Gaa n'Isiokwu

Otú E Si Na-enyere Ndị Mkpọrọ Aka

Otú E Si Na-enyere Ndị Mkpọrọ Aka

Kwa ụbọchị, ndị a tụrụ mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ ndị dị n’Amerịka na-edetara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova akwụkwọ ozi, na-agwa ha ka ha bịa kụziwere ha Okwu Chineke.

Anyị anaghị agba nkịtị ma anyị nata akwụkwọ ozi ndị ahụ. Anyị na-eziga ụmụnna anyị ụfọdụ ka ha gaa leta ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ, ndị nọ n’ụlọ ọgwụ, na ebe ndị ọzọ ndị ọchịchị Amerịka na-anaghị ekwe ka ndị mmadụ bata.

Ụmụnna anyị na-anọ n’ụlọ mkpọrọ ụfọdụ nwee ọmụmụ ihe anyị. N’otu n’ime ụlọ mkpọrọ ha nwere ya, mmadụ iri atọ na abụọ bịara gere okwu si na Baịbụl a na-agwa ọhaneze, nke na-ewe nkeji iri atọ. E kwuru okwu ahụ n’ụzọ ebe abụọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ.

E nweela ọtụtụ ihe ọma si ná mbọ a anyị na-agba pụta. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwoke e kwo maka igbu mmadụ tụọ nga mkpụrụ ọka n’Amerịka. Ihe nwoke a mụtara na Baịbụl nyeere ya aka ya agbanwee, e mee ya baptizim, ya aghọọkwa Onyeàmà Jehova.

E nwekwara onye ọzọ a tụrụ mkpọrọ na Kalịfọnịa n’ihi àgwà ọjọọ ya. Ma, ya na Onyeàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Onye ahụ ya na ya na-amụ Baịbụl kwuru, sị: “Ama m ụdị mmadụ ọ bụ tupu ya amụwa Baịbụl. Ọ gbara ezigbo mbọ kwụsị àgwà ọjọọ ya, nke mere o ji ruo eruo ka e mee ya baptizim.”

Ọtụtụ ndị mkpọrọ anyị kụziiri Baịbụl amalitela ime ihe Baịbụl kwuru n’agbanyeghị na ha ma na nke ahụ nwere ike ime ka ndị ọjọọ chọọ igbu ha. Dị ka ihe atụ, e nweela ndị e si n’ụlọ mkpọrọ ebe ha nọbu wefee ebe ọzọ ka ndị ọjọọ ha na ha na-akpabu ghara ịkpara ha aka.

Obi na-atọ ndị na-arụ n’ụlọ mkpọrọ ụtọ ma ha hụ otú Baịbụl anyị na-akụziri ndị mkpọrọ si na-enyere ha aka ịgbanwe àgwà ha. Ụfọdụ n’ime ha enyela anyị asambodo iji kelee anyị maka mbọ anyị gbara.