Gaa n'Isiokwu

Izi Ndị Nwe Obodo Kanada Ozi Ọma

Izi Ndị Nwe Obodo Kanada Ozi Ọma

Na Kanada, e nwere ihe karịrị asụsụ iri isii ndị nwe obodo a na-asụ. Ọ bụkwa asụsụ obodo ihe dị ka narị puku ndị Kanada abụọ na puku iri na atọ.

Ka e nwee ike izi ndị a ozi ọma, ọtụtụ Ndịàmà Jehova amụọla, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu n’ime asụsụ ndị a. Tupu afọ 2015 agwụchaa, ihe karịrị narị mmadụ abụọ na iri ise agụchaala akwụkwọ na klas Ndịàmà Jehova hiwere iji kụzie otu n’ime asụsụ ndị ahụ.

Ndịàmà Jehova asụgharịakwala ma akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ma ụmụ obere vidio n’asụsụ asatọ n’ime ha. Asụsụ ndị ahụ bụ Algọnkwịn, Blakfut, Plens Kree, West Swampi Kree, Inuktitut, Mọhọk, Ọdawa, na Nọtan Ojibwa. a

Ndị mụrụla asụsụ ndị nwe obodo Kanada na-asụ ekwuola na ịmụ ha adịghị mfe. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Carma kwuru, sị: “Mgbe m malitere inyere ndị na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ Blakfut aka, ọ dị m ka amaghị m aka nri na aka ekpe. Amachaghị m asụsụ ahụ. Enweghị m ike ịgụ ya ma ọ bụkwanụ mata otú ọ na-ada.”

Otu nwanna nwoke aha ya bụ Terence kwuru, sị: “Ọtụtụ mkpụrụ okwu ya toro ogologo, siekwa ike ọkpụkpọ.” Nwanna a so ná ndị na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ West Swampi Kree. E nwere ihe Daniel, bụ́ onye na-ekwusa ozi ọma oge niile n’agwaetiti Manitoulin, kwuru. Ọ sịrị: “E nwechaghị akwụkwọ ọkọwa okwu na akwụkwọ ụtọ asụsụ n’asụsụ Ọdawa. Otú kacha mma mmadụ ga-esi amụta ya bụ ịga ka nne ochie ma ọ bụ nna ochie bi n’ebe a na-asụ ya kụziere ya.”

Mbọ ndị a ụmụnna anyị gbara mụọ asụsụ ndị ahụ, ọ̀ baarala ndị mmadụ uru? Otu nwaanyị na-asụ asụsụ Ojibwa kwuru na mbọ Ndịàmà Jehova gbara mụọ asụsụ ndị ahụ emeela ka ha dị iche na chọọchị ndị ọzọ. O kwuru na ahụ́ na-eru ndị mmadụ ala ikwu gbasara Baịbụl ma Ndịàmà Jehova gaa n’ụlọ ha gụọrọ ha Baịbụl n’asụsụ Ojibwa.

Otu onye nsụgharị aha ya bụ Bert a mụrụ n’ebe ndị Blọd Traịb bi kwuru, sị: “Ahụla m ebe ọtụtụ ndị Blakfut ji akwụkwọ anyị tụkwasị n’obi ha ma sị, ‘Ihe a bụ asụsụ m. Ọ bụ m ka e wepụtaara ya.’ M na-ahụkarị ka anya mmiri na-eruju ha n’anya ma ha lee vidio anyị n’asụsụ ha.”

Obi tọrọ otu nwaanyị na-asụ Kree ụtọ mgbe o lechara vidio anyị aha ya bụ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? n’asụsụ ya. Ọ sịrị na ọ dị ya ka ọ̀ bụ nne ya na-agwa ya okwu.

Ịga Ebe Dị́ Anya Zie Ozi Ọma

Ọtụtụ Ndịàmà Jehova agbaala ezigbo mbọ ịga zie ozi ọma n’obodo dị iche iche ndị nwe obodo Kanada bi. Otu nwanna nwoke aha ya bụ Terence na nwunye ya Orlean kwuru ihe mere otu oge ha gara n’otu n’ime obodo ndị ahụ zie ozi ọma. Ha kwuru, sị: “Anyị na ndị anyị na ha so gbara n’ụzọ snoo juru awa iri na abụọ tupu anyị eruo n’obere obodo a na-akpọ Lịtụl Grand Rapis. Ọtụtụ ndị obodo ahụ gere anyị ntị nke ọma.”

Ọtụtụ ndị ahapụla ụlọ ha ahụ́ ruru ha ala kwaga n’obodo ụfọdụ ndị nwe obodo Kanada bi. Mgbe Daniel na nwunye ya LeeAnn kwagachara n’Agwaetiti Manitoulin zie ozi ọma ọnwa atọ, ha kwagara ebe ahụ biri ebiri. Daniel kwuru, sị: “Obi dị anyị ụtọ na anyị nwekwuru oge anyị ga-eji mee ka anyị na ndị mmadụ dịrịkwuo ná mma, meekwa ka ha nwekwuo mmasị ịmụ Baịbụl.”

“Ọ Bụ n’Ihi na Esi M n’Ala Ala Obi M Hụ Ha n’Anya”

Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji agba ezigbo mbọ izi ndị nwe obodo Kanada ozi ọma? Nwunye Bert aha ya bụ Rose, kwuru ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Ebe m bụ otu n’ime ndị obodo a, marakwa uru ime ihe Baịbụl kwuru bara, ọ bụ ya mere m ji enyere ndị ọzọ aka.”

Nwanna Nwaanyị Orlean kwuru, sị, “M chọrọ ka ndị Kree mara onye Chineke bụ, nakwa ka ọ na-eduzi ha. Obi dị m ụtọ inyere ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma nakwa ka ha merie nsogbu ndị na-abịara ha taa.”

Nwanna Marc so ná ndị na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ Blakfut. Gịnị mere o ji ezi ndị nwe obodo Kanada bi n’obodo ya ozi ọma? O kwuru, sị: “Ọ bụ n’ihi na esi m n’ala ala obi m hụ ha n’anya.”

a Ndị nwe obodo Amerịka na-asụkwa ụfọdụ n’ime asụsụ ndị a.