Gaa n'Isiokwu

Ònye Dere Baịbụl?

Ònye Dere Baịbụl?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ị na-agụ Baịbụl, i nwere ike ịgụta ihe ga-eme ka ị mata onye dere ihe ị na-agụ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịhụ ebe e dere ihe dị ka “okwu Nehemaya,” “ọhụụ Aịzaya,” ma ọ bụ ‘okwu Jehova nke ruru Joel ntị.’—Nehemaya 1:1; Aịzaya 1:1; Joel 1:1.

 Ọtụtụ ndị dere Baịbụl kwuru na ọ bụ Jehova gwara ha ihe ha dere. Ndị amụma ndị dere Akwụkwọ Nsọ Hibru kwuwe okwu, ha na-asịkarị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru.” Ị ga-agụta okwu a ihe karịrị ugboro narị atọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Emọs 1:3; Maịka 2:3; Nehọm 1:12) E nwekwara mgbe Chineke zigara ndị mmụọ ozi ya ka ha gwa ndị so dee Baịbụl ihe ha ga-ede.—Zekaraya 1:7, 9.

 Ọ bụ ụmụ nwoke iri anọ dere Baịbụl. O were ha otu puku afọ na narị afọ isii iji dechaa ya. Ụfọdụ n’ime ha dere ihe karịrị otu akwụkwọ Baịbụl. Baịbụl nwere akwụkwọ iri isii na isii. Iri atọ na itoolu n’ime ha bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke ọtụtụ ndị na-akpọkarị Agba Ochie. Iri abụọ na asaa fọrọ afọ bụ Akwụkwọ Nsọ Grik, ọtụtụ ndị na-akpọkwa ya Agba Ọhụrụ.