ya chọrọ, olee uru ọ bara?+ 17  Ọ bụkwa otú ọ dị n’ihe gbasara okwukwe. Ọ bụrụ na mmadụ anaghị eme ihe dị mma, okwukwe ya abaghị uru ọ bụla.*+ 18  Ma, otu onye ga-asị: “I nwere okwukwe, mụnwa ana-eme ihe dị mma. Olee otú ị ga-esi gosi m na i nwere okwukwe ma ọ bụrụ na ị naghị eme ihe dị mma? M ga-eji ihe dị mma m na-eme gosi gị na m nwere okwukwe.” 19  Ọ̀ kwa i kwere na e nwere otu Chineke? Ị na-agbalị. Ma, ndị mmụọ ọjọọ kwekwara ma kụja.+ 20  Ma, gị onye nzuzu, ị́ maghị na ọ baghị uru mmadụ inwe okwukwe ma ọ bụrụ na ọ naghị eme ihe dị mma? 21  Ihe mere e ji kpọọ nna anyị Ebreham onye ezi omume ọ́ bụghị maka ihe dị mma o mere? Ọ bụ mgbe ọ gbatịchara Aịzik nwa ya n’elu ebe ọ ga-eji ya chụọ àjà ka a kpọrọ ya onye ezi omume.+ 22  Ọ̀ kwa ị hụrụ na ọ bụ ihe dị mma o mere ka o ji gosi na o nwere okwukwe, nke mere ka okwukwe ya zuo okè?+ 23  Ọ bụ ya mere Akwụkwọ Nsọ ji sị: “Ebreham nwere okwukwe na Jehova,* ya ejiri maka ya kpọọ ya onye ezi omume,”+ a kpọwakwa ya enyi Jehova.*+ 24  Ihe a na-egosi unu na ihe e ji agụ mmadụ n’onye ezi omume bụ ihe dị mma ọ na-eme, ọ bụghị naanị n’ihi okwukwe o nwere. 25  Otú ahụ ka Chineke sikwa gụọ Rehab bụ́ nwaanyị akwụna n’onye ezi omume n’ihi ihe dị mma o mere. Ọ nabatara ndị bịara inyopụta otú obodo ha dị,* nyekwara ha aka ha esi n’ụzọ ọzọ laa.+ 26  N’eziokwu, otú ahụ ahụ́ nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na ọ naghị eku ume*+ ka okwukwe anyị na-abaghị uru ma ọ bụrụ na anyị anaghị eme ihe dị mma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Egbula ọchụ.”
Na Grik, “ebere na-emeri ikpe.”
Na Grik, “gba ọtọ.”
Na Grik, “okwukwe ya nwụrụ anwụ.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Na Grik, “Ọ nabatara ndị ozi.”
Na Grik, “o nweghị mmụọ.”