Gaa n'Isiokwu

Otú E Si Zie Ndị Bịara Ememme Ndị Nwe Amerịka Mere na Niu Yọk Ozi Ọma

Otú E Si Zie Ndị Bịara Ememme Ndị Nwe Amerịka Mere na Niu Yọk Ozi Ọma

Ọtụtụ ndị na-eche na ndị nwe Amerịka bi n’ime ime obodo ma ọ bụ n’ugbo. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na e kee ha ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ asaa n’ime ha bi n’obodo mepere emepe. N’abalị ise ruo n’abalị asaa n’ọnwa Jun, afọ 2015, a ndị nwe Amerịka nọ na Niu Yọk mee ememme ha na-eme kwa afọ. Ihe a na-akpọ ememme a bụ pawawu. Obodo Niu Yọk bụ obodo kacha buo ibu n’Amerịka. Mgbe ụfọdụ Ndịàmà Jehova nọ́ na Niu Yọk nụrụ na a na-aga ime ememme a, ha haziri ozugbo otú ha ga-esi gaa. Gịnị mere ha ji mee otú ahụ?

Ndịàmà Jehova na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ọtụtụ narị asụsụ. Ọtụtụ asụsụ ndị nwe Amerịka na-asụ sokwa na ha. Ụfọdụ n’ime ha bụ Blakfut, Dakota, Họpi, Mọhak, Navajo, Ọdawa, na Plens Kree. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova dosara akwụkwọ ha na tebụl nakwa n’ihe a na-akwagharị akwagharị n’ebe ahụ. Otu n’ime akwụkwọ ndị ha dosara bụ traktị bụ́ “You Can Trust the Creator” (Ị Pụrụ Ịtụkwasị Onye Okike Obi)

E nwere ihe ndị a na-egere egere na vidio n’ọtụtụ asụsụ ndị ahụ n’ebe Ndịàmà Jehova na-edebe ihe n’Ịntanet. Ha kpọnyeere ndị bịara ememme ahụ vidio anyị na ihe ndị a na-egere egere. Ndị bịara ya chọpụtara na ọ bụ naanị asụsụ Bekee ma ọ bụ Spanish ka e ji na-ekwu ihe ndị a na-eme n’ememme ahụ.

Obi tọrọ ọtụtụ ndị bịara ememme a ụtọ n’ihi mbọ anyị na-agba n’ịsụgharị akwụkwọ anyị n’ọtụtụ asụsụ ndị nwe Amerịka na-asụ nakwa otú anyị si ezi ozi ọma ma n’obodo mepere emepe ma n’ime ime obodo. Mgbe a kọwachaara otu nwoke otú anyị si ezi ozi ọma, o kwuru ka a bịa mụwara ya Baịbụl. Ọ sịrị: “M na-atụsi anya unu ike ka unu bịa mụwara m Baịbụl.”

Otu di na nwunye bụ́ ụmụ amaala ndị nwe Amerịka bịara n’ebe ahụ Ndịàmà Jehova dosara akwụkwọ. Di na nwunye a bụ ndị ogbi. Ma ha na Ndịàmà Jehova nọ́ ebe ahụ enweghị ike ikwurịta okwu. Obere oge, otu Onyeàmà Jehova ma asụsụ ndị ogbi bịara ebe ahụ. Ya na ha ji ihe dị ka nkeji iri atọ kwurịta okwu. O nyekwaara di na nwunye a aka ịchọta ebe Ndịàmà Jehova na-enwe mgbakọ n’asụsụ ndị ogbi n’obodo ha.

Ihe karịrị Ndịàmà Jehova iri ise so zie ndị bịara ememme ahụ ozi ọma. Ha nyefere ndị mmadụ akwụkwọ anyị karịrị otu narị na iri ise n’ime ụbọchị atọ ahụ e mere ememme ahụ.

a Otu nwoke, bụ́ onye ọkachamara aha ya bụ William K. Powers Kwuru, sị: “Ihe ndị a na-eme n’ememme a ndị nwe Amerịka na-eme n’oge a bụ egwú ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka na-anọ gburugburu n’ahịrị na-agụ ma na-agba.”​—Ethnomusicology, September 1968, peeji nke 354.